Sit- at-home: Ndị na-amanye 'nọrọnụlọ' agbagbuola onye keke n'Owere

Ndị bu egbe amanye ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ egbuola otu nwoke na-akwọ keke na Akwakuma dị N'Owere, isiobodo Imo steeti taa bụ Satode.

Nke na-abịa dịka ọ gachara otu abalị ndị na-amanye ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ wakporo ahịa Amarakụ dị n'Obolo n'Okpuru Ọchịchị Isiala Mbano nakwa Irette dị n'Okpuru Ọchịchị Owerri-West,na steeti ahụ gbaa ụgbọala ọkụ ma mebie ngwahịa ruuru nde kwuru nde Naijiria.

Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ndị ọchọnganoko ahụ bu ụgbọala Siena nakwa bọọsụ a na-akpọ 'Imo bus" were bịa kposaa ihe dịka ha wụrụ mgbọ tụrụ onye keke,gbuo ya ozigbo, ma merụkwa ndị o bu ahụ.

Otu onye n'ime ha gwara onye ntaakụkọ anyị na ozu nwoke ahụ ka tọgbọ ebe ahụ, ebe e bugara ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ a kpọhghị aha ya.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Henry Okoye azaghị ozi e zigara ya n'ekwentị banyere ihe mere.

Simon Ekpa, onye ndu alaka otu Ipob kpọrọ onwe ha 'autopilot' tinyere nọrọ n'ụlọ malite n'abalị mbụ nke ọnwa Julai nke ọ sị sị oji akpọ oku ka a tọhapụ Nnamdi Kanu.

Etu ndị ojiegbe na-amanye 'sit-at-home' si buo mkpamkpa n'ahịa Amaraku, Mbano

Ikuku mwakpo ndị ojiegbe nke na-ekugharị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa kamgbe mbido izuụka a rutere n'Imo Steeti n'ụbọchị Fraịde, dịka ndị ekperima ahụ wakporo ahịa dị n'Amaraku, n'okpuru ọchịchị Isiala Mbano ma laa ọtụtụ ihe n'iyi.

Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Mọnde ka ndị ekperima a malitere ịwakpo ndị mmadụ na steeti dị icheiche n'ọwụwa anyanwụ, nke gụnyere Abia, Ebonyi, na Enugwu.

Ndị ekperima a na-amanye ndị mmadụ ka ha rube isi n'iwu mmachi mkpagharị nke ha tiri iji gosi iwe ha maka njichi e jichiri Nnamdi Kanu, bụ onyeisi otu Ipob.

Dịka ndị hụrụ ihe merenụ si kọọrọ BBC Igbo, mwakpo a malitere n'ebe uhuruchi nke ụbọchị Fraịde, dịka ụmụ okorobịa bucha egbe malitere ịchụsa ndị mmadụ n'ahịa Amaraku.

"Ka ha na-achụsa ndị mmadụ, ha na-aba mba na-ajụ anyị ihe anyị ji kachie ntị nupu isi n'iwu 'sit-at-home' ha tiri," otu onye Amaraku kọọrọ onye ntaakụkọ anyị.

"Ha kwuru na ọ bụrụ na egwu anaghị atụ anyị, ka anyị pụtakwa echi ka ha gosi anyị ihe dị egwu."

"Ndị ojiegbe a gara n'ihu mụnye ahịa anyị ọkụ, ma gbakwaa ụgbọala ụfọdụ na-agbafe n'okporoụzọ ọkụ.

"Dịka ha na-ala, ha kwụsịkwara n'obodo Obolo dịkwa n'okpuruọchịchị Isiala Mbano ma chụsakwaa ndị mmadụ, gbakwaa ụfọdụ ụgbọala ọkụ."

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Henry Okoye gwara BBC Igbo na ya bụ ihe mere eme n'eziokwu mana ndị uweojii na-agba mbọ ijide ndị ekperima ahụ.

"Anyị na-agwa ndị niile bi n'Imo Steeti ka ha ghara ịtụ egwu ọbụla, kama ka ha na-agara mkpa ha ma na-azụkwa ahịa ha maka na ndị uweojii dị njikere oge niile ichekwa ha," Okoye kwuru.

Ọ kọwara na ndị ọrụ nchekwa, ndị ọnụ na-eru n'okwu n'obodo, nakwa gọọmentị Imo steeti, na-enwe mkparịtaụka iji gbochie ihe dị otu ahụ imekwa ọzọ.

Mwakpo a bụ akaọrụ nke ndị otu kpọrọ onwe ha 'auto-pilot' bụ ndị sobu n'otu na-azọ nnwereonwe a na-akpọ 'Indigenous People of Biafra' (Ipob).

Kamgbe gọọmentị jichiri onyeisi Ipob bụ Nnamdi Kanu, n'ọnwa June afọ 2021, ndị otu Ipob tiri iwu na onweghị onye ga na-apụta ezi kwa ụbọchị Mọnde ọbụla na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ baịjirịa, ruo mgbe a ga-atọhapụ Kanu.

Mana ka ọnwa olemole gachara, ndị Ipob pụtara kwuo na ha ewepụla iwu ahụ, mana ụfọdụ n'ime ndị otu ahụ ekweghị.

Otu a pụrụ ma hibe otu nke ha a kpọrọ Auto-Pilot, nke onyeisi ha bụ Simon Ekpa, nwaokorobia bi na mba Finland, mana ọ na-eji akụrụngwa soshal midia agbasara ndị otu ya na Naịjirịa ozi.

Ọ bụ Simon Ekpa, na mbido ọnwa Julaị 2023, tiri iwu ọhụrụ a maka mmachi mkpagharị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ruo otu izuụka, iji kpọọ oku ka a tọhapụ Nnamdi Kanu.

Mana ndị gọvanọ Steeti ise dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na-ekwu na ha amachiela ọnọdụ 'sit-at-home', ma kwukwaa na ha ga-enye ntaramahụhụ siri ike maka onye ọbụla rubere isi n'iwu ahụ.

Kamgbe ahụ, ndị ekperima bucha egbe na-akpagharị n'obodo dị icheiche, ma n'obodo ndị mepere emepe, ma n'ime obodo, na-awakpo ndị mmadụ pụtara ịgara mkpa ha.

N'ụbọchị Fraịde, Julaị 8, ndị uweojii Enugwu Steeti sị na ha gburu mmadụ anọ so na ndị ekperima na-awakpo ndị mmadụ na steeti ahụ.

N'otu aka ahụ kwa, ndị uweojii nke EBonyi Steeti sị na ha jidere ụmụ okorobịa 15 so na ndị ekperima na-amanye iwu 'sit-at-home' na steeti ahụ.