E boola ndịagha mba Rọshịa ebubo igbu ndị mmadụ na Mali - Mkparịtaụka BBC na ndị akaebe

- Onye dere ya, Thomas Naadi
- Ndị mere akụkọ a, BBC Africa
- Ebeg o si, M'berra
Onye na-arụ ọrụ nlekọta ọdọ ahịa gwara BBC etu ndịagha mba Rọshịa na-ebu agha megide ndị na-eyi ọha egwu na Mali si gbuo ụmụnwoke abụọ n'ihu ya ma majaa ya, gwa ya na a ga-egbu ya.
Nke a bụ otu n'ime ihe niile ndị mmadụ na-ekwu banyere etu ndịagha Rọshịa si anụ-agha na mpaghara Afrịka nke ndị na-akwado ikike dịrị mmadụ katọrọ.
Onye agha kwaturu gọọmenti ma were ọchịchị na Mali n'afọ 2021, chụpụ ndịagha si mba Fransị maka na ha enweghị ike ịkwụsị ndị na-ebuso gọọmenti agha. Onye agha ahụ na-achị Mali kpọbatara ndịagha Wagner bụ nke si mba Rọshịa.
Ndị Wagner esila mba Mali pụọ mana ndị a na-akpọ 'Afrịca Kọps' nke gọọmenti mba Rọshịa nochiri ha.
N'ọnwa Juun, Afrịka Report wepụtara akụkọ kwuo na ha banyere soshal mịdịa Telegram ndị Wagner na ha hụrụ vidiyo ruru 322, foto 647 na-ego arụ ha na-eme, ndị mmadụ e bere isi, ndị a wepụrụ anya ha na-ịkpa oke agbụrụ.
Onye na-elekọta ụlọ ahịa anyị gwara okwu gbara ọsọ ndụ gbaaga ebe nzere ndụ dị na Mauritania. N'akụkọ a, anyị na-akpọ onye ahụ Ahmed ma gbanwee aha ndị niile bụ ndị ihe metụtara maka egwu na nchekwa ha.
Ọ gwara BBC ihe ya hụrụ mgbe ndị Wagner na-akpa ike nke mere ya ji gbabaa n'otu ụlọ ahịa dị na Nampala n'Ọgọst, 2024.
Ahmed kwuru na ebe ya na-ere ahịa, ndịagha Rọshịa jidere onyeisi ya, boo ya ebubo ịkwado ndị na-eyi ọha egwu.
Mgbe ọ na-akọwa etu ihe si mee ka o kwuru na "Ha jikwara m, tinye m n'ụgbọala ha ma kechie m aka".
"Onye agha Wagner wepụtara mma, dobe ya n'elu aka m ma jụọ m: 'Kedụ onye nwe ụlọ ahịa a? A gwara m ha na ọ nọ n'isi obodo Bamako, mana o kwuru na m sịrị asị.
Ahmed kwuru na ndịagha Wagner nwere onye na-akọwara ya okwu mana ha duru ya gaa n'ụlọ ọdọ agha ha.
"Mụ na ndị Wegner mmadụ atọ nọ otu ebe. Ha gbanyere mmiri na tankị gwa m nyipu uwe m. Ha nwere isi m tinye n'ime mmiri ruo mgbe m adịghịzị eku ume, ha etie m ihe n'obi nke mere m ji bido iku ume.
Ha tinyere m isi n'ime mmiri ugboro atọ ma jụọ, kedụ ebe ọga m nọ? mana a gwara m ya, Bamako .
Ha kpọrọ m tinye n'ụlọ mposi ebe m nọ hụta ọtụtụ ndị m maara nke gunyere Hussein. E tiri Hussein ihe ruo na m amaghịzị onye ọ bụ mgbe mbụ m hụrụ ya.
Na nkenke oge ka m hụrụ onye ọzọ bụ Umar. Ọ nọ n'ajọ ọnọdụ maka ihe e tiri ya. Anyị niile hiri ụra n'ụlọ mposi ahụ. N'ụtụtụ e wetere anyị obere achịchị na kofị.
Ahmed kwuru na ndị Rọshịa ahụ kpọghara ya n'ọdọ ha ebe ha ji ihe kechie ya ihu, ma ntị na anya.
Enweghị ihe m na-anụ, enweghị ihe m na-anụ, agaghị m ekwuli okwu mgbe ha tinyere m mma n'akpịrị. A gwara m onye na-akọwara ha asụsụ anyị na m agwala ha ihe niile m maara.
Ahmed kwuru na ọ bụ oge ahụ ka a tọhapụrụ ya ma tinye ya n'ebe a na-esi nri ebe ya nọ hụ onye si agbụrụ Tuareg bụ onye gwara ya na e jidere ya maka ịkpa ehi.

