Lee atụmatụ udo ndị ọchịchị Afrika kwupụtara dịka ha nọ njem na Ukraine, Russia
Ndị isiala asaa na mpaghara Afrịka, tinyere ndị nnọchite anya ha, ewepụtala atụmatụ dị icheiche bụ nke ha kwuru ga-enye aka weta udo n'etiti Russia na Ukraine, bụ ndị nọ n'agha kamgbe ihe ruru afọ abụọ ugbua.
Onyeisiala Cyril Ramaphosa nke Saụt Afrịka, bụ onyeisi du ndị isiala asaa a gaa njem udo na Ukraine n'ụbọchị Tọzde, kwupụtara nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu.
Ramaphosa kwuru na ọ dị mkpa ka mba abụọ a kwụsịtụgodu ibuso onwe ha agha nwa mgbe nta, iji nye ohere ka a kpaa etu agha a ga-esi kwụsị kpọmkwem.
Ọ gara n'ihu gụpụta atụmatụ asaa o kwuru nwereike inye aka:
- Mba abụọ a - Russia na Ukraine - ịkwụsịtụ akpọmasị na ime ihe nwereike ị na-abọlite ọgbaaghara
- Inye ohere maka mbupu ngwa nri 'grain' si Ukraine, na mbupu 'fertilizer' si Russia
- Ịkpọghachi ụmụaka niile a kpọpụrụ n'ụlọ ha na mba Ukraine
- Mba abụo a ịgbanwe ndị mba ha nọ na mkpọrọ
- Ikwe nkwa nchekwa ma kwuo na onweghịzi onye ga-awakpo ibe ya
- Ịkwụsị agha a n'oge eteghị aka
- Mwughachi ihe e mebiri n'oge agha
Ramaphosa kwukwara na ha ga-aga Russia n'ụbọchị Satọde ịnụ n'ọnụ onyeisiala Vladmir Putin gbasara ọgbaaghara a.
N'okwu nke ya, onyeisiala mba Zambia bụ Hakainde Hichelma kwuru na mpaghara Afrịka dị njikere ịga n'ihu isonye n'atụmatụ ọbụla ga-eweta udo.
Volodymyr Zelensky bụ onyeisiala Ukraine kelere ndị ọchịchị Afrịka maka nleta ha, ma kwuo na o nweghị ike ịkwụsị ha ịga Russia, mana n'uche ya "o kwesịrị ka mba ụwa niile gụpụ Russia ma gbakụta ha azụ".

Ebe foto si, Reuters
Ụda ogbunigwe na-ada na Kyiv dịka ndị ọchịchị Afrịka nọ njem udo na mba Ukraine

Ebe foto si, South Africa Presidency
A nụrụ ka ụda ogbunigwe na-ada na mpaghara dị icheiche n'obodo Kyiv nke mba Ukraine dịka ndị isiala mba Afrịka asaa nọ njem udo na mba ahụ n'ụbọchị Fraịde.
'Mayor' nke Kyiv bụ Vitali Klitschko kwuru na ọ bụ ogbunigwe ka ndị mba Russia tụrụ n'obodo Kyiv, mana akụrụngwa agha ha na-emebi ogbunigwe n'ikuku, a na-akpọ 'air defense system' na bekee, mebiri ogbunigwe ndị ahụ.
"Onweghị ụlọ ọbụla ogbunigwe ndị ahụ metụrụ na Kyiv," Klitschko dere.
Cyril Ramaphosa, onyeisiala mba Saụt Afrịka, bụkwa onyeisi ndị mere njem a wepụtara onyonyo n'akara Twitter ya ebe ha gara kwanyere ndị e gburu na Bucha, Ukraine ugwu.

Ebe foto si, Ụlọọrụ onyeisiala Saụt Afrịka
Akụkọ na-ekwukwa na ụfọdụ ndị ọrụ nchekwa nke onyeisiala Cyril Ramaphosa tọrọ atọ na mba Poland kamgbe Tọzde dịka ekweghị ha ka ha banye na mba ahụ bụ ebe ha chọrọ isi gawa mba Ukraine.
Ndị Poland kwuru na ụfọdụ n'ime ha enweghị akwụkwọ zuru oke ịbata mba Poland, ebe ndị ọzọ bu egbe mana ha anataghị ikike ibu ngwaọgụ bata na Poland.
Mana ọnụ na-ekwuru Ramaphosa bụ Vincent Magwenya kwuru na ọ bụ nghọtahie kpatara nke a, mana Ramaphosa ka nwere nchekwa zuru oke.
O kwukwara na ha na-agba mbọ ịhụ na ndị nchekwa ya ga-esonyere ya oge ya na ndị so ya bịa njem ahụ ga-aga mba Russia n'ụbọchị Satọde.
Njem ndị ọchịchị Afrịka na mba Ukraine na Russia

