You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Onye bụ Simon Ekpa?
A malitere ịnụ aha Simon Ekpa n'ọnwa Julai afọ 2021 dịka otu Ipob họpụtara ya ka ọ bụrụ onyeisi mgbasaozi n'igwe mgbasaozi ha bụ 'Radio Biafra,' ka Gọọmentị Naijiria nwụchiri Nnamdi Kanu bụbu onyeisi mgbasaozi nke ụlọmgbasaozi ahụ.
Mana ka izuụka ole na ole a họpụtara ya gachara, otu Ipob chụdara ya n'ọkwa ahụ dịka ha kwuru na ọ naghị agbaso iwu mgbasaozi nke ụlọọrụ ahụ.
Mana nwamadi ahụ na-akpọ onwe ya, "nwa azụ" onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu gara n'ihu were akara ya na soshal midia na-agbasa ozi banyere nnwereonwe Biafra.
O jikwa akara ya arịọ ego ọ sị na ọ bụ maka nkwado otu Eastern Security Network (ESN) nke bụ ngalaba ndịagha nke otu Ipob ma na-agbasakwa akụkọ ụgha, dịka ụfọdụ ụlọ ntaakụkọ nyochara ha si kwuo.
Onye Ohaukwu dị n'Ebonyi steeti, a mụrụ ya n'afọ 1985.
Ekpa bi mba Finland na-akpọ onwe ya Ọkaiwu nakwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị.
O kwuru na ya gụrụ maka iwu na mahadum 'Aberystwyth University', dị na Wales, mba Briten.
Ekpa, bụ onye jirila asọmpi athletics ritere Naịjirịa ọla nchara alụọla nwaanyị ma mụokwa nwa.