2019 Women World Cup: Thailand ji nkata kpojuo goolu taa

Otu boolụ ụmụnwaanyị Sweden ji mba Thailand mere ihe ọchị taa dịka ha ji okpu goolu ise dọrie neetị ha.

Onye malitere ihe a bụ Linda Sembrant na nkeji 6 n'agba nke mbụ n'asọmpị ahụ.

Ndị ọzọ nyekwara goolu bụ Kosovare Aslani, Fridolina Rolfo, Linda Huritg na Elin Rubensson.

Kanjana Sungngoen gbalịrị ịzọpụta ndị Thailand na nkeji 91 mgbe o nyere ọkpụ goolu mana o nweghi isi.

Nke a ga-eme ya ugboro abụọ a na-emeri mba Thailand n'Iko mbaụwa ụmụnwaanyị nke afọ a.

Cheta na mba USA ji ọkpụ goolu iri na atọ merie ha n'asọmpi mbụ ha.

Ọ pụtara na ha nwereike ịlawa na ngwụcha agba nke mbụ a.

Ha na mba Chile ga-ezute onwe ha n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Juun.