Ego ekwesighị ịbụ ihe mbụ onye na-agụ egwu ụka ga na-achọ - Otiegwu Prudence Nwachukwu

Ego ekwesighị ịbụ ihe mbụ onye na-agụ egwu ụka ga na-achọ - Otiegwu Prudence Nwachukwu
    • Onye dere ya, Marvelous Obomanu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Otiegwu ụka a ma ama na Naịjirịa bụ Nwada Prudence Chisom Nwachukwu enyeela ndị na-agụ egwu ụka ndụmọdụ banyere ịnara ego tupu ha amalite ịgụ egwu.

Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, otiewgu Prudence bụ onye Imo steeti, n'okpuruọchịchị Mbaise tinyere ọnụ na-etu ọtụtụ ndị na-eti egwu si ewere ego buru ụzọ karịa onyinye Chukwu nyere ha.

Prudence Chisom kwuru na ị tinye ego n'ihu mgbe ọ bụla a kpọrọ onye otiewgu ụka bịa gụọ egwu adịghị mma, mana ndị na-akpọ ha kwesịrị ị kwado ha nke ọma.

Ọ sị na onye otiegwu bịawa ịgụ egwu, ọ ga-akpọrọ ndị egwu ya na ihe ndị o ji eti egwu nke bụ na ha ga-eji ụgbọala na ihe ndị ọzọ, n'ihi nke a, o kwesịrị ka onye kpọrọ oku mara na ya kwesiri ikwado ihe ndị ahụ.

"E nwere ndị Chineke nyere onyinye ịgụ egwu, onyinye ahụ o nyere ha bụ maka iji ya nyere onwe ha aka".

"Onye ahụ kwesịrị inweta nkwado ma ọ bịa gụọ egwu mana ọ bụghị na onye ahụ ga-etinye ego n'ihu".

"Ndị na-akpọ anyị bịa gụọ egwu kwesikwara ịmụta ka e si akwado ndị na-agu egwu. Ọbụghi ịdabere n'onyinye ha si n'aka Chukwu kwuo na agaghị akwado ha".

Otiegwu Prudence nke e ji egwu "Agunechemba" wee mara ọfuma gara n'ihu kwuo na ihe niile o matara gbasara egwu bụ n'ihe nna ya na nne ya bụ ndị egwu nke mere o ji mụta ihe gbasara egwu.

Ọ si na ezinaụlọ o si pụta bụ nke na-atụ egwu Chineke kemgbe ọ dị ntakịrị, na nke a nyere ya aka iji sonyere ụzọ chineke.

Mana ọ kọwara na ezinaụlọ ndi mmadụ ugbu a, ndị nne na nna anaghị enwe ohere ịkụziri ụmụaka ihe gbasara akwụkwọ nso.

Ọ dụrụ ndị ntoroọbịa ọdụ ka ha gbasie ike mụta aka ọrụ iji nyere onwe ha aka maka na ọbụghi ihe niile ka nne na nna ga-emere ụmụaka.