US election 2020: Ọ bụ ụlọikpe ga-ekpebi onye ga-emeri na ntuliaka a?

Ndị na-akwado Trump na-akụ aka na glaasị dị na Michigan ebe a na-agụkọ vootu.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị na-akwado onyeisiala nọ na-eme ngagharịiwe na Michigan
    • Onye dere ya, Ritu Prasad
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News

Joe Biden nke 'Democrats' nọ n'ụzọ mmeri na ntuliaka Amerịka mana Onyeisiala Trump nke 'Republican' na-ama ngụkọ vootu na steeti anọ aka n'ụlọikpe. Kedụ ihe nwereike ime?

Otu achụnta vootu Trump na-enweghi akaebe kwuru na aghụghọ abaala na vootu ma na-achọ ịkwụsị ngụkọ vootu na Pennsylvania, Wisconsin, Georgia na Michigan.

Anyị gbara onye ọkachamara n'iwu ajụjụ ihe ọ pụtara - na ihe ọzọ na-eso ya ma okwu a gaa n'ihu.

Section divider

Ọ bụ na anyị ekwesịghi ịma mpụtara ugbua?

Eeh na mba. Na mbụ, ọ bụrụ na mpụtara gosiri na otu onye ọnụọgụgụ buru ezigbo ibu na-emeri, ụlọ mgbasaozi n'Amerịka na-akpọpụta otu onye ahụ dịka onye meriri. Nke a na-emekarị na mbido ụbọchị na-eso ụbọchị a tụchara vootu.

Nke a abụghị mpụtara si n'aka gọọmentị, ọ bụghị mpụtara ikpeazụ- ọ bụ amụma, mpụtara si n'aka gọọmentị na-ewe ọtụtụ ụbọchị na ngụkọ.

Mana etu e si tụọ vootu n'usoro nzipu ozi n'afọ a pụtara na ngụkọ ga-egbu ezigbo oge, ọkachasị nke a steetị ndị gbapụtara ihe ekweghi ka a gụkọọ vootu tupu ụbọchị ntuliaka.

Ndị na-agụkọ vootu ka ha nọ n'elu tebụlụ

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, A gụkọọla ọtụtụ vootu mana ụzọ ka nwereike ịdị anya

Ha kwesịrị ịgụkọ he niile n'ụbọchị ahụ, ma ị gụkọ vootu si nzipu ozi na-egbe oge karịa nke mmadụ bịara n'onwe ya tụọ n'ihi nyocha ndị a na-eme.

Ọ bụrụ na ohere ha dị kpachikpachi mana o nweghi onye chọrọ ịnabata mmeri, ngụkọ ga-aga n'ihu dịka Mathew Weil bụ direktọ nke 'Bipartisan Policy Research Center' na-ahụ maka ntuliaka si kwuo.

Section divider

E nwere ọgbatauhie tupu ntuliaka amalite

Ọ dị mbụ bụrụ ntuliaka na-eche ihu n'ụlọikpe.

Tupu mbinyeaka amalite na Tusde, e nweela mkpesa karịrị 300 na steetị 44 banyere ịtụ vootu site na nzipu ozi nakwa ịtụ vootu ọsịsọ na ntulaiaka afọ a.

Ha gbakwasịrị ụkwụ n'ụfọdụ okwu gụnyere ụbọchị akwụsịrị izipu na ịnabata vootu, ụdị ndị akaebe ga-etinyeaka n'akwụkwọ na akwụkwọ 'envelope' e ji zipu vootu ndị a.

Steetị ndị 'Republican' na-achị sị na mmachi kwesịrị ịdị iji gbochie aghụghọ n'ịtụ vootu.

Mana ndị 'Democrats' sị nke a bụ atụmatụ ịkpachi ikike dịrị onye n'ịtụ vootu.

Section divider

Kedụ ihe ịmaka n'ihu Trump nyere?

Na Wisconsin

Otu achụnta vootu onyeisiala sị na o kwuola ka a gụgharịa vootu na Wisconsin "maka ihe edoghi anya" mere na Tusde.

