Cost of living crisis: Etu m ji wee chọpụta ka e si eme 'millet bread' na-adịghị oke ọnụ

Aha onyonyo, Cost of living crisis: Etu m ji wee chọpụta ka e si eji millet eme achịcha Bekee
Cost of living crisis: Etu m ji wee chọpụta ka e si eme 'millet bread' na-adịghị oke ọnụ

Kemgbe agha Yukren na Rọshịa bidoro na Febụwarị 2022, ọnụ ego ntụ ndị osiite ji emepụta achịcha dị icheiche alaala elu nke ukwuu mere ka ọnụ ego achịcha na-adị ọnụ.

Nke mere na Naịjirịa bụ na ebuliela ego achịcha site na N200 ruo N600, na-aga ebe N1000 n'ime otu afọ.

Juliet Aigbe, osiite na-emepụta achịcha dị icheiche chopụtara etu e si eji ntụ millet emepụta achịcha ndị a.

Etu m ji wee chọpụta ka e si eme millet bread na-adịghị oke ọnụ
Nkọwa foto, Etu m ji wee chọpụta ka e si eme millet bread na-adịghị oke ọnụ

Nwaada a sị na ebumnuche ya bụ ibelata ọnụ ego o ji azụ ntụ wiiti e ji emepụta achịcha.

Mana ọ kwụsịghị ebe a, ọ kpọkọtara ọgbakọ ndị osiite, ma gosikwa ha ka o si eji ntụ millet emepụta ya bụ achịcha ndị a n'ụzọ iribama.

Ọ na-ekwu na ọ bụghị na a ga-akwụsị iji ntụ ya bụ ntụ wiiti eme ya bụ achịcha kpamkpam, mana ọ bụ iji belata ego nrụpụta ya.

Ọ sị na iji ntụ millet a mepụta bụreedị nwekwara uru ọ barala ahụike maka ihe millet na-enye anụ ahụ mmadụ.

Ọ na-asị na e bido nrụpụta achịcha ntụ millet n'igwe, ọ ga-enye aka ibelata ọnụ ego ya ebe ụwa niile na-achọ ka e si ebelata ego ya.