Ihe mere owuite ji anyụ ụfọdụ ndị gbabuuru Naịjiria bọọlụ anya
Ụfọdụ ndị ọgbabọọlụ gbabuuru Naịjiria bọọlụ mechara 'daa ogbenye', mere ka ụfọdụ ndị na-ajụ ihe ha ji akụnaụba ha kpatara mee.
BBC Igbo zutere mmadụ abụọ gbabuuru Naịjiria bọọlụ, ha kọwara ihe ndị egwu bọọlụ na ego ha kpatara na-aga.
Ha kọwaara BBC etu ha na ije si gaa mgbe ha na-agba bọọlụ na etu ọnọdụ dị ha ugbua.

Olisa Michael Onuchukwu, otu onye ji agbambọọlụ mere aka ọrụ ma kpaa ego tupu o mechaa wụsa akpụkpọụkwụ ya, gwara BBC Igbo na ihe na-emekarị ndị ọgbabọọlụ mechara banye n'ihe isi ike bụ ahazighi onwe ọfụma.
Onuchukwu gbaara FC Wuhan dị na mba China bọọlụ ebe afọ 1996.
O kwuru na mgbe ọ gbara bọọlụ, na a na-akwụru ụfọdụ ndị puku dọla iri isii ($60,000) kwa ọnwa, mana ugbua "a na-ebunye ego nyafun nyafun".
Onuchukwu bụ onye nchịkọta otu egwu bọọlụ Nnewi United, kọwara ihe ndị na-emefu ego onye ọgbabọọlụ.

Kingsley Obiekwu gbabuuru Naịjiria bọọlụ dịka onye egwu azụ site n'afọ 1996 tupu ọ wụsa ọwa n'ịgba bọọlụ n'afọ 2004.
Obiekwu so n'otu Naịjiria buliri iko nke Olympics nke afọ 1996, mgbe Naịjiria ritere ọlaedo n'asọmpi bọọlụ.
Obiekwu bụkwa onye nkuzi bọọlụ ugbua, gwara BBC etu o si gbachaa bọọlụ na mba Holland ebe ọ nọrọ afọ atọ, na etu ego ọ kpatara si laa n'ajọ azụmhịa o mere.
O kwukwara etu o si nyawa ọkwọụgbọala e ji eme njem.
Ihe na-ebute 'ịda ogbenye' ma a wụsa ọwa n'ịgba bọọlụ
Obiekwu na Onuchukwu kwuru na ọ bụ ihe ndị a na-ebute ndị gbaburu bọọlụ 'ịda ogbenye':
- Ụdịrị ndụ ha biri
- Etinyeghi ego n'ihe nwete iji ego achụ ego
- Enweghi ezi onye ndụmọdụ ga-atụziri ha aka
- Ụfọdụ lụrụ nwaanyị ọjọọ ndị anya erughi ala
Gee ihe ha kwuru n'uju:



