Ihe jikọrọ Izuogu na Iheme nke mejupụtara obodo Arondizuogu

Aha onyonyo, Arondizuogu Community: Ihe jikọrọ Izuogu na Iheme nke mejupụtara obodo Arondizuogu

Otu nwafọ obodo Arondizuogu bụ Chris Madu akọwaala etu obodo ha si malite site na mmekọrịta ndị nna ha ochie bụ Izuogu na Iheme.

Ọ sị na ndị Izuogu si n'obodo Arochukwu dị n'Abia Steetị wee bata n'ebe ha nọ ugbua n'Imo Steetị mgbe nna ha ochie bụ Maazị Izuogu Mgbokpo mere njem ebe ahụ.

Ọ sị na Izuogu lụrụ ọgụ ma lụta ala ndị ahụ maka na a maara ndị Aro dịka ndịagha na ha na-alụrụ obodo ọgụ.

Ọ sị na obodo ọbụla ha lụụrụ ọgụ na ndị ahụ ga-enye ha ala ka ha biri nwee ike na-echekwa ha.

Obodo Arondizuogu

Madu gara n'ihu kọwaa ihe jikọtara Izuogu na Iheme, ọ sị na Iheme bụ onyeisi ndị odibo Izuogu na ọ rụrụ ọrụ ya nke ọma.

Nke ahụ mere Izuogu jiri ṅụọ iyi sị na o werela Iheme dịka o si were onwe ya, nke a pụtara na ha abụọ abụrụla nwanne.

"Izuogu kere ihe niile o nwere nke gụnyere ala na akụnaụba ụzọ abụọ ma nye ma nye Iheme otu mpaghara".

Na ọ bụ etu ahụ ka ha si biri n'otu ma mejupụta obodo Arondizuogu rute ugbua.

Skip Akụkọ ndị ọzọ banyere Ikeji ndị Arondizuogu and continue readingAkụkọ ndị ọzọ banyere Ikeji ndị Arondizuogu

End of Akụkọ ndị ọzọ banyere Ikeji ndị Arondizuogu

Ihe i kwesịrị ịma maka Arondizuogu?

Obodo Arondizuogu

Arondizuogu bụ Obodo gbara nnukwu mgbọrọgwụ na Omenala Igbo. Ha nọ ebe dị iche iche dika Okigwe, Ideato, Onu Imo na ebe ndị ọzọ.

Ndị Arondizuogu na Iheme dịka esi mara ha, si na Arochukwu were gbasaa ebe dị iche iche na-ala Igbo.

E jị ime mmụọnwụ, ịkọ ugbo, ịgwọ ọgwụ omenala na ịlụ ọgụ mara ndị Arondizuogu mgbe gboo.

Mana taata ha so na ndị kacha nwee agba na-ala Igbo na ịgụ akwụkwọ, ngalaba Sayencị na teknụzụ nakwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Gee ọkammụta Chris Madu ntị ka ọ kọwara anyị maka ndị a na-eme ihe ike bụ Arondizuogu.