Health tips: Ịgụ egwu ọ ga-enyerenwu ọnọdụ ahụike gị aka?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ịgụ egwu ga-akpalitenwu mmụọ anyị, mana nchọpụta ekwuola na o nwekwara ike inyere ọnọdụ ahụike anyị aka.

O nwekwara ike inyere nkuru ume onye akpaume na-enye nsogbu aka, ma nyerekwa onye nwere ọrịa nchefu a na-akpọ "dementia" aka idi ọrịa na-arịa ha.

N'ime ihe ruru afọ iri abụọ gara aga, ndị nnyocha agbaala mbọ ịchọpụta ihe a ga-ejide aka sị na ọ bụ akparamagwa maọbụ eburupụtaụwa ahụ jikọrọ egwu na ahụike.

Ọkammụta Daisy Fancourt, si na mahadum University College London, kwuru sị na ọtụtụ ihe na-agbanwe n'ahụ mmadụ ma ọ na-agụ egwu: "Nke a nwereike ịgụnye mbutu n'ihe na-ebute mgbakasị ahụ, nke a kpọrọ cortisol. Anyị na-ahụkwa ihe dị iche n'ọnọdụ endorphin nke na-emetụta mgbanwe ọnọdụ anyị."

Uru dị iche iche ọ bara

Ọkammụta Fancourt emeela nnyocha dị iche iche gbasara uru ịgụ egwu bara, ma kwuo na ọ bara uru dị iche iche.

"Ịgụ egwu bụ ihe e ji enyere ọnọdụ ahụike dị iche iche. Ọtụtụ ihe mejuputara ịgụ egwu. Ịgụ egwu gụnyere igosiputa ihe na-aga gị n'uche, nke anyị ma dịrị ọnọdụ ahụike ụbụrụisi mma. Ọ na-enyekwa aka izi mmekọrịta nwereike iwebilata ọnọdụ mmadụ iche na ọ bụ naanị ya kwụ."

O kwuru na ige egwu nwere ọtụtụ uru ọ baara ahụike.

"N'ime ndị na-aga emume ebe a na-agba egwu, n'agbanyeghi maọbụ egwu tara nchara maọbụ nke 'rock' - anyị chọpụtara na o buturu ọnọdụ mgbakasị ahụ. Nke a gosiri na ọ na-arụ ihe dị iche iche."

Akwụkwọ ndị Canterbury Christ Church University, UK, wepụtara gosiri na "Ịgụ egwu nwereike inyere ndị nwere ọrịa ụbụrụ na ọrịa ndị ọzọ dị iche iche aka".

Ndị nnyocha tinyekwuru sị "ịgụkọ egwu n'ọgbakọ karịrị otu onye nwere ọtụtụ uru ọ bara n'inyere aka na mgbake ndị nwere ọrịa ụbụrụ".

Ntụgharị uche

Annabel bụ okwe ukwe bi na mba Jamini, kwuru ihe ịgụ egwu mere n'uche nakwa ahụ ya.

"Mgbe ọbụla m na-agụ egwu, ọ na-adị m ka oge ntụgharị uche. M na-etinye onwe m n'ime egwu ahụ. Ọ na-eme ka ahụ dị m mma."

Ọ na-eji awa atọ agụ egwu kwa ụbọchị Tọzde ọbụla.

"Ị na-eji ahụ gị niile agụ egwu. Nke a bụ ihe m na-ekwu mere na anaghị m aga n'ụlọ mmegharị ahụ."

Ọrịa nchefu (Dementia)

A na-eji abụ nakwa ịgụ egwu dịka otu usoro e ji enyere ndị na-arịa ọrịa dementia aka.

"Mgbe anyị na-agụ egwu, e nwere akụkụ ụbụrụ anyị ọbara na-aka agaru - akụkụ ndị a na-akpọ precortical - ha bụ ndị nke na-afọkarị n'ụbụrụ onye na-arịa dementia mgbe ọrịa ahụ kpụrụchara akụkụ ndị ọzọ. Ebe ahụ bụ ebe ndị metụtara etu ihe si emetụta mmadụ," ka Dkt. Simon Opher kwuru.

Dkt Opher si obodo Cheltenham dị n'Ịngland, kwuru sị na ige egwu "na-akpọte ndị na-arịa dementia ma mee ka uche ha dịrị n'ihe a na-eme."

Uru

Mind Song bụ ụlọọrụ efu dị na mba Briten na-eziga ndị ọgụ egwu ha ka ha gaa n'ụlọ ebe a na-elekọta ndị merela agadị, ka ha nwee ike ikpalite mmụọ ndị agadị ahụ ka ha nwee ike na-agụ egwu.

"E nwere uru ndị ị ga-erite site n'iso ndị mmadụ gụọ egwu. Ọtụtụ ndị na-elekọta ndị agadị na-agwa anyị na ha na-anọ n'ọnọdụ obi aṅụrị ruo echi ya," ka Maggie Grady, onye na-ahazi iji egwu agwọ ọrịa nke ngalaba a kwuru.

