You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Igbo festivals: Iri ji Mbaise agbajuola dọrọ tata
Mmemme Iri Ji Mbaise na-akpọtụ ugbua n'ụlọakwụkwọ 'Aboh Mbaise Secondary School' ebe obodo 91 mejupụtara Mbaise na-eri ji ọhụrụ taa bụ Tọzde.
Iri ji Mbaise bụ nke a na-eme kwa afọ ọbụla ma ọnwa August gbaa iri na ise.
Mmadụ puku kwụrụ puku zukọtara kemgbe ụtụtụ ụbọchị Tọzde, ebe ndị mbaise na egosi ejiri mara ha.
Ndị Eze-Ji niile bugasi ji gbara agba si na obaji ha bịa gosi ya ka ụwa kirie.
Eze-Ji HRH Eze Mike Ndudiri Orji kwuru na obodo Mbaise bụ ndị kasi ibe ha akọpụta ji, nke mere na ha na ebu ụzọ eme mmemme iri ji tupu obodo ndị ọzọ eriwe.
Ihe nkiri omenala juputara na iri ji Mbaise nke afọa gụnyere egwu omenala dị iche iche, ịgba mgba, ekike, ịgosi ọba ji nakwa ihe ndị ọzọ.
Lee ihe nkiri iri iji nke ndị mba ọzọ:
Lee akuko ga-amasị gị