O doghi anya mgbe a ga-agụgharị ya, mana ọ gaghị eme ruo mgbe ndị ọrụ ntuliaka ga-enyocha vootu ndị ahụ. Ụbọchị ikpeazụ nke a nwereike ime na steetị ahụ bụ na 17 Nọvemba.

Ọkammụta ngalaba iwu na Mahadum Columbia bụ Richard Briffault kwuru na a gụgharịrị vootu na Wsconsin n'afọ 2016, na "ọgbanwere ihe ruru vootu otu narị".

"Ị gụgharị vootu abụghị ụzọ e ji akagbu vootu,"ọ kọwara. "ọ bụ etu e ji eme ka o doo anya na mmehie adịghị na ngụkọ ahụ."

Na Michigan

Trump ji obere ihe merie na steetị ahụ n'afọ 2016 - obere ihe karịrị vootu 10,700. N'ụbọchị 4 nke Nọvemba, otu achụnta vootu ya tinye mkpesa ka a kwụsị ngụkọ vootu ebe ahụ, na-agbanyeghi na ndị ọrụ ntuliaka agụkọchala vootu dị pasentị 96.

Ndị ọrụ ntuliaka na-enyocha akwụkwọ ntuliaka

Ebe foto si, Getty Images

E nwere ọtụtụ puku vootu a na-agụbeghi nke ọtụtụ n'ime ha si n'ebe ndị 'Democrats' gbara mgbọrọgwụ, mana ndị ntaakụkọ Amerịka na BBC na-ekwu na Biden nwereike imeri.

Na Pennsylvania

Nsogbu dị ebe a bụ na mkpebi steetị kpebiri ka a gụkọọ vootu ndị a tụrụ n'ụbọchị ntuliaka mana rute ha aka ka n'ihe ruru ụbọchị atọ gachara. Ndị Repọblikan na-achọ ịgbagha mkpebia n'ụlọikpe.

Weil sị na ọ bụ nke a na-eche uche karịa dịka ụlọikpe kachasị na mba nọ n'ikpe ya tupu ntuliaka eruo - tupu ọkaikpe Amy Coney Barrett banye n'ọkwa.

"Ha kwuru na ha ga-achọ iwe ha ma e mecha. Echeghi m na a ga-ekpofu ụfọdụ vootu e zipuru n'ụbọchị ntulaiaka a na-ataghi ruo ụbọchị Fraịde".

Ọkammụta Briffault kwukwara na a ga-agụkọ vootu ndị abataghị n'oge iche, ma sị Biden nwereike ịnọ n'isi ma a gụghị ndị ahụ, ọ hụghị uru ọ bara ịga ụlọikpe.

Mana ndị achụnta vootu Trump ekwupụtala mmeri na steetị ahụ na-agbanyeghi na e nwere vootu karịrị otu nde a gụbeghi.

Na Georgia

Ndị Repọblikan steetị a na otu achụnta vootu Trump mere mkpesa n'ụlọikpe Chatham County ka akwụsịtụ ngụkọ vootu, n'ebubo nsogbu dị n'enweghi usoro ịtụ vootu.

Onyeisioche Repọblikan na Georgia bụ David Shafer dere na twitter na ndị na-ele ka ntuliaka si aga hụrụ ka otu nwaanyị wụkọtara vootu karịrị 50 n'ime igbe vootu ndị agụghị agụ maka ndị nwee ya anọghị".

Ha agwala ọkaikpe ka ọ chọpụta vootu ndị ahụ a nabatara mgbe e binyechara aka n'ụbọchị ntuliaka.

Ndị na-eme ngagharịiwe ji akwụkwọ sị na vootu mmadụ niile bara uru

Ebe foto si, Getty Images

O nwere ihe ga-eru n'ụlọikpe kachasị?

N'isi ụtụtụ Wenezde, Trump kwuru na aghụghọ dị na-enweghi ihe akaebe, ọ sị kwara "Anyị ga-aga n'ụlọikpe kachasị - anyị chọrọ ka mbinyeaka niile kwụsị."

