Iji asụsụ Igbo eme ihe onyonyo ahụike azọpụtala ndụ ọtụtụ ndị nne – Dkt Ogechi Eze

Aha onyonyo, Iji asụsụ Igbo eme ihe onyonyo ahụike azọpụtala ndụ ọtụtụ ndị nne – Dkt Ogechi Eze
Iji asụsụ Igbo eme ihe onyonyo ahụike azọpụtala ndụ ọtụtụ ndị nne – Dkt Ogechi Eze
    • Onye dere ya, Makuochi Okafor na Kelechi Anozia
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Editor
    • Ebeg o si, Lagos

Dọkịnta Ogechi Eze, bụ onye a ma ama na soshal midia maka iji asụsụ Igbo akụzi ọtụtụ ihe gbasara ezi ahụike maka ụmụnwaanyị.

Onyonyo ya na-efesa ebe dị icheiche dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-eziga ha nye ndị nne ha nakwa ụmụnne ha bi n'ime obodo n'ihi na ha na-aghọta ya nke ọma karịa nkọwa ahụike ndị nke e mere na bekee.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ọdị nso a, Dkt Eze kwuru na ‘asụsụ dị mkpa maka na ọ na-enye aka ka ndị mmadụ ghọta ihe a na-akọwara ha, mụta ya nke ọma, ma nwekwaa ike icheta ha n'ọdịnihu".

Eze kwuru na ọ na-anụ ya ọkụ n’obi ịhụ na ndị Igbo mụtara asụsụ ha ma ghọta maka ahụike ha n’ụzọ doro anya karịa iji nnukwu bekee bụ nke na-agbagwoju onwe ha anya.

Ọ kọwara na ihe onyonyo ọ na-eme abụghị na ọ dịrị ya mfe, makana o nweghị igwe e ji ese onyonyo, kama nke ahụ egbochighị ya iji ekwentị ya esete ya bụ onyonyo.

Dkt Ogechi Eze

Oge kwukwara etu ọrụ ya si enyere ọtụtụ ndị mmadụ ọkachasị ndị nne ochie bi n'ime obodo ndị emepeghị emepe.

O kwuru: “Iji asụsụ Igbo eme ihe onyonyo ahụike na-azọpụta ndụ ọtụtụ ndị nne bụ ndị asụsụ bekee na-agbagwoju anya”.

N’afọ olemole gara aga, Tejinder Sandhu bụ onyeisi ụlọọrụ Unicef n’Akure, Ondo steeti, gbara ama maka uru ọrụ Dkt Eze na-arụ na-abara ụmụnwaanyị.

O kwuru: “Ime nkuzi ahụike n’asụsụ onye ga-enyere ndị kwesịrị ịnụ ozi ahụ aka ngwa ngwa n’ihi ndị mmadụ na-aka amụta ihe ngwangwa ma na-echetakwa ya ma a sụọ ya n’asụsụ ha.”

Agụmakwụkwọ bekee ka bụ ihe ọtụtụ na Naịjriịa enwebeghi ohere isonye na ya.

Nke a pụtara na iji asụsụ bekee akọwa ihe nwereike ịgbagwoju ụfọdụ anya karịa ma e jiri asụsụ olu ndị sụọrọ ha ya bụ ihe.

Kirie ihe onyonyo nọ n’elu akụkọ a n’uju ka ị nụrụ ihe Dkt Eze kwuru maka ọrụ o ji soshal midia arụ.