Etu ntụlịaka Chanselọ mba Jamịnị nke afọ 2025 si gaa

Nwa amadị bụ Friedrich Merz onyendu otu 'conservative' eturula ugo dịka o meriri na ntụliaka ọkwa Chanselọ nke mba Jamini mere n'ụbọchị Sọnde 23 Febụwarị 2025.
Merz wetara votu 28.6 pacenti na ntụliaka ahụ, nke pụtara na votu ya erughị 30 pacetị nke otu pati ya bụ Christian Democrats (CDU) tụrụ anya inweta na ntụliaka ahụ.
Mgbe Merz na-ekele ndị mmadụ tụrụ ya votu, ọ gwara ndị otu pati conservative ka ha malite inwe anụrị n'ihi na ọrụ ga-amalite n'ụtụtụ taa bụ Monde 24 Febụwarị 2025.
O kwukwara na ọrụ chere ya n'ihu doro ya anya nke ọma.
N'ozi mbu o wepụtara, Merz kwuru na ọ chọrọ ka mba ndị dị na mpaghara Yurop gba mbọ ịkwụsi ike n'aka o nwee ha ị ji "nweta ezigbo nwere onwe n'aka mba Amerịka.
Onye gbara onye nke abụọ na ntụliaka ahụ bụ Alice Weidel ji otu pati 'Alternative for Germany (AfD) were zọọ ọkwa Chanselọ.
Weidel jiri 20.8 paceti were nweta ọnọdụ onye nke abụọ na ntụliaka ahụ ebe ndị otu pati ya na-atụ anya na ọ ga-enweta ihe karịrị nke a.
Weidel kwuru na ntụliaka e mere gosiri na ụmụamaala Jamini chọrọ mgbanwe ọchịchị.
O kwuru na ọ bụrụ na Friedrich Merz gbaa mbọ ime ka pati ha abụọ nwee njikọ ọchịchị, na ọ gaghị enwe isi dịka Weidel kwuru na a ga-enwe ntụliaka ọhụrụ maka na ndị Jamini agaghị eche ka afọ anọ ọzọ bịa.
A na-atụ anya na Merz na otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị ọzọ ga-ejikọ aka ọnụ

Ebe foto si, Getty Images
A na-atụ anya na Merz na dị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọzọ ga-enwe njikọ ọchịchị mana ọnụ na-ekwuru otu pati CDU bụ Jurgen Hardt gwara BBC na imekọ ọnụ otu pati ha na pati ọzọ nwere ike ịbụ "ihe siri ike" n'ihi na ha na AfD a gaghị arụkọ ọrụ, ebe pati Free Democratic Party (FDP) nwere ike ịpụ na nzuko omeiwu kpamkpam.
O kwuru na mmekọrịta Social Democrats, Greens na CDU nwere ike isi ike n'ọtụtụ ihe dị icheiche n'abụghị ihe banyere mba ọzọ na nchekwa.
N'aka nke ọzọ, onye osote onyeisi ndị omeiwu AfD bụ Beatrix Von Storch kwuru na gọọmentị ọhụrụ nke ndị CDU agaghị enwe ike imezu ihe ndị mmadụ tụrụ ha votu chọrọ.
Alice Weidel kwuru na ọ bụrụ na Friedrich Merz gbaa mbọ ime ka pati ha abụọ nwee njikọ ọchịchị, na ọ gaghị enwe isi dịka Weidel kwuru na a ga-enwe ntụliaka ọhụrụ maka na ndị Jamini agaghị eche ka afọ anọ ọzọ bịa.
Lee ndị zọrọ ọkwa chanselọ na otu ndọrọ ọchịchị ha

Ebe foto si, EPA
Friedrich Merz zọrọ ọkwa chanselọ mba Jamini na otu pati akpọrọ Christian Democrats merie (CDU).
Onye ọzọ bụ Alice Weidel nke pati 'Alternative for Germany (AfD).
Olaf Scholz bụ chanselọ mba Jamini ugbu a, sokwa zọọ ọkwa chanselọ n'otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị akpọrọ Social Democratic Party (SDP), mana e meriri ya n'ịsọ mpi ahụ dịka o nwetere 16 pacetị votu.
Robert Habeck bụ osote Olaf Scholz nọ n'ọkwa chanselọ ugbu a, zọrọ ọkwa chanselọ n'otu pati Greens.
Ihe ụfọdị ndị ọchịchị mba ụwa kwuru banyere mpụtara ntụliaka mba Jamini

Ebe foto si, Reuters
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Dutch bụkwa odeakwụkwọ ukwu Nato bụ Mark Rutte, kwuru n'akara X, na ya na-atụ anya iso Friedrich Merz arụkọ ọrụ.
O kwuru na ọ dị oke mkpa na Yurop kwalitere mmefu ego na-ọrụ nchekwa nke ọchịchị Merz ga-abụ isi na ya.
Onyeisiala mba Denmark bụ Mette Frederiksen kwuru na ya chọrọ ka enwe Yurop na Germany siri ike dịka ugbu a bụ oge ejighị n'aka.
Praịm Mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu dere n'akara X, na ya na-atụ anya ya na gọọmentị na-abịa na mba Jamini ịrụkọ ọrụ ọnụ iji mee ka mmekọrịta dị n'etiti mba abụọ ahụ dịkwuo ike.
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwuru na Truth soshịa, na ọ dịka otu conservative emeriela na mba Jamini. O kwuru na ọ bụ nnukwu ụbọchị na Jamini ma kwukwa na ya chere na "ike agwụgo ndị Jamini inwe maka ọchịchị amaghị aka nri na aka ịkpa.
Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky kwuru na ya na-atụ anya na mba Yukren na mba Jamini ga na-arụkọrịta ọrụ otu ha si arụbu mgbe garaga iji weta nchekwa ndụ ndị mmadụ na udo ziri ezi na Yukren.









