Fact Check: Onyonyo ebe Tinubu na-anya igwe, ọ bụ nke ochie ka ọ bụ nke ọhụrụ?

    • Onye dere ya, Chiagozie Nwonwu
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Ebeg o si, Lagos

Onyonyo pụtara n'ọdị nso a nke gosiri ebe Bola Ahmed Tinubu nọ n'ime ụlọ na-anya igwe butere ndọrịtaụka na soshal midia dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ya bụ onyonyo bụ nke ochie.

Mana nnyocha nke ngalaba 'BBC Disinformation' mere egosila na enweghị ihe akaebe gbara ama na ya bụ onyonyo apụtabuola n'ịntaneetị tupu ụbọchị Ọkụtoba 2, bụ ụbọchị Tinubu tinyere ya n'akara Twitter ya.

Bola Ahmed Tinubu bụ aka onye chịburu Legọs steeti ma bụrụkwa onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na pati 'All Progressives Congress' (APC).

Tinubu tinyere onyonyo ahụ iji gosi na ahụ siri ya ike, dịka akụkọ na-efegharị na ọ gara London ịga nata ọgwụgwọ maka ahụike ya.

Akụkọ a malitere ifegharị dịka a hụghị Tinubu n'emume dị icheiche gbasara ntuliaka 2023.

Mana Tinubu alọghachila na Naịjirịa n'ụbọchị Tọzde, Ọkụtoba 6 2022.

Ihe BBC chọpụtara maka onyonyo a

BBC ji akụrụngwa kọmputa a kpọrọ INVid wee nyochaa ya bụ onyonyo nke ọma, si ebe ahụ nweta foto dị icheiche gbasara ya bụ onyonyo.

Ejikwa akụrụngwa 'Google reverse Image Search' wee nyochaa foto ndị a, nke gosiri na ya bụ onyonyo apụtabeghị n'ịntaneetị mbụ tupu Ọkụtoba 2, 2022.

Ọ bụ eziokwu na e nwere ebe ụfọdụ foto ahụ bulitere ihe e dere n'oge mbụ, mana nnyocha miri emi gosiri na ihe ndị ahụ bụ ihe ndị ọzọ dị na webụsaịt ebe e kesara ya bụ onyonyo, ọ bụghị maka onyonyo ahụ n'onwe ya.

Gbasara uwe Tinubu yi n'onyonyo ahụ

Ndị ọzọ na soshal midia wepụtara foto Tinubu sere na UK n'ọnwa Jenụwarị afọ 2021, ebe o yi ụdị uwe o yi n'onyonyo ahụ ebe ọ na-anya igwe.

Mana nnyocha BBC gosiri na Tinubu gba akpụkpọ ụkwụ na-acha ọcha na foto nke ochie ahụ, ebe o yi akpụkpọ ụkwụ na-eji oji n'onyonyo ahụ ebe ọ na-anya igwe.

Nke a pụtara na akwa Tinubu yi na foto abụọ ahụ yiri onwe ha, mana ọ pụtaghị na ọ bụ otu oge ka e sere foto abụọ ahụ.

Ihe ọzọ kwa nwereike ịgba ama gbasara oge e tinyere Onyonyo ahụ bụ egwu na-akpọ na ya.

Egwu ahụ bụ egwu a kpọrọ 'Organise', nke onye otiegwu Naịjirịa ha ya bụ Asake tiputara n'ụbọchị asatọ nke Sepụtemba 2022.

Tinubu tinyekwara foto ọzọ n'ụbọchọ Ọkutoba 6, nke ụfọdụ ndị mmadụ kwuru na ọ bụ foto ochie.

Na foto ahụ, a hụrụ Tinubu ebe ọ na-agụ akwụkwọ 'newspaper' nke ndị ụlọ ntaakụkọ 'Nation'.

Ọ bụ eziokwu na akwụkwọ akụkọ nke Tinubu na-agụ na foto ahụ bụ nke e bipụtara n'ọnwa Jenụwarị 2022, mana onweghị ihe gosiri na foto ahụ n'onwe ya adịbuola n'ịntaneetị tupu ụbọchị ahụ Tinubu wepụtara ya n'akara Twitter ya.