Mbinyeka adịla na mbụ kwụsịla - ebe mbinyeaka emechie n'ụbọchị ntuliaka, na-agbanyeghi e nwere vootu na-abịaghị n'oge, dịka na Pennsylvania.

Weil kwuru: "Ụlọikpe kachasị enweghi ikike pụrụiche ọbụla igbochi ngụkọ vootu na-aga n'usoro iwu."

Ọkammụta Briffault kwuru "Enweghi ọkọlọtọ usoro e ji ebute nsogbu ntuliaka n'ụlọikpe kachasị. O zighi ezi ma ọ ga-abụrịrị okwu ndị pụrụiche."

Ihe osise gosiri ihe ga-eme ma mpụtara ntuliaka pụọ ụlọikpe

Ọ bụrụ na e wepụ mpụtara ntulaiaka n'ụlọikpe, otu ndị ọkaiwu ga-ama ya aka n'ụlọikpe steetị. Ndị ọkaikpe steetị ga-anabata mkpesa ma nye iwu sị ka a gụgharịa vootu, e nwereike ịsị ndị ọkaikpe ụlọikpe kachasị ka ha kpegharịa ikpe a.

N'ụfọdụ ebe a na-agụgharị vootu ma ọ bụrụ na ihe ha ji akari ibe ha dị obere - i nwereike icheta Florida na ntuliaka 2000 n'etiti George W Bush na Al Gore.

Section divider

Oge ole ka o nwereike ifu?

Maka na ihe a bụ ntuliaka onyeisiala, e nwere oge ọ na-ewe iji hụ na e mere ihe ndị a:

  • Steetị nwere izuụka ise malite n'ụbọchị 3 Nọvemba ịchọpụta onye meriri na ntuliaka onyeisiala. A na-akpọ nke a ụbọchị ikpeazụ "safe harbour", nke afọ a bụ 8 Disemba.
  • Ọ bụrụ na steetị ekpebibeghi ruo ụbọchị ahụ - Cheta na ọ bụ ndị "electoral college" na họpụta onyeisiala, ọ bụghị vootu a tụrụ atụ - Ndị omeiwu nwereike ikpebi na agaghị agụkọ nke ha.
  • N'ụbọchị 14 Disemba, ndị nhọpụta na-ezukọ na steetị ha di iche iche ịtụ vootu.
  • Ọ bụrụ na e nweghi onye meriri ruo ụbọchị 6 Jenụwarị, ndị omeiwu ga-ekpebi onye ọ ga-abụ site na ntuliaka ọ dịrị ụkọ a kpọrọ 'contingent election'.
  • Ndị Nọchiteanya ga-ahọpụta onyeisiala ebe ndị Sịnetị ga-akpọpụta osote onyeisiala. Nke pụtara na anyị ga-ahụ onyeisiala si n'otu pati ebe osote ya si pati ọzọ.

Mana Weil sị na "ọtụtụ ihe ga-emebi tupu o ruo n'ọnọdụ ebe ndị Nnọchịteanya na ndị Sịnetị ga-ekpebi onyeisiala na osote ya.

Section divider

Gịnị nwereike ime ka steetị ghara ịkpọpụta onye meriri?

Ọ bụrụ kwanụ na steetị enweghi ike ikpebi onye ha ga-ahpụta? Tụlegodi ihe nwereike ịdapụta ma ọ bụrụ na otu pati sị na aghọrọ aghụghọ.

Steetị bụ ọgbọ ọgụ dịka North Carolina, Pennsylvania, Michigan na Wisconsin nwere gọọmentị kewara ekewa - Ndị gọvanọ 'Democrats'na ndịome kachasị na Repọblikan.

Na Steetị ndị a, ndị omeiwu nwereike ikewa site na gọvanọ ha ma nye ndị ha họpụtara iche n'ụlọomeiwu ( O mere n'afọ 1876).

Ndị omeiwu ga-ekpebi onye a ga-ewe vootu ya - Ọ bụ gọvanọ nke gọvanọ wepụtara ka ọ bụ onye omeiwu.

