Ndịiche dị n'ụfọdụ kalenda ọtụtụ mbaụwa ji agụkọ afọ

Dịka ọtụtụ mba dị n'ụwa abanyela afọ ọhụrụ 2023 ma malite ịgụkọ ụbọchị ndị mejupụtara afọ a.

Ihe na-enye aka na ngụkọ afọ ndị a bụ ihe a na-akpọ kalenda.

Kalenda bụ ederede maọbụ eserese e ji ahazi oge ndị mejupụtara afọ. A na-eme nke a site n'inye oge ndị a aha dịka ụbọchị, izuụka, ọnwa ruo n'afọ.

Ọ bụkwa ihe a na-eji egosi oge emume dị iche iche ga-enyere ndị mmadụ aka icheta ma oge ahụ ruo.

E nwere ọtụtụ kalenda nke e ji agụkọ oge, ụbọhcchị, ọnwa nakwa afọ n’ụwa.

Ụfọdụ kalenda ndị a gụnyere;

Gregorian Kalenda

Nke a bụ kalenda kachasị gbapụta ihe ma bụrụ nke ọtụtụ mba nọ n’ụwa ugbua ji agụ afọ.

Ọ malitere n’afọ 1582 mgbe Pope Gregory XIII hiwere ya iji dochie anya Julien kalenda.

Kamgbe ahụ Gregorian kalenda malitere ịgbasa site na mba Italy, gawa Pọtugaalụm, Spen, Igland, Jamini Amerịka ruo ma Swidin, Japan nakwa Chaịna.

Kalenda a dị oke mkpa nye ndị okpukperechi Kraịst maka na ọ na-enyere ha aka na mgbakọ ụbọchị ọnwụ nakwa mbilite n’ọnwụ Jesus Kraịst (Easte).

Njirimara Grehorian kalenda gụnyere

  • Gregorian kalenda so na ndị a na-akpọ ‘Solar calender’
  • O nwere ọnwa iri na abụọ mejupụtara otu afọ nakwa ụbọchị 365 maọbụ 366.
  • Otu ọnwa nwere ụbọchị iri abụọ na asatọ ruo ụbọchị iri atọ na otu (28days – 31days)
  • Otu ọnwa nwere izuụka anọ mejupụtara ya.

Chinese Kalenda

Na-agbanyeghi na mba Chaịna ugbua na-eji Gregorian Kalenda agụ afọ mana ha nwere kalenda ọdịnala ha bụ nke na-egosi ụbọchị ezumike pụrụiche sịka emume ‘Lantern Festival’.

Kalenda a dị ndị Chaịna mkpa maka ihiwe ụbọchị agbamakwụkwọ, akwamozu, azụmaahịa nakwa ụbọchị ndị ọzọ pụrụiche.

Mba ndị dịka Koria, Vietnam nakwa Ryukyu Island na-ejikwa ya agụ afọ.

Njirimara Chinese kalenda

  • O so na kalenda a na-akpọ ‘lunar calender’
  • O nwere ọnwa iri na abụọ mejupụtara otu afọ.
  • Otu ọnwa nwere ụbọchị iri abụọ na itoolu maọbụ iri atọ bụ nke na-amalite mgbe ọbụla ọnwa pụtara n'eluigwe.
  • Ọ bụ aha anụmanụ ka e ji gụọ ọnwa iri na abụọ ndị a – oke (rat), ehi (ox) , agụ (tiger), oke oyibo (hare), dragọn, agwọ (snake), inyinya (horse), atụrụ (sheep), enwe (monkey), nnụnụ (fowl), nkịta (dog), ezi (pig).

Hebrew Kalenda

Aha ọzọ e ji maara ya bụ kalenda ndị Juu, a na-eji ya agụ afọ maka emume ndị Juu.

Ọ bụ kalenda e ji maara ndị mba Izrel, nke na-egosi ụbọchị ezumike ndị Juu nakwa emume ha ndị ọzọ.

Ndị Izrel na-ejikwa kalenda a egosi oge ha ji akụ ihe n’ugbo nakwa oge e ji eme owuwe ihe ubi.

Njirimara Hebrew kalenda

  • O so na ndị bụ lunar kalenda
  • O nwere ọnwa iri na abụọ n’ime otu afọ mejupụtara ọnụọgụgụ ha.
  • Ntọala kalenda a si na kalenda ndị Babilọn, nke ụfọdụ aha ọnwa ha bụ - Aviv, Ziv, Ethanim, Bul, Tishri etc.
  • A na-eme emume oriri ngabiga (passover) n’ọnwa Nissan, ebe afọ ọhụrụ ndị Juu na-abụ n’ọnwa Tishri.

Islamic kalenda

Nke a bụ kalenda e ji maara ndị okpukperechi alakụba bụ nke ha ji efe ofufe nye chi ha.

Ndị Islam na-ejikwa ya egosi ụbọchị ezumike ha nakwa oge ha na-eji atụ aja, oge ibu ọnụ ha (fasting), nakwa oge ha ji eme njem n’ala nsọ (pilgrimage).

Mmalite ọnụọgụgụ kalenda a gbakwasịrị ụkwụ mgbe onye amụma ndị Islam bụ Muhammed mere njem site na Mecca ruo Medina.

Njirimara Islamic Kalenda

  • Ọ bụ kalenda Lunar
  • Ọ naghị enwe mgbakwunye ọnwa maọbụ ụbọchị a kpọrọ ‘Leap months/days’.
  • O nwere ọnwa iri na abụọ nke mejupụtara otu afọ nwere ụbọchị 354 maọbụ 355.
  • Ọtụtụ mba ndị okpukperechi alakụba na-eji maka ịgụ oge ofufe ha mana na-eji Gregorian kalenda na-agụ afọ.

Ethiopian kalenda

Nke a bụ kalenda e ji agụ afọ na mba Ethiopian. Ọ bụ kalenda ndị nkiti na ndị okpukperechi ji agụkọ afọ ha.

O ji ọnwa itoolu na-eso Gregorian kalenda.

Njirimara Ethiopian Kalenda

  • Ọ bụ solar kalenda dịka Gregorian kalenda.
  • O nwere ọnwa iri na abụọ nke otu n’ime ha nwere ụbọchị iri atọ agbakwụnyere ụbọchị ise maọbụ isi.
  • Ụbọchị mbụ nke Ethiopian kalenda na-abụkaarị n’ụbọchị 11 nke ọnwa Sepụtemba nke Gregorian kalenda.
  • A na-akpọ afọ ọhụrụ ya Kudus Yohannes.

Ụfọdụ agbụrụ ndị ọzọ nọ n’ụwa nwekwara kalenda ha ji agụkọ afọ ha.