Gịnị bụ ọrụ Tinubu dịka onyeisioche Ecowas?

Otu 'Economic Community of West African States' (Ecowas) ahọpụtala onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu dịka onyeisioche ọhụrụ nke otu ahụ.

Ecowas bụ otu jikọrọ mba dị icheiche dị na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka.

Ọ bụ n'ọgbakọ ndị isi ala mba so n'otu Ecowas nke iri isii na atọ bụ nke na-aga n'ihu ugbua na mba Guinea Bissau ka a nọrọ họpụta Tinubu n'ọkwa a n'ụbọchị Sọnde, Julaị 9, 2023.

Tinubu nọchiri onyeisiala mba Guinea Bissau bụ Umaro Embalo dịka onyeisi Ecowas.

"Anyị ga-eji ọchịchị onye kwuo uche ya kpọrọ mkpa, ọ bụ usoro ọchịchị siri ike, mana ọ bụ ya kacha mma," ka Tinubu kwuru n'ozi ekele ya dịka ọ nabata ọkwa ọhụrụ ahụ e nyere ya.

Ọgbakọ ndị isiala Ecowas nke a na-aga n'ihu ugbua bụ ọgbakọ mbụ nke Bola Tinubu na-esonye na ya na mpaghara Afrịka kamgbe e duchara ya n'iyi ọrụ dịka onyeisiala Naịjirịa n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee 2023.

Gịnị bụ ọrụ Tinubu dịka onyeisioche Ecowas?

Onyeisioche Ecowas nwere ọrụ dị icheiche nke gụnyere ikpe udo n'oge nsogbu, ikwalite mmekọrịta n'etiti mba dị icheiche nọ n'otu ahụ, nakwa ime mkpebi dị icheiche n'aha otu ahụ.

Ịnọ n'isi ọgbakọ Ecowas: Ọ bụ ọrụ onyeisioche Ecowas ịnọ n'isi ọgbakọ otu ahụ niile, ịchịkọta usoro ọgbakọ si aga, na ịhụ na ihe niile e kpebiri n'ọgbakọ ọbụla banyere n'ọrụ na'egbughị oge.

Ikpe udo: Tinubu nwere ọrụ dị mkpa dịka onyeisioche otu Ecowas n'ikpe udo nakwa ime ka mpaghara Ecowas dị jụụ.

Ụzọ o nwereike iji mee nke a gụnyere: site n'inwe mkparịtaụka, site n'ikpeziri mba abụọ na-enwe nghọtahie, nakwa itinye atụmatụ dị icheiche iji gbochie ọgbaaghara.

Imapụta atụmatụ mmepe: Ọ bụ ọrụ dịịrị onyeisioche otu Ecowas ịmapụta atụmatụ nakwa usoro dị icheiche bụ nke ga-akwalite ọnọdụ akụnụba nke mpaghara ahụ, mwulite nnyocha sayensị, na nkwalite mmepụta ihe dị icheiche.

Ịnọchite anya Ecowas: Ọ bụ onyeisioche Ecowas ga na-anọchite anya otu ahụ n'ọgbakọ mba Afrịka na mba ụwa dị icheiche, iji hụna oke ruuru mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka agaghị efulahụ ha.

Ọgbakọ ebe a tụrụ anya na onyeisioche Ecowas ga-anọchite anya otu ahụ gụnyete ọgbakọ 'African Union' (AU)); ọgbakọ mba ụwa bụ 'United Nations General Assembly; ọgbakọ mba Yurop bụ 'European Union', na ndị ọzọ dịka ha.

Anyị ga-ebuso enweghị nchekwa agha - Tinubu

N'okwu ya dịka onyeisioche Ecowas, Tinubu kwuru na ọnọdụ enweghị nchekwa na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka na-agbali elu nke ukwuu dịka iyi ndụ egwu ji nwayọ nwayọ na-akawanye njọ.

"Okwu gbasara udo na nchekwa abụrụla ihe anyị ga-ejikọọ aka ọnụ ma chọọ ụzọ anyị ga-eji gboo mkpa a na-echere anyị nnukeu aka mgba," Tinubu kwuru, dịka akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Dele Alake si gosi.

"N'ezie, ọ bụrụ na udo adịghị n'okirikiri ọbụla, ọganihu na mmepe ebe ahụ agaghị ekwe omume.

"N'ihi nke a, anyị ga-akwụdosi ike iji ihe niile anyị nwereike n'ụzọ iwu kwadoro iji gboo mkpa enweghị nchekwa.

"Anyị nwere atụmatụ anyị wepụtara iji buso ndị na-eyi ndụ egwu agha bụ nke a kpọrọ 'Regional Plan of Action on Fight against Terrorism 2020-2024'; nakwa atụmatụ 'ECOWAS Standby Force on Fight Against Terrorism'.

"Aga m agba mbọ ịhụ na anyị chịkọrọ atụmatụ ndị a ma chọtakwa ego nakwa nkwenye nke ọchịchị iji hụ na anyị mejupụtara ha.

"Ebe ọ bụ na ndị ekperima na-eyi ndụ egwu amaghị ihe bụ oke ala, anyị kwesịrị ijikọ aka ọnụ iji hụ na anyị busoro ha agha ma merie ha."

Tinubu katọkwara etu ndị agha si eweghara ọchịchị n'ike n'aka ndị nkịtị na mba dị icheiche na mpaghara ọdịd anyanwụ Afrịka, ma rịọ ka otu Ecowas kwụdosie ike n'ịkwado nakwa ichekwa ọchịchị onye kwuo uche ya.

Ihe dị mkpa ịmata maka otu Ecowas

Ecowas bụ otu e hibere n'ụbọchị 28 nke ọnwa Mee afọ 1975 n'ọgbakọ e nwere na Legọs Naịjirịa iji kwalite mmekọrịta, nzụkọrịta ahịa na nchekwa n'etiti mba ndị dị na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka.

Mba iri na ise so binye aka n'akwụkwọ isonye n'otu a. Ha gụnyere: Benin, Burkina Faso, Cabo Verde maọbụ Cape Verde, Cote D'Ivoire, The Gambia, Ghana, Guinea, Guinea Bissau, Liberia, Mali, Niger, Nigeria, Senegal, Sierra Leone na Togo.

Kamgbe e hibere otu a, ọtụtụ ndị isiala Naịjirịa arụọla ọrụ dịka ndị isi oche ya bụ otu. Ha gụnyere:

  • Yakubu Gowon - 28 Mee 1975 ruo 29 Julaị 1975
  • Olusegun Obasanjo - 13 Sepụtemba 1977 ruo 30 Sepụtemba 1979
  • Muhammadu Buhari - 1985 ruo 27 Ọgọst 1985
  • Ibrahim Babangida - 27 Ọgọst 985 ruo 1989
  • Sani Abacha - 27 Julaị 1996 – 8 Jun 1998
  • Abdulsalami Abubakar 9 June 1998 – 1999
  • Umaru Musa Yar'Adua - 19 Disemba 2008 ruo 18 Febrụwarị 2010
  • Goodluck Jonathan - 18 Febrụwarị 2010 ruo 17 Febrụwarị 2012
  • Muhammadu Buhari - 31 Julaị 2018 – 29 Jun 2019