Etu ndị omekome si bepụ otu nwoke aka ya abụọ

Ndị omekome na-akpa ike n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị omekome na-akpa ike n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche.

Akụkọ apụtala etu ndị okeome si wakpoo otu nwoke bụ onye ọrụ ugbo ma bepụ ya aka. Nwoke a gwara BBC na o werela okwu ihe mere ya nyefe Chineke ka ọ bọrọ ya ọbọ. Ihe egwu a mere n'obodo Walu dị n'okpuruọchịchị Kauran Namoda nke Zamafra steeti n'otu izu ụka gara aga. Nwoke a kọwara na ndị omekome bu egbe wụbatara n'ogige be ha ma bịa izu ọkụkọ ha. O kwuru: "Ha zuru ọkụkọ anyị ma chọọ ịgbapụ tupu anyị anụ ụda mkpọtụ ha." "Ha jidere nwanne m nwoke ma tie ya ihe" "A kpokuru m ndị agbataobi anyị ka anyị chuso ndị ohi ahụ ma tupu anyị apụta, ha agbateela aka"

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

O kwuru na ka ha na-alọta n'ebe ha gara chụọ ndị ohi ahụ ọsọ ha zutere otu ndị omekome nke bandits.

Ndị ahụ jụrụ ha 'Ebe ka unu si?" ha kọwara etu ndị ohi siri wụba be ha ma zuru ọkụkọ ha. Ọ gara n'ihu kwuo "Ka anyị ka na-asa ha ajụjụ ha, a nụrụ ka onyeisi kwuru 'aka' " "Tupu m atabie anya, a hụrụ m aka abụọ n'ala". Nwoke a nọzị n'ụlọọgwụ ugbua gwara BBC na ọ na-anata ọgwụgwọ dịka o kwuru na o nweela ike iri nri ugbua. Zamafra steeti so n'akụkụ Naịjirịa ebe enweghị ezi nchekwa na-anyụ ịkpakwụ. Otu ndị omekome a na-akpọ 'bandits' na-atọ ndị mmadụ, ezu ohi, awakpoo ụmụnwaanyị nakwa ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa.

Ugboro ugboro, gọọmentị Naịjịrịa ekwuola na ha na-agba mbọ idaju ihe egwu na-eme ebe ahụ mana akụkọ mwakpo na ntọrọ ndị mmadụ ka si ebe ahụ apụta.