Ebe foto si, South African Presidency
Ndị ọchịchị mba Afrịka dị icheiche anọrọla na mba Ukraine ugbua ebe ha ga-ezute onyeisiala mba ahụ bụ Volodymyr Zelensky, taa bụ Fraịde, Jun 16 2023, iji kpaa maka etu udo ga-esi lọghachi n'etiti ha na mba Russia.
Cyril Ramaphosa, onyeisiala mba Saut Afrịka, bụ onye ndu ndị otu a, bụ nke gụnyekwara onyeisiala mba Senegal, Macky Sall, onyeisiala mba Zambia Hakainde Hichilema, onyeisiala mba Comoros bụ Azali Assoumani bụkwa onyeisi oche otu African Union.
Ndị ọzọ gụnyere ụfọdụ ndị welitere isi na gọọmentị mba Egypt, Uganda na Congo; ha dị mmadụ asaa na-aga njem a.

Ebe foto si, Ụlọọrụ onyeisiala Saụt Afrịka
N'ụbọchị Satọde, June 17, mmadụ asaa a ga-agakwa mba Russia ebe ha na onyeisiala Vladmir Putin ga-enwekwa mkparịtaụka.
Nke a na-abịa dịka akụkọ na-ekwu na ndị agha Ukraine amalitela ibuso ndị agha Russia agha dị egwu iji weghachite mpaghara ha dị icheiche bụ nke ndị agha Russia napụburu ha.
O dobeghị anya kpọmkwem ihe ọgbakọ a ga-abụ maka ya kpọmkwem, mana Ukraine na Russia so na mba abụọ Afrịka kacha azụ 'wheat' nakwa 'fertilizer' n'aka ha.
Kamgbe agha a malitere, Ukraine anaghị enweike ibupu 'wheat' ha gaa mba dị icheiche etu ha si emebu, nke a emetụtala ọnụahịa ihe oriri dị icheiche, ọ kachasị achịcha, na mba Afrịka dị icheiche tinyere Naịjirịa.
Kedu uru Afrịka tụrụ anya irite na njem a?

Ebe foto si, Ụlọọrụ Onyeisiala Saụt Afrịka
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dịka ọgụ malitere n'etiti Ukraine na Russia, mba Afrịka dị icheiche kwụchapụrụ n'akụkụ, na-enweghị onye ọbụla ha kwadoro kpọmkwem.
Mana n'ọdị nso a, mpaghara Afrịka na-ekwusi okwu ike isonye n'okwu dị mkpa n'otu mba ụwa kama ịbụ ndị na-akwụchapụ n'akụkụ oge niile.
Jean-Yves Olivier, bụ onye gbara mbọ ịhazi ọgbakọ a kwuru na onweghị ọtụtụ ihe a na-atụ anya inweta na njem a, kama na ọ bụ ihe ọma imalite mkparịtaụka.
O kwuru na mkparịtaụka agaghị abụ kpọmkwem maka etu a ga-esi kwụsị ịlụ ọgụ, kama o nwereike ịbụ gbasara ihe ndị ọzọ, otu n'ime ha nwereike ịbụ etu mba abụọ a ga-esi gbanwee ndị mba ha nọ na mkpọrọ.
Nke ọzọ nwereike ịbụ etu Russia ga-esi nyekwuo ohere ka Ukraine na-ebupu ngwanrị 'grain', ka Ukraine nyekwa ohere ma tọhapụ 'Fertilizer ndị Russia ha ji.
Ọ bụ eziokwu na Russia na Ukraine egosila na ha enweghị mmasị ọbụla n'inwe mkparịtaụka maka udo, mba abụọ a nwere mmasị na njem a ndị ọchịchị Afrịka na-abịa na nke ha.
O teelarị Russia ji achị ịkwalite mmekọrịta ha na Afrịka, bụ nke ha na-atụ anya ime ka o siwanye oke n'ọgbakọ 'Russia-Africa Summit' bụ nke a ga-enwe na St Petersburg n'ọnwa Julaị.
Ukraine na-agbalịkwa iwulite mmekọ ha na Afrịka. N'ọdị nso a, ha zigara Mịnịsta ha na-ahụ maka mmekọrịta ha na mba ndị ọzọ ka ọ bịa njem n'Afrịka.









