George Weah enyela Arsene Wenger nturuugo na Liberia

Onyeisiala mba Liberia bụ George Weah ebunyela Arsène Wenger bụbu onye nchịkọta otu Arsenal ụkpa ekele ka o na-enye ya nturuugo kachasị elu na Liberia nke a kpọrọ 'Knight Grand Commander of the Humane Order of African Redemption'.

N'emume ịnye nturuugo a mere n'isi obodo Monrovia, Weah bụ onye ọgba bọọlụ mbụ mechara bụrụ onyeisiala nakwa naanị onye Afrịka riterela 'ọkacha agba na mbaụwa n'otu afọ nke Fifa' kwuru sị:

"Ị gosiri onwe gị dịka onye nkuzi a na-agaghị echefu ọsịsọ oge ị gbanwere etu e si achọpụta ndị ntorobịa nwere ọnatarachi n'ịgba bọọlụ na gburugburu ụwa, ọkachasị mpaghara Afrịka."

Claude Le Roy bụ onye nchịkọta bu ụzọ gwa Wenger maka Weah, nwetakwara nturuugo a.

Ọtụtụ ndị mmadụ ṅụrụ ọṅụ ka Weah nyere Wenger nturuugo ya na Samuel Kanyon Doe Sports Complex dị n'ọgbọ egwuregwu bọọlụ nke obodo ahụ.

Onye ntaakụkọ BBC bụ Jonathan Paye-Layleh, kwuru sị na ụfọdụ ndị Liberia na-ewe iwe na-ekwu na ekwesịghị inye mmadụ nturuugo naanị maka ihe o meere onyeisiala n'onwe ya.

Mana Eugene Magbe bụ mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi na Liberia gwara BBC na nturuugo a abụghị maka ihe jikọrọ Weah na Wenger, kama na ọ bụ ụzọ e si aghọta na Wenger "gbaara egwuregwu ezigbo mbọ n'Afrịka ma nyekwa ọtụtụ ndị Afrịka ohere".

Akụkọ ga-amasị gị