You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
2023 Google Trends: Mohbad, Peter Obi, Ntuliaka 2023, Mr Ibu, Moyo Lawal na ihe ndị ọzọ a kachasị chọọ n'intanet n'afọ a
Ngụkọ ihe ndị mmadụ kachasị chọọ n'ọbaozi intanet nke afọ 2023 agbaala.
Ngukọ ahụ nke ụlọọrụ Google wepụtara gosiri na otiegwu a ma ama lara mmụọ na nso nso a bụ Ilerioluwa Aloba e ji 'Mohbad' maara, omee ihe ejije Nollywood bụ Moyo Lawal, onye fere ọkọlọtọ otu 'Labour Party' na Ntuliaka Onyeisiala Naijiria nke afọ 2023 bụ Peter Obi na onye ihe ejije Nollywood a ma ama bụ John Okafor a ma dịka 'Mr Ibu' so na ihe ụmụ Naijiria tinyere anya achọ n'ịntanet n'afọ 2023.
Nnyocha ozi dị n'ihe na-ewu ewu na Google gosiri n'ihe metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị, ịkpa obiụtọ na egwuregwu bọọlụ nakwa akụkọ banyere ha so n'ihe ndị mmadụ chọrọ n'afọ 2023 dịka afọ a na-apịakọ.
Mohbad nwụrụ n'abalị 12 nke ọnwa Sepụtemba n'ụzọ edochaghị anya nke kpalitere ngagharịiwe ndị ntoroọbia bụ ndị kpọrọ oku ka e nyochaa etu o siri nwụọ.
Moyo Lawal bụ onye ụmụ Naijiria kachasị chọọ maka ya nakwa onye ihe ejije a kachasị chọọ maka ya n'afọ 2023.
Nwaada ahụ gụrụ " Creative Arts" na mahadum ' University of Lagos' kpọtụrụ akpọtụ n'afọ 2023 dịka ihe onyonyo ebe ya na nwoke na-eme mmekọ gbara n'ịntanet n' onwa ole na ole gara aga.
Naijiria mere ntuliaka onyeisiala n'ọnwa Febụwarị afọ 2023 nke ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka bụ Independent National Electoral Comission (Inec) kpọpụtara Bola Amhed Tinubu dịka onye meriri na ntuliaka ahụ.
Peter Obi bụ onye fere ọkọlọtọ 'Labour Party' na ntuliaka ọkwa onyeisiala 2023 ma gbaa onye nke atọ dịka Inec si kpọpụta mpụtara ntuliaka ahụ.
Akụkọ banyere Mr Ibu, onye ihe ejije Nollywood ezi aha ya bụ John Okafor wuru ewu n'afọ 2023 dịka akụkọ na ọ dara nnukwu ọrịa nke mere ka ndị dọkịta bepụ ya ụkwụ iji zọọ ya ndụ.
Osite Hilda Effiong Bassey a ma dịka 'Hilda Baci' ghọrọ onye aha ya na-ada ụda n'ụwa dịka o siri nri ezughị ike awa 93 hours 11 minutes were si etu ahụ debanye aha ya n'akwụkwọ 'Guinness World Record' dịka ọ kụpụrụ onye jibu nturuugo ahụ nwaanyị osite India a kpọrọ Lata Tondon bụ onye jibu nzere onye kachasị sie ni ezughị ike dika o sii awa 87 na nkeji n'aọ 2019.
Hilda Baci malitere isi nri n'asompi ahụ ọ kpọrọ onwe ya n'abalị 11 nke ọnwa Mee, afọ 2023 ma pịachie akwụkwọ mmei ya n'abalị 15 nke ou ọnwa ahụ.
N'aka nke ọzọ, ihe ndị ọzọ uche ụmụ Naijiria gara na ya n'afọ 2023 gụnyere mweghara ọchịchị n'ike na Gabon, Agha Izrel na Gaza, mgbanwe ego Naira wdg.
Ụlọakụ Etiti bụ CBN n'ịchafụ nke Godwin Emefiele pụrụ apụ nọ n'isi ya, machiri iji ego akwụkwọ ego naịra ochie azụ ahịa dịka ha bipụtara nke ọhụrụ iji kpachie ohere ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ịzụ vootu tupu ntuliaka 2023.
Mmachi ahụ butere ụkọ naịra na mmalite afọ.
Ihe ndị ọzọ ndị mmadụ chọrọ n'intanet n'afọ 2023 gụnyere ChatGPT, otu egwu bọọlụ Chelsea, Manchester United, ihe onyonyo ndị gba ọtọ nke Bekee kpọrọ 'pornography' na mmekọrịta nwoke na nwaanyị (sexual intercourse).
ChatGPT bụ igwe 'artificial intelligence' e ji ezirịta ozi n'intanet , ma rụkwaa ọrụ ndị ọzọ.