Black Hole: Ọ ga-elonwu ụwa?

Ndị na-enyocha mbara igwe ewepụtala foto ebe ha setere 'mpio ojii' dị n'otu ụyọkọ kpakpando (galaxy).

Ndị ọkammụta sayensị kwuru na ihe e ji atụnyere etu ọ ha bụ na o ji ihe ruru ugboro nde atọ karịa etu ụwa ha, ma jiri ihe ruru ijeri 40 tee aka.

E ji ihe e ji enyo mbara igwe nke bekee kpọrọ "telescope" asatọ wee sete foto mpio ojii a bekee kpọrọ "black hole".

Ọkamụta Heino Falcke si na mahadum dị na Mba Neitherlands, ebe esi wepụta atụmaatụ a kwuru na ha hụrụ ya bụ "black hole" na ọgbakọ kpakpando akpọrọ M87.

"Ihe anyị hụrụ karịrị ụwa ebe anyanwụ na-eru na mbaụwa niile", Falcke kwuru.

Falcke kwuru na mpio oji a bụ ọkachasị na mpio ojii ahụgoro na mbaụwa niile .

Gịnị ka ha hụrụ na "black hole"a?

Ha chọpụtara ọla ọkụ gbara ya okirikiri bekee kpọọ "ring of fire".

Ọkụ a na-egbuke egbuke chakarịrị ijeri kpakpando dị n'ime ọgbakọ kpakpando ya mere e ji hụtali ya n'akụkụ ụwa.

Ihe ndị mmadụ na-ajụ bụ kedụ ihe ga-eme maọbụrụ na otu ihe daba na mpio oji ahụ.

Gịnị bụ "black hole"?

  • "Black hole" bụ ohere ihe enweghị ike ịpụli na ya.
  • Maka aha ya, onweghị ohere etu ahụ kama o nwere ihe siri ike na-adọkpụ ya.
  • O nwere oghere ebe a na-akpọ "event horizon"