You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Achọrọ m ka gọọmenti nye nwa m ikpe nkwụmọọtọ' - Nna nwata e ji mma gbukasịa ahụ n'Abịa steeti
Nna Felicia bụ Chijioke Anaba kwuru na nwa ya nwaanyị tụbọrọ n'ihi nnukwu ọbara gbara ya tupu ndị mmadụ achọta ya n'ime ọhịa.
O kwuru na o nwekwara ike ịbụ na Ubani chọrọ igbu Felicia ma chara ụfọdụ akụkụ ahụ ya.
Mazị Anaba boro ndị uweojii nọ n'Eastern Ngwa Division ebubo na ha manyere ya ịkwụ puku naira iri atọ iji debanye mkpesa o mere n'akwụkwọ ha, bụ nke o mechara kwụọ ha.
Anaba gosiri ụjọ na ndị uweojii nwereike ịtọhapụ Ubani, onye bụkwa nwaafọ obodo ya, nke ga-emezi ka o menye ezinụlọ ya egwu.
Ọ gara n'ihu gbakwunye na ya ekwetaghị ihe ndị uweojii kwuru, nke bụ na Ubani na-arịa ọrịa isi mgbaka ma kwusie ike na nwaamadị ahụ a na-enyo enyo ga-abụ ihe iyi egwu nye ndị obodo ahụ ma ọ bụrụ na enweghị ihe e mere ya.
Nwoke ahụ iwe juru obi kpọkuru ndị ọchịchị, ọkachasị nwunye aka na-achị Abịa teeti bụ Priscilla Otti ka ọ gbatara ya ọsọ enyemaka ma kwuo na nwa ya bụ Felicia nwereike inwe nkwarụ n'ihi mmerụahụ o nwetara site na mma ahụ e gburu ya.
E nwebeghị ihe ndị nọ n'ọchịchị kwurula n'okwu a mana Ubani ka nọ n'aka ndị uweojii n'Umuobiakwa dị n'okpuru ọchịchị Obingwa.
Ihe ndị uweojii Abịa steeti kwuru gbasara okwu a
Ndị uweojii Abịa steeti kwuru na ha natara mkpesa nna nwata nwaanyị ahụ e merụrụ ahụ bụ Chijioke John Anaba n'ụlọọrụ ndị uweojii Eastern Ngwa Divisional Headquarters n'ụbọchị 15 Mee 2025.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abịa steeti bụ Maureen Chinaka Desmond kwupụtara nke a n'otu ozi o mere ka o rute BBC News Igbo aka.
Ọ kọwara na Maazị Anaba boro ebubo na otu nwoke dị afọ iri atọ na atọ aha ya bụ Chinazum Nwaubani jiiri mma wakpoo otu ejima ya oge ha gara ịkụ ọka n'ubi.
"Nwoke ahụ dọọrọ ejima m nke nwaanyị n'ike, nye ya iwu ka o yituo uwe ya ma tọgbọrọ n'ala. Oge ọ jụrụ, nwoke ahụ jiiri mma merụọ ya ahụ n'isi, n'azụ nakwa n'ụkwụ ya," ka ozi ahụ kwuru.
Ndị uweojii kwuru na ha zọpụrụ njem ozugbo gaa nwụchie nwoke ahụ a na-enyo enyo dabere na mkpesa Maazị Anaba nyere.
Ha gakwara n'ihu kọwaa, na a kpọgara nwata ahụ ụlọọgwụ maka ezi nlekọta dịka ha malitere ilebara okwu ahụ anya site n'ime nnyocha miri emi.
Otu nwoke awakpola nwata nwaanyị dị afọ 14, were mma gbukasịa ya ahụ n'Abịa steeti
Akụkọ kọrọ na nwata nwaanyị ahụ dị afọ iri na anọ aha ya bụ Felicia Anaba sooro ejima ya gaa n'ubi ịkụ ọka tupu nwoke ahụ a kpọrọ Chinazum Ubani awakpo ya ma jiri mma gbukasịa ya ahụ.
Ebelebe a gburu n'obodo Obete Nchina dị n'okpuru ọchịchị Obingwa n'Abịa steeti.
Ihe mere nwoke ahụ ji wakpo ya bụ nwata nwaanyị bụ nke edobeghị anya mana e boro ebubo na eleghị anya Ubani chọrọ idina Felicia n'ike maọbụkwanụ na ebumnobi ya bụ igbu ya egbu.
E kwuru na Felicia lụsoro Ubani ezigbo ọgụ, nke meziri o ji were mma gbuo ya n'isi, n'ụkwụ, n'azụ nakwa n'aka ma rie mbọmbọ mgbe ọ nụrụ na ndị mmadụ na-abịa ịza oku enyemaka nwata ahụ na-akpọ.
Ha kwukwara na ọ bụzi ejima ya gbapụrụ ọsọ mgbe ahụ Ubani wakporo ha, bịa tikuo ọhaneze, ndị mmadụ awabazie n'ọhịa ma napụta Felicia ebe Ubani riri mbọmbọ.
Ejima Felicia bụ Felix gwara onye ntaakụkọ BBC News Igbo na ya hụrụ ka mmadụ jichiri nwanne ya nwaanyị n'azụ, ha abụọ amalite ịlụ ọgụ.
Ọ kọrọ na nwoke ahụ weere mma o ji n'aka gbuo ejima ya n'ikiri ụkwụ mgbe ọ nwara ịgba ọsọ, ma malite gbuwezie ya mma ahụ n'ebe ndị ọzọ.
O kwuru na ya gbapụrụ ọsọ na-eti mkpu enyemaka, nke meziri Ubani ji ghara nwanne ya gbafuo.