Emmanuel Okala: E tu m siri si n'ịgba bọọlụ ogbe gbawara Rangers nakwa mba ụwa bọọlụ
"Obim ka dịkwa n'otu bọọlụ Rangers nakwa Super Eagles agbanyeghị na anaghị emeta ha ọfụma"
Nke a bụ okwu si n'ọnụ Emmanuel Okala onye bụ ochee bọọlụ ya na ndị otu ya mabutere iko "Nation's cup" mbụ Naịjiria ritere n'afọ 1980.

O kwuru na agbanyeghị na ndị na-agba bọọlụ ugbua na-efegazi mba ofesi, o chere na gọọmenti Naịjirịa meta ha mma site n'ịkwụ ha ezigbo ụgwọ ma jiri ndị ọgba bọọlụ ugbua kpọrọ ihe, ha ga-alaghachite ma jiri obi ha niile gbaara Naịjirịa bọọlụ.
Ndị mere akụkọ a bụ Chukwudi Okereke na Vining Ogu.