Iwu anọ gọọmenti tinyere iji beleta mmejọ ule WAEC na NECO

Iwu anọ gọọmenti tinyere iji beleta mmejọ ule WAEC na NECO
    • Onye dere ya, Marvelous Obomanu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist

Gọọmenti ewepụtala ụzọ ihe anọ ha ga-eme site ugbua gawa n'ihu iji gbochie ụzọ dị iche iche ụmụakwụkwọ ji emejọ n'ụle WAEC nakwa ule NECO.

Nke mbu, a ga-egbochi nwaakwụkwọ ọbụla nọ klass SS3 ị banye ụlọakwụkwọ ọzọ maka ile ule WAEC na NECO.

Nke abụọ, bụ na a ga-enye nwaakwụkwọ ọbụla nọ klass SS3 ga-ele ụle WAEC maọbụ NECO nọmba njirimara nke a kpọrọ 'new examination learners identification number' a ga-eji mara ụmụakwụkwọ n'oge ụle.

Nke atọ, abụrụ na a ga-aghasasị ajụjụ ule ma haziekwa ya na udị na ọ ga-esiri mmadụ abụọ ike ịnọmi onwe ha.

Nke anọ, bụ na ụlọọrụ WAEC na NECO ga-edebanye ntule nke mbu, abụọ na atọ nke ụmụakwụkwọ SS3 iji hụ na emere nhazi ngwa ngwa.

Ihe a bụ ụzọ ihe anọ gọọmenti wepụtara iji gbanwe ọnọdụ ule WAEC na NECO ma gochie mmejọ ụle. I nwere nwa ga-ele ule WAEC na NECO? Kesasia akụkọ a.