You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Okocha ekwuola echiche ya gbasara mmeri Super Eagles
Okocha ekwuputego obi ya maka mmeri Super Eagles
Dịka ka Krueshịa siri pịa Super Eagles ọkpụ abụọ na asataghị ihe, Austin Okocha bubu onye otu Super Eagles ekwuola na mmeri a bụ maka ọtụtụ ndị egwurewgu Super Eagles anaghị agba n'ebe ha kwesiri igba n'ọgbọ egwuregwu.
Mgbọ ogbunigwe dara n'obodo atọ n'ime Benue steeti ụnyahụ.
Mana ọ bụ ndị aghaelu Naịjirịa tụrụ ya. Ọnụ na-agbasa ozi a bụ Olatokunbo Adesanya gwara ndị ntaakụkọ owku a mana o kwubeghị ihe buture yabụ omume.
Nysom Wike esoghị na ntụlịaka okpuru ọchịchị Rivers
Akụkọ na-apụta na Rivers steeti kwuru na gọvanọ ha bụ Nyesom Wike ekweghi i binye aka na ntụlịaka ịhọpụta ndị ga-achị n'okpuru ọchịchị nke steeti ahụ.
Akụkọ a kwukwara na otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC jiri iwe kwuo na ha agaghị eso na ntụlịaka a makana akwụkwọ mbinye aka na ndị ọrụ ntụlịaka abịaghị n'oge n'ọtụtụ ebe na PortHarcourt.
Spain anabatala ndị mbịambịa
Mba Spain anabatala ụgbọ nke mbụ bụ ndị mbịambịa azọpụtara na mmiri Mediterranean ma bụrụkwa ndị Malta na Italy jụrụ inabata n'izu ụka garaga.
Gee akụkọ anyị n'ụtụtụ a