Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu anọọla ụbọchị 60 n'ọkwa ahụ.
Ọ bụ ezie na otu ndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' (PDP) na ndị 'Labour Party' (LP) ka nọ n'ụlọikpe na-agbagha mpụtara ntuliaka nke wepụtara Tinubu dịkaonyeisiala, mana ọdịghị ka nke a ọ na-emetụta Tinubu, dịka ọ maliterela ọrụ ya ka onyeisiala na-eleghị anya n'azụ
N'ime ụbọchị 60 a Tinubu rụrụla ọrụ dịka onyeisiala, ọrụ ya agbapụtala ihe, ụfọdụ na-ekwu na na ọrụ ya dị mma, ndị ọzọ na-akatọ ya, ọ dabeere n'onye ị jụrụ.
Anyị ga-agbali itule ụbọchị 60 nke onyeisiala Tinubu n'ọchichi n'isiokwu isii ndị a:
N'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee 2023, dịka e duchara Tinubu n'iyiọrụ dịka onyeisiala, o kwupụtara sị "Fuel Subsidy alaala".
Okwu a tinyere ọgbaaghara na Naịjirịa dịka ndị na-ere mmanụ ụgbọala kwụsịrị ire, ma mechaa tinye ya nnukwu ego nke mere ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala gbalie site na N184 ruo N488.
Iji mee ka ihe nhịahụ ndị mmadụ na-agabiga na Naịjirịa dịtụ mfe, onyeisiala gwara ndị omeiwu ka ha nye ya nkwa ịgbazite ego dị nde $800 n'aka ụlọakụ mba ụwa.
Tinubu kwuru na ezinụlọ dara ụbịa ga na-enweta ego enyemaka puku naịra asatọ kwa ọnwa ruo ọnwa isii site n'ego a ụlọakụ etiti ga-agbazinye Naịjirịa.
Mana ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ atụmatụ ahụ nke mere onyeisiala Tinubu ji kwuo na a ga-elebanye anya ọzọ na ya bụ atụmatụ.
2) Atụmatụ dị icheiche maka ngalaba akụnụba
Onyeisiala Tinubu chụpụrụ Godwin Emefiele bụbu gọvanọ ụlọakụ etiti nke Naịjirịa (CBN) ma họpụta Folashodun Adebisi Shonubi iji nọchie ya.
Tinubu kwupụtakwara na gọọmentị ya ejikọọla ọnụahịa mgbanwe ego ofesi, nke pụtara na ọnụahịa ego dọla, maọbụ paụnd maọbụ Euro bụzị dịka ahịọ́ si kwuo ka ọ ga-eji gbalie maọbụ gbatuo.
Onyeisiala binyekwara aka n'akwụkwọ iwu anọ iji ụfọdụ ụtụisi nke a na-ana maka ịkpọ oku ekwentị, mmanya alkọhọl, nakwa ụfọdụ ụgbọala.
Ndị na-ekwuru onyeisiala kọwara na nke a bụ iji mee ka ọ dịwanye mfe ndị ojiego achụ ego ịbata na Naịjirịa maka azụmahịa.
Ọzọkwa bụ, iji belata etu ọnụahịa ihe oriri si arị elu, onyeisiala Tinubu tinyere ọnọdụ gbatagbata na ngalaba nkọpụta na nchekwa ihe oriri na Naịjirịa.
O nyere iwu ka ihe niile gbasara ihe oriri bụrụzie nke ngalaba 'National Security Council' ga na-ahụ maka ya.
3) Ego mgbazinye maka ụmụakwụkwọ
Otu n'ime nkwa Onyeisiala Tinubu kwere oge ọ na-achụ nta vootu bụ iwepụta atụmatụ mgbazinye ego maka ụmụakwụkwọ ndị nne na nna ha enweghị ego iji zụọ ha na mahadum.
N'ụbọchị olemole o ji malite ọrụ, Tinubu binyere aka n'iwu ọhụrụ gbasara nke a. Iwu a nyere ohere ka ụmụakwụkwọ enweghị ego gbazite ego n'ụlọakụ iji kwụọ ụgwọ akwụkwọ ha, ma kwụghachi ya bụ ego mgbe ha gụchara akwụkwọ ma nweta ọrụ.
Mana ọtụtụ akatọọla iwu a dịka ha kwuru na dịka iwu ahụ siri dị, ọ ga-ara ahụ nwata akwụkwọ ọbụla irite uru na ya.
4) Mgbanwe ndị isi ọrụ nchekwa, na ndị ọzọ onyeisiala họrọ n'ọrụ
Ndị isi ọrụ nchekwa ọhụrụ nke onyeisiala Tinubu họpụtara gụnyere:
- Nuhu Ribadu - 'National Security Adviser'
- Maj. Gen. Christopher .G Musa - 'Chief of Defence Staff'
- Maj. Gen. Taoreed. A Lagbaja - 'Chief of Army Staff'
- Rear Admirral E. A Ogalla - 'Chief of Naval Staff'
- Hassan Bala Abubakar - 'Chief of Air Staff'
- DIG Kayode Egbetokun - 'Inspector General of Police'
- Adeniyi Bashir Adewale - onyeisi 'Customs'
- Maj. Gen. Emmanuel Akomaye Parker Undiandeye - 'Chief of Defense Intelligence'.
Nke a ka Tinubu bụrụ onyeisi Naịjirịa nke itoolu na-anọ n'ọkwa a kamgbe afọ 1975 oge Yakubu Gowon bụụrụ onye Naịjirịa mbụ nọrọ n'ọkwa ahụ.
Kamgbe Tinubu bụụrụ onyeisi Ecowa, e nweela ọgbaaghara na mba Niger Repọblik, bụ otu mba so n'Ecowas, nke mere ka Tinubu ziga ndị mmadụ na mba ahụ ịga kpaa udo.
6) Njem ofesi Tinubu merela
Njem ofesi mbụ Tinubu mere bụ oge ọ gara obodo Paris, na mba Fransị, isonye n'ọgbakọ mba ụwa a kpọrọ 'Paris Summit for New Global Financial Pact'.
O sonyekwara n'ọgbakọ Ecowas na mba Guinea Bissau bụ ebe a nọrọ nye ya ọkwa onyeisi oche.
Tinubu gakwara mba Kenya ebe o sonyere n'ọgbakọ 'African Union' nke e nwere n'obodo Nairobi.