Iwu anọ gọọmenti tinyere iji beleta mmejọ ule WAEC na NECO

Aha onyonyo, Iwu anọ gọọmenti tinyere iji beleta mmejọ ule WAEC na NECO
Iwu anọ gọọmenti tinyere iji beleta mmejọ ule WAEC na NECO
Iwu anọ gọọmenti tinyere iji beleta mmejọ ule WAEC na NECO
Nkọwa foto, Iwu anọ gọọmenti tinyere iji beleta mmejọ ule WAEC na NECO
    • Onye dere ya, Marvelous Obomanu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist

Gọọmenti ewepụtala ụzọ ihe anọ ha ga-eme site ugbua gawa n'ihu iji gbochie ụzọ dị iche iche ụmụakwụkwọ ji emejọ n'ụle WAEC nakwa ule NECO.

Nke mbu, a ga-egbochi nwaakwụkwọ ọbụla nọ klass SS3 ị banye ụlọakwụkwọ ọzọ maka ile ule WAEC na NECO.

Nke abụọ, bụ na a ga-enye nwaakwụkwọ ọbụla nọ klass SS3 ga-ele ụle WAEC maọbụ NECO nọmba njirimara nke a kpọrọ 'new examination learners identification number' a ga-eji mara ụmụakwụkwọ n'oge ụle.

Nke atọ, abụrụ na a ga-aghasasị ajụjụ ule ma haziekwa ya na udị na ọ ga-esiri mmadụ abụọ ike ịnọmi onwe ha.

Nke anọ, bụ na ụlọọrụ WAEC na NECO ga-edebanye ntule nke mbu, abụọ na atọ nke ụmụakwụkwọ SS3 iji hụ na emere nhazi ngwa ngwa.

Ihe a bụ ụzọ ihe anọ gọọmenti wepụtara iji gbanwe ọnọdụ ule WAEC na NECO ma gochie mmejọ ụle. I nwere nwa ga-ele ule WAEC na NECO? Kesasia akụkọ a.