Lee ihe kachasị ụmụaka Naịjirịa mkpa ugbu a
Ọnwa Mee 27 n'afọ ọbụla bụ ụbọchị pụrụiche ekewapụtara maka ncheta ụmụaka niile nọ na Naịjirịa na ihe gbasara ha.
Dika a na-eme emume ụbọchị ncheta ha nke afọ 2018, ụmụaka Naịjirịa ekwuola ihe ha chọrọ ka gọọmentị etiti mere ha.
Gọọmentị etiti nakwa ngalaba na-ahụ maka ụmụaka na mbaụwa niile akpọrọ UNICEF ekwuola na ha ga-eme ihe niile ike ha ruru iji wee kwụsị mwakpo ụmụaka .