Elekshion US 2016: Anwụchiela ndị Russia kpatọsiri aka

Anwụchiela ndị Russia ruru iri atọ maka aka ha kpatọsiri na mbinye aka US mere n'arọ 2016,nke a chọpụtara na nyocha FBI.

Mmadụ na atọ akpọrọ aha ka eboro ebubo ikpa nkata mpu ekwenti akpọrọ 'wire fraud' n'olu oyibo.

Onye kwupụtara ihe a bụ onye ọkaiwu Robert Mueller,onye nke na-enyocha nkpatọsị aka ndị Russia.

Ụlọọrụ atọ dị na Russia so na nrụrụaka.

Mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu,osote ọkaịwu akpọrọ Rod Rosenstein kwuru na onweghị ebubo na onye mba Amerika so na ihe nrụrụaka a maọbụ

ebubo gosiri na nkpatọsịaka a mebiri ihe mbinye aka US elekshion 2016 pụtara.

Mana o kwuru na akwụkwọ ruru pejii iri atọ na asaa gosiri na ndị Russia chọrọ ikụnye mkpụrụ nhasa na mba Amerika.

kedu ihe ebubo a putara?

Ebubo a kwuru na ụfọdụ ndị eboro ebubo ji kọmputa na US we zoo na ihe omume ha si na Russia.

okwukwara na ndị a eboro ebubo jiri aghụghọ gbanwe ọnọdu ha dika ndị si na mba US,mepe pejii n'igwe okwu ọhụrụ ka ha we dọta ndị mba US.

Ha mepekwara ma na-elebanya na ọtụtụ igwe okwu twita edoziri ka ọ dika ọbụ ndi US na hazi ya.