Mind Song na-ahazikwa nkuzi egwu maka ndị na-arịa ọrịa akpaume site n'asthma ruo kansa nke akpaume.

"Ha bịachaa mmụta ihe ruru ugboro ise maọbụ isii, ụfọdụ ndị anyị na-akuziri na-agbaketu."

Ule a na-akpọ "Peak flow" na-egosi etu ikuku ga-esinwu n'akpaume kupute ọsịsọ - nke bụ otu ụzọ e si ama ndị iku ume na-ara ahụ.

Ike akpaume

Ọ bụghịzị ihe ịtụnanya na ndị ọrịa akpaume na-enye oke nsogbu na-eji ịgụ egwu enyere ọnọdụ ha aka.

Colin na-arịa ọrịa a kpọrọ "idiopathic pulmonary fibrosis", bụ ọrịa na-enweghi ọgwụgwọ ma na-egbu ndị na-arịa ya n'ime afọ atọ.

Mana n'agbanyeghi etu ọrịa ahụ si jọọ oke njọ, o kwuru na ịgụ egwu na-enyere ọnọdụ ya aka.

"Mụ na ihe ruru mmadụ 16 na-agụ egwu. O nyerela m aka ikuzi ume karịa etu m si emebu. M na-eme nnyocha maka ọnọdụ akpaume m oge ọbụla ma chọpụta na o mewela ọfụma."

Mmiri ọgwụ ahụ

Ịgụ egwu na-eme ka ahụ nyụpụta endorphins, bụ nke na-eweta obi ụtọ.

Ịgụ egwu na-eme ka anyị kuba ume, nke na-akwalite mgbasa ọbara n'ahụ ma na-ewelite ọrụ endorphins na-arụ.

Ọ dị ka etu endorphin si agbagharị n'ahụ ma anyị chịa ọchị maọbụ rie chọkọleti.

Otu nnyocha gosiri na ị soro ndị mmadụ gụkọọ egwu ihe ruru nkeji 40, na cortisol - bụ mmiri ọgwụ mgbakasị ahụ - na-ada ọsisọ karịa etu ọ gaara ị na-eme.

Ogo cortisol anyị na-eru na-ada n'ebe ngwụcha ụbọchị, mana ịgụ egwu na-enyere ya aka ịgasi ike.

Nchọpụta gosiri na ndị na-agụ egwu na kwaya na-aka amụpụta mmiri ọgwụ ahụ a kpọrọ oxytocin, bụ nke a na-akpọ "mmiri ọgwụ ịhụnanya" mgbe ụfọdụ.

Anyị na-anyụpụta ya ma anyị makụọ, ọ na-emekwa ka ntụkwasị obi na mmekọ mmadụ na mmadụ mụbanye.

Nke a nwereike ịkọwa ihe mere ndị na-agụkọ egwu na kwaya ji abụkarị ma na-anọkọkarị ọnụ ọtụtụ oge.

Ịgụ egwu na-ebutekwa nnyụpụta dopamine, bụ otu ihe na-agwa ụbụrụ egwu.

A ma ya dịka ihe na-ewepụta "obi ụtọ" ma ihe dịka iri nri maọbụ ịṅụ ọgwụ ike kpalie ya. Nnyụpụta ya na-adị ka nkwado nakwa mkpalite mmụọ.

Enyemaka teknụzụ

Ndị achọghị ịpụ n'ụlọ ha nwereike isonye ndị na-agụ egwu n'elu kọmputa, ha na-agbalị ime ka ọ dị ka ebe mmadụ so ọtụtụ ndị mmadụ nọ otu ebe na-agụ egwu.

Atụmatụ a na-akpọbata ọgụ egwu ndị ọzọ si na mpaghara ụwa dị iche iche ma jiri teknụzụ jikọọ ha.

Eric Whitacre bụ onye riterela nturuugo Grammy maka ide na ihazi egwu nwere otu kwaya nke a na-agụ n'elu ịntanetị.

Ndị na-agụ egwu n'akukụ ụwa dị iche iche ga-agụ nke ha ma zibata ya, a hazie ya ọfụma ma mee ya ka ọ bụrụ otu nkwepụta.

Mgbochi

Ndị na-eme nnyocha na-akọwa na mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke isonye otu ndị na-ekwe egwu na-ebute nwekwara ike iwedata mmadụ ịnọrọ onwe ya.

N'adịghị ka ụmụaka na-amalitekarị ịgụ egwu n'ụlọakwụkwọ, ọ na-ara ọtụtụ ndị okenye ahụ isonye otu egwu.

MJ Paranzino kara ndị mmadụ obi were sị: "Oge mbụ mmadụ na-agụ egwu na-adi ka ụbọchị mbụ mmadu malitere ọrụ. Ọ gagahị adịcha gị mfe,ị nwereike na-eme ihere. Ọ bụ ịka obi ka eji aga n'ihu. Mana, ewezụga ihere na ihe ndị ọzọ nọchiri gị n'ụzọ, ị ga-achọputa ọwa ọhụrụ mara ezigbote mma. Once you get over those inhibitions, you will discover an amazing new world,"