Ọ bụ eziokwu na idemmiri etochiela 'Third Mainland Bridge'?

Akụkọ na-efesa na soshal midia Naịjiria ugbua nke na-ekwu na idemmiri etochiela akwammiri a na-akpọ 'Third Mainland Bride'.

Nke a na-abịa dịka ọdachi idemmiri na enye nnukwu nsogbu na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa, ọkachasị na mpaghara ndị dị nso na Osimiri Naịja nakwa Osimiri Benue.

Mana nnyocha nke ngalaba BBC Disinformation mere gosiri na akụkọ ahụ abụghị eziokwu, mmiri etochighi 'third mainland bridge'.

Akụkọ a malitere ifesa n'ụbọchị October 21, 2022 site n'otu onyonyo nke otu onye tinyere na Twitter.

Onye sere onyonyo ahụ nọ n'ime ụgbọala na-agbafe n'elu akwammiri ahụ. Etu o si debe ekwentị ya wee na-ese onyonyo ahụ mere ka ọ dị ka mmiri ọ na-achọ itopụta n'ụzọ.

Williams Uchemba, onye a ma ama n'ịkpa ọchị nakwa ejije Nollywood, sekwara onyonyo ọzọ n'ime ụgbọala ya, nke mere ka ọ dịka osimiri dị n'okpuru akwammiri ahụ etojuola.

Mana ndị ntaakụkọ BBC ji ụgbọ mmiri gagharịa n'osimiri ahụ niile, wee chọpụta na ya bụ osimiri etoghi eto.

Anyị chọpụtara na mmiri agafebeghị ụkwụ akwammiri ahụ, nke bụ ebe mmiri na-erubu na mbụ.

A chọpụtakwara na ụfọdụ foto nke ndị mmadụ ji ekesa akụkọ ụgha a bụ foto e sere kamgbe afọ 2020.

Akụkọ ụgha a emeela ka ọtụtụ ndị mmadụ chịrị obi n'aka, n'ihi na ha che na idemmiri na-abịọ́ ịwakpo Legọs.

Cheta ba Kọmishọna na-ahụ maka mmiri bụ Tunji Bello zipụtara ozi ma kwuo na idemmiri nwere ike ịmetụta ụfọdụ mpaghara na steeti ahụ, na-agwa ndị mmadụ ka ha kee nkwụcha.

Gọọmentị Legọs makwara ọkwa na idemmiri nwereike imetụta ndị bi nso n'akụkụ Osimoro Ogun.

Nke a na-emekarị ma ọ bụrụ na akpọghee mmiri dị na Dam Oyan, nke dị n'Ogun steeti. Mmiri ahụ na-abanyekarị n'ime Lagoon Legọs.

Ọ bụ eziokwu na ezipụtara ozi na mmiri dị na Lagoon Legọs nwere ike ito, onweghị ihe akaebe ọbụla gosiri na mmiri ahụ etoola dịka akụkọ ụgha na-efegharị na soshal midia si ekwu.

Ebee bụ 'Third Mainland Bridge

Akwammiri 'Third Mainland' bụ akwammiri nke abụọ kacha too ogologo n'Afrịka niile. A malitere ịrụ ya n'afọ 1980, ma rụchaa ya na 1990.

Ogologo ya dị kilomita iri na abụọ; ọ bụ akwammiri a jikọrọ mpaghara elu ala Legọs a na-akpọ 'Lagos Mainland', na mpaghara nke dị n'elu mmiri a na-akpọ 'Lagos Island'.

Ọ bụrụ na mmiri tochie akwammiri a n'eziokwu, ọ ga-emetụta njem nakwa akụnụba Legọs steeti n'ụzọ dị ukwuu.