Ọ bụrụ na ndị nnọchiteanya na ndị sịnetị kwekọrịta, nsogbu adịghị. Ọ bụrụ ha kewaa, nsogbu dịkwa, na-agbanyeghi ndị ọkachamara sị n'iwu ọchịchị etiti na-akwado ndị gọvanọ họpụtara.

Section divider

Ụbọchị ikpeazụ, ikpeazụ.

Ihe ọbụla na-emela, iwu bụ na a ga-enweriri onyeisiala n'ụbọchị na 20 Jenụwarị dịka iwu si dị.No matter what, on 20 January, the Constitution says there must be a new presidential term.

"N'ehihie anyị ga-edu mmadụ n'iyi ọrụ dịka onyeisiala, ọ bụrụ na isi apụtaghị, anyị abanye n'atụmatụ ọzọ," Weil kwuru.

O kwuru na ọ bụrụ ndị nnọchiteanya ahọpụtaghị onyeisiala, ma ndị Sịnetị họpụta osote ya.

Ọ bụrụ na ha emeghi nke a ruo ụbọchị idu n'iyi ọrụ, osote onyeisiala ahụ ndị Sịnetị họpụtara ga-abụzi onyeisiala.

Onye na-eso ya ga-abụ osote onyeisiala - onyeisi ụlọ nnọchiteanya (Nancy Pelosi nke 'Democrats'nọ ugbua)

Section divider

Ụdị ihe aemetụla mbụ?

Ruo ugbua, ọ bụ naanị ntuliaka afọ 2000 ka ụlọikpe kachasị kpebiri onyeisiala, mgbe George Bush meriri Al Gore.T

Mgba ahụ siri ike n'etiti Gore nke 'Democrats' na Bush nke Republican. N'ụbọchị ntuliaka, Gore meriri na vootu a tụrụ atụ mana ọ rara ahụ na vootu si n'aka ndị kọleji. Ihe niile gbakwasịrị ụkwụ n'etu Florida si wepụta vootu dị 25 (electoral).

Ntuliaka ahụ siri ike nke ndị otu Gore ji sị ka e were aka gụgharịa ya nke mere Bush ji gbagharịa ya n'ụloikpe. Dịka ọtụtụ izuụka gachara, ụlọikpe kachasị chabiri ikpe n'aha Bush. Gore nabatara ikpe a, nke mere Bush ji banye n'ọkwa.

E nwere ọnọdụ abụọ ọzọ nwereike ịdapụta:

Nkwekọrịta na ngwụcha ụbọchị, 1876

Ndị omeiwu nwere ntulaiaka ọzọ mebiri n'aka ha n'afọ 1876, n'etiti Samuel Tilden nke 'Democrats' na Rutherford Hayes nke 'Republican'. Ọ fọrọ otu vootu ka Tilden merie na ntuliaka kọleji. Steetị anọ nwere nghọtaghie na ntuliaka - ọ bụrụ na Hayes meriri ha, ọ ga-emeri ha niile.

Ndị omeiwu kpọtara ụlọọrụ kwụ n'onwe ya ka o kpebie onye meriri. Nke wetara nkwekọrịta afọ 1877: Hayes ji otu vootu merie - site na nkwekọrịta ya na ndị 'Democrats'. Nke a mere ka ọ fọrọ ụbọchị abụọ ka e duo n'iyi ọrụ.

Inwete vootu kachasị na ntuliaka kọleji ezughi, 1824

N'afọ 1824, nwoke meriri na ntuliaka ma kachasị nwete vootu na kọleji e merighi na ntuliaka.

Ọ dịka Andrew Jackson ọ na-emeri John Quincy Adams n'ọkwa onyeisiala nke isii mana onweghi onye n'ime ha nwetere vootu kachasị, mkpe ahụ gaziri n'aka ndị omeiwu dịka iwu si dị.

Onyeisi ụlọnnọchiteanya mgbe ahụ bụ Henry Clay, abụghị onye nkwado Jackson. N'ihe a kpọrọ "ikwe ọnụ aghụghọ", Clay na ndị ụlọnnọchiteanya nakwa Adams nwere nkwekọrịta ma nye Adams mmeri - nyezie Clay ọkwa odeakwụkwọ mba ha.