'Amalitere m Open Sharaton site n'isi moi moi n'akụkụ okporoụzọ New Haven Enugwu'
- Onye dere ya, Ebere Ekeopara
- Ndị mere akụkọ a, Reporter
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Open Sharaton Restaurant bụ ụlọ oriri a ma ama n'Enugwu steeti. Onye nwe ya bụ ụlọ oriri na-ewu ewu bụ Oriakụ Evelyn Ezeoma na BBC Igbo nwere mkparitaụka, ebe ọ nọrọ kọọrọ anyị ka ya siri malite ire nri n'ime afọ 1980's site n'isi moi moi, nakwa ighe akara na plantain.
Oriakụ Evelyn Ezeoma bụ onye Awo Idemili dị n'Imo steeti, dịka aha a na-etu ya bụ "Awọ dị m ahụ mma 1 n'Awo Idemili".
"Ọ bụ n'akụkụ ọwammiri ka m na-anọ ere moi moi, m na-esikwa na-ebunye ndị na-ere ere".
"Emechara m malite ighe akara, ji, plantain ma na-emekwa "sauce" e ji eri ya na akamụ".
"N'ihi na ihe siri ike mgbe ahụ, ihe ahụ m na-ere nyeere anyị aka ịzụ ụmụaka asatọ Chukwu jiri chọọ anyị mma".
"Amụtara m ụmụnwoke anọ na ụmụnwaanyị anọ, n'ime ha, a mụrụ m ejima ugboro atọ site n'ike nke Chukwu".
"Ọ bụ ndị "customer na-abịa eri nri na nke m bidoro kpọwa ya "Open Sharaton". Ha kọwaara m ihe nke ahụ pụtara, tupu anyị amalite zawazie ya bụ aha," ka Oriakụ Ezeoma kọọrọ anyị.

Oriakụ Evelyn Ezeoma kwuru na oge ọ malitere siwe nri "Mama put" ka ụlọ oriri ya gbasara na Enugwu, Abuja, Greec na Denmark, tinyere nke London ga-amalite oge adịghị anya.
"Chukwu gọziri m nke ukwuu, n'ihi na ụmụaka m niile nwere mmasị ịdị na-enyere m aka site n'oge ha na-aga akwụkwọ ruo ugbua, ya mere taa, ha na ndị nwunye ha sonyeere m n'iguzobe ụlọ oriri Open Sharaton na mba di iche iche.
Nwa ya nwoke bụ onye na-elekọta Open Sharaton ndị nke nọ na Naịjirịa bụ Chimezie Ejike Ezeoma kwuru na ya na ụmụnne ya mụtara ịgba mbọ n'aka nne ha.
"Nne m bụ Evelyn Ezeoma kuziiri anyị na ịgba mbọ amaka, anyị niile bụ ụmụ ya, ma nwoke ma nwaanyị maara ka e si esi nri nke ọma".
"Open Sharaton azụpụtala ọtụtụ mmadụ n'isi nri, mmadụ dịka Ntachi Ọsa bụ nwa nwanne nna m, ma bụrụkwa n'ụlọ anyị ka a zụrụ ya ka e si esi nri".
"Ọtụtụ ndị nne m zụpụtara n'isi nrị bụ agụkata agba awaa," ka Ejike Ezeoma kọwara.
Taa, i tinye isi n'ụlọ oriri ahụ n'ebe ọbụla ha nwere ngalaba, ị ga-ahụ ọtụtụ nrị ndị ala anyị nakwa nke ndị mba ọzọ, tinyekwara na ha enweela ebe a na-azụpụta ndị na-esi nri kwa mgbe kwa mgbe.
Ndị ọrụ nọ na Open Sharaton ugbua kariri narị atọ n'ụma.


