You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe Peter Obi na Atiku Abubakar kwuru maka mpụtara ntuliaka okpuru ọchịchị Rivas steeti
Ọtụtụ mmadụ ekwuola okwu gbasara nhazi na mpụtara ntụliaka okpuru ọchịchị Rivas steeti.
Ụfọdụ kọwara ya dịka ntuliaka gara n'ụzọ udo ebe ụfọdụ ndị ọzọ katọrọ ya ma kwuo na ọ gbasoghị ezi usoro e si eme ihe.
Atiku Abubakar bụbu osote onyeisiala Naịjirịa kọwara ntuliaka ahụ dịka "nke dị egwu nakwa nke megidere usoro ntuliaka n'ọchịchị onye kwuo uche ya".
O kwuru sị: "Site n'ụzọ na-eme ihere ndị ọchịchị nchereoge siri gaa n'ihu hazie ntuliaka okpuru ọchịchị na Rivas steeti, o doola anya na pati APC na-achị Naịjirịa akwadoola onwe ha ime ihe niile kwere ha omume iji were ọchịchị n'ike."
Abubakar kpọkuru ụmụafọ Naịjirịa ndị bu ọdịmma ya n'obi, mbaụwa, ndị enyi na ndị ha na Naịjirịa na-emekọrịta ihe, ka ha hụ "ụzọ ọjọọ ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu na-akpụga mba ahụ".
Ọ gwakwara otu ndị na-agba gọọmenti ụkwụ na Rivas steeti ka ha ghara ịnabata mpụtara ntuliaka ahụ n'ihi na iwu Naịjirịa anabataghị ndị ọchịchị nchereoge haziri ya.
N'ọzọ yiri nke ahụ, onye bụbu gọvanọ Anambra steeti nakwa onye jiri aha Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka afọ 2023 bụ Peter Obi kọwara ntuliaka okpuru ọchịchị Rivas steeti dịka "ibugo mpụ na omekome n'ogogo dị elu".
N'ozi o bipụtara n'akara ọbaozi X ya, Peter Obi sịrị na ọnọdụ ahụ na-anọchiteanya ọdachi maka ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa, bụ ebe Onyeisi ọchịchị nchereoge a họpụtara n'ụzọ iwu na-akwadoghị jiri aka ya hazie ntuliaka.
O kwuru na nke ahụ abụghị ọchịhị onye kwuo uche ya, ka ọ bụ "imebi ntọala" ya.
Dịka Obi siri kwuo, "arụ na-amụta arụ, ebe ihe ọbụla e wuru na ntọala megidere iwe bụ ihe iyi egwu nye mba ọbụla na ndị bi n'ime ya."
APC ewerela azịza zakọrọ ọkwa Onyeisioche na ntuliaka okpuruọchịchị Rivas Steeti
Pati nọ n'ọchịchị na Naịjirịa bụ All Progressive Congress (APC) meriri n'okpuruọchịchị iri abụọ n'ime iri abụọ na atọ dị na Rivas steeti na ntuliaka ọkwa Onyeisioche e mere na Satọde 30 Ọgọst, 2025.
Pati Peoples Democratic Party (PDP) nọ n'ọchịchị na Rivas Steeti meriri naanị n'okpuruọchịchị atọ nke gụnyere Port Harcourt, Obio Akpor na Ogba/Egbema/Ndoni.
Nke a bụ mbụ na Rivas Steeti, kamgbe afọ 1999, pati APC ga-emeri ntuliaka n'okpuruọchịchị iri abụọ n'ime iri abụọ na atọ nke steeti ahụ
Onyeisi ụlọọrụ haziri ntuliaka na Rivas Steeti bụ Michael Odey kwupụtara ndị meriri na ntuliaka ahụ n'isiụlọọrụ ha dị na Port Harcourt.
Chairman RSIEC Dr. Michael Odey announce di winners of di LG election for di commission headquarters for Port Harcourt.
