Hage Geingob bụ onyeisiala mba Namibia anwụọla ka ọ gbachara afọ 82

 Hage Geingob bụ Onyeisiala mba Namibia

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala mba Namibia bụ Hage Geingob anwụọla dịka ọ na-ata ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ dị n’isiobodo bụ Windhoek.

Osote onyeisiala ha bụ Nangolo Mbumba kwupụtara na Geingob nwụrụ n’isi ụtụtụ ụbọchị Sọnde 4 Febụwarị 2024.

“N’akụkụ ya bụ nwunye ya bụ Madame Monica Geingob na ụmụ ya,” dịka Maazị Mbumba si kwuo n’ozi o wepụtara.

Onyendu a gbara afọ 82 nọbu na-arịa ọrịa kansa ma kwupụta ọrịa a n’ihu ọha n’ọnwa gara aga.

Ụlọọrụ ya kwuru na ọ ga-eme njem gaa mba Amerịka maka ọgwụgwọ, ma sị na ọ ga-alọghachị na Namibia n’ụbọchị abụọ nke ọnwa Febụwarị.

Nwamadị a buru ọkwa onyeisiala n’afọ 2015 ma na-achị ọchịchị nke ugboro abụọ bụ nke ikpeazụ ya.

O mere ọwụwa ahụ a kpọrọ ‘aortic operation’ n’afọ gara aga ma kwupụta na ọ gbakeela site n’ọrịa kansa nke a kpọro ‘postrate’ n’afọ 2014.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Ihe i kwesịrị ịma maka Hage Geingob

Onyeisiala mba Namibia

Ebe foto si, @NAMPRESIDENCY/TWITTER

  • A mụrụ Hage Gottfried Geingob n’ụbọchị atọ nke ọnwa Ọgọstụ 1941
  • Geingob bụ nnukwu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị mba Namibia banyere n’ọkwa onyeisiala n’ọnwa Maachị afọ 2015 ruo oge ọnwụ ya.
  • O jibu ọtụtụ ọkwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị gụnyere; Praịm minista mbụ nke mba Namibia mgbe ha nweere onwe ha n’afọ 1990 ruo 2002, chịa nke ugboro abụọ site n’afọ 2012 ruo 2015
  • Ọchịchị ya nyere aka n’ịhazi nakwa ịtụziaka n’ukporo mba ahụ ga-adị.
  • Ọ banyere n’ọchịchị Onyeisiala n’afọ 2015 ma nọrọ ebe ruo oge ọnwa ya dịka ọ na-achị nke ugboro abụọ.
  • Ọchịchị ya gbadoro ụkwụ na mwulite akụnaụba, ọdịmma ndị obodo nakwa mmekọrịta Namibia na mba ndị ọzọ.

Mba Namibia na-akwado ime ntuliaka onyeisiala na ndị omeiwu n’ọnwa Nọvemba afọ a.

Otu ndọrọ ndọrọ nọ n’ọchịchị bụ Swapo kamgbe ha nweere onwe ha n’afọ 1990 họpụtara Nwada Nandi-Ndaitwah dịka onye ga-eji aha ha azọ ọkwa onyeisiala.

Ugbua o ji ọkwa dịka osote praịm minista mba Namibia, ọ ga-abụ nwaanyị mbụ ga-achị mba Namibia ma ọ bụrụ na o merie.