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Ndị agbụrụ Tuareg na-achị ehi nakwa ndị arakụba so na ndị a na-enyo enyo n'ime ọzara mpaghara ugwu mba Mali kemgbe ọtụtụ ndị agbụrụ ha bidoro ịnụ agha nkewapụ.
Mana agha nkewapụ ndị Tuareg ahụ mechara bụrụ agha okpukperechi ndị ji otu na-eyi ọha egwu bụ al-Qaeda na-akwado a na-akpọ Jama'at Nusrat al-Islam wal-Muslimin (JNIM).
Ahmed kwuru na e gburu mmadụ abụọ n'ihu ya ma bepụ ha isi. Ahmed bidoro ibe akwa ka ọ na-ekwu ihe mere.
"Ha butere ozu otu onye n'ebe ọ nọ ma gwa ya na ọ bụrụ na okwughi ebe onye ọ na-elekọtara ụlọahịa nọ na a ga-eme ya ihe e mere onye ahụ".
Ahmed kwuru na ihe zọrọ ndụ ya bụ mgbe Onyeisi ndị Wagner zara ekwenti onye agha mba Mali kwere ya nkwa na onye ya na-elekọtara ụlọ ahịa esoghị ebuso gọọmenti agha maọbụ ndị na-eyi ọha egwu.
Ọ sị oge ahụ ka a tọhapụrụ ya, na Umar nakwa onye ọzọ nwere ụlọ ahịa.
"A nọrọ m abalị iri na ise ebe ahụ. E mechere m duru ụmụaka m gbalaga Mauritania".
BBC agaala ka ndị Rọshịa kwuo ihe ha ma maka ebubo a nakwa mịnịstrị na-ahụ maka nchekwa na mba Mali ma na ha enwebeghị ihe ha kwuru.
Otu a na-akpọ Sentry nke onye ejije George Clooney na onye bụbu onye ọrụ gọọmenti mba Ameịka bụ John Prendergast guzoro kwuru na ndị Wegner anaghị ada naanị iwu mana ha tinyere ọgbaaghara na nkewa n'etiti ndị isi agha mba Mali.
Ha kwuru na ndịagha Mali sị na ndị Wagner dị njọ karịa ndịagha mba Fransị. "Anyị sị n'obere ahụhụ banye na nnukwu nsogbu".
Mana mgbe ndị Wagner si Mali apụ ka ha kwuru na ha "emezuola ihe ha bịara ime" n'agbenyeghị na ọnọdụ nchekwa na mba ahụ akawanyela njọ karịa etu ọ dị.
Ndị mara ihe gbasara nchekwa kwuru na ndị Wagner banyere n'Africa Corps bụ ndị nke nochiri ha na Mali.
Timbuktu Institute dị na Senegal kwuru na pasentị ndị Wagner banyere Africa Corps dị n'etiti pasentị iri asaa na pasentị iri asatọ.
Mana ndị na-eme nnyyocha maka ọgbaaghara bụ Acled kwuru na ihe ndị Africa Corps na-eme erughị ka nke ndị Wagner.
"Ọnọdụ dịka igbu ndị nkịtị nakwa ịkpa arụ dị iche iche gbadara" dịka onye ọrụ Acled bụ Héni Nsaibia gwara BBC.
Ọgbaaghara ahụ mere ka mmadụ ruru puku iri ise gbapụ ma gbaaga n'ebe nzere ndu bụ M'berra dị na Mauritania dịka ngalaba UN na-ahụ maka ndị na-agba ọsọ ndụ si kwuo.
Ndị gunyere Bintu gwara BBC na ya kpọrọ ụmụaka ya gbalaga mgbe ya hụrụ ozu ndị e jiri egbe gbakasịa ahụ n'osimiri.
"Onye ga-eleta m na ụmụaka m? nke a ka o kwuru dịka ọ bidoro ibe akwa.
"M nụ aha Wagner, obi na-agbawa m. Ụjọ na-aba m afọ. Akpọrọ m ha asị. Ha wetere m ajọ ihe".

Ebe foto si, Reuters
Youssouf kọwara etu ndị Wagner si tie ya ihe ruo mgbe o kubiri ma hara imazị ebe ya nọ.
Ọ sị na mgbe ya tetere ka ya hụrụ ebe e kechiri aka ya na onye na-adịghịzị emegharị ahụ bụ otu enyi ya nwoke.
Ha butere otu akụrụngwa tinye m n'ime nke mere m jiri kwụrụ ọtọ mana mgbe ha tinyere ya n'imi enyi m nwoke, o kweghị emegharị ahụ ka ha mara na ọ nwụọla.
Youssouf kwuru na ya amaghị ihe mere ozu enyi ya nwoke mana a tọhapụrụ ya na-enweghị nkọwa ọbụla e nyere ya maọbụ ebubo e boro ya.

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Ahmed na-elekọta ụlọ ahịa tupu ọ dabanye n'aka ndị Wagner kwuru na ya hụrụ arụ dị iche iche ha na-akpa nke gunyere iwakpo na ikpachi obodo Nampala na gburu gburu ya.
Ahmed kwuru na ya so na ndị a manyere, kpọkọta ọnụ n'ama egwuregwu bọọlụ mgbe ndị Wagner na-achọ ịchọpụta onye na-eji ekwentị Satalịt.
Ahmed bụ onye kwuru ajọ ihe niile ọ hụrụ ndị Wagner mere kpọrọ oku ka a kpụpụ ha ụlọikpe maka arụ ha kpara.



