Oscars 2018: Kobe Bryant so na ndị nwere nrite

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

N'ihe ịtụ anya mere ka Kobe Bryant bụ onye ama ama ka ọgbaa basketbọọlụ n'Amerịka atụrụla ugo na ntuliugo nke ihe onyonyo a na-akpọ Oscars.

O ritere ihe a maka ihe onyonyo nke eserese nwa-oge.

Lee ndị ọzọ nwere nrite na Oscars emere n'ọnụ utụtụ a.

Ndị mmeri:

The Shape of Water nwere nrite nke 'Best picture'

Frances McDormand ritere nke a na-akpọ 'Best actress' maka Three Billboards Outside Ebbing, Missouri

Onye ritere nke a na-akpọ 'Best actor' bụ Gary Oldman maka Darkest Hour

Guillermo Del Toro ritere nke a na-akpọ 'Best director' maka The Shape of Water

Get Out nke Jordan Peele dere ritere 'Best original screenplay'