Mpụtara ntuliaka n'uju
Abua/Odual LGA - APC
Onyeisioche: Ofori Owolabi
Vootu: 28755
Osote Onyeisioche: Abunu Victoria
Ahoada East - APC
Onyeisioche: Solomon Achoma
Vootu: 54,509
Osote Onyeisioche: Florence Ndukwu
Ahoada West - APC
Onyeisioche: Eugene Ebele Cheta
Vootu: 84125
Osote Onyeisioche: Josephine Uba
Akuku Toru: APC
Onyeisioche: Bob Fubarab A.
Vootu: 63593
Osote Onyeisioche: Wariagbani George
Andoni- APC
Onyeisioche: Otua Loveday Promise
Vootu: 126,181
Osote Onyeisioche: Ezekiel Raphael Adebani
Asari Toru LGA- APC
Onyeisioche: George Onengiyeofori
Vootu: 56383
Osote Onyeisioche: Deborah Amos Bobmanuel
Bonny LGA - APC
Onyeisioche: Pepple Abinye Blessing
Vootu: 30543
Osote Onyeisioche: Ibimieye Alagbari
Degema LGA - APC
Onyeisioche: Michael George Williams
Vootu: 61536
Osote Onyeisioche: Harry Maureen
Eleme LGA - APC
Onyeisioche: Obarilomate Ollor
Vootu: 77452
Osote Onyeisioche: Beauty Eke
Emohua LGA - APC
Onyeisioche: Lloyd Chidi Julius
Vootu: 114308
Osote Onyeisioche: Amadi Lilian Obiageri
Etche LGA - APC
Onyeisioche: Njoku Boniface Chima
Vootu: 100649
Osote Onyeisioche: Obele Faith
Gokana LGA - APC
Onyeisioche: Deborah Confidence
Vootu: 96478
Osote Onyeisioche: Kpobari Epsibari
Ikwerre LGA - APC
Onyeisioche: Wobodo Charles
Vootu: 62746
Osote Onyeisioche: Kinika Ethel Chidi
Khana LGA - APC
Onyeisioche: Thomas Bariere
Vootu: 156027
Osote Onyeisioche: Ngbere Mpigi
Obio/Akpor LGA - PDP
Onyeisioche: Dkt. Gift Onyinye Wodo
Vootu: 328823
Osote Onyeisioche: Dkt. Mrs. Gloria Joyce Nyeche
Ogba/Egbema/Ndoni - PDP
Onyeisioche: Chukwu Shedrach Ogbodo
Vootu: 51051
Osote Onyeisioche: Dkt. Happiness Nwokocha
Ogu/Bolo LGA- APC
Onyeisioche: Vincent Nimieboka
Vootu: 36374
Osote Onyeisioche: Alabo Eunice
Okrika LGA - APC
Onyeisioche: Akuro Alfred Tobin
Vootu: 32285
Osote Onyeisioche: Obulubo Charity
Omuma LGA - APC
Onyeisioche: Obasi Uchechukwu
Vootu: 38530
Osote Onyeisioche: Achiri Faustina Joy
Opobo/Nkoro LGA - APC
Onyeisioche: James A. James
Vootu: 34822
Osote Onyeisioche: Jacks Gladys
Oyigbo LGA - APC
Onyeisioche: Okechukwu Akarao Nwogu
Vootu: 101495
Osote Onyeisioche: Okorie Ngozi Juliana
Port Harcourt - PDP
Onyeisioche: Sir Allwell Ihunda
Vootu: 235054
Osote Onyeisioche: Tom Quinn Mina Mildred
Tai LGA - APC
Onyeisioche: Okwe Mbakpone
Vootu: 70080
Osote Onyeisioche: Caroline Amawa
Ntuliaka a bụ iji họpụta ndịisioche okpuruọchịchị nakwa ndị kaụnselọ dị iche iche na steeti ahụ.
Ọtụtụ ndị mmadụ apụtaghị bịa tụọ vootu n'oge ntuliaka, o doghi anya maọbụ n'ihi ọnọdụ ọchịchị nchereoge nke Onyeisiala Tinubu tinyere na Rivas steeti n'ọnwa Maachị, 2025 butere ya.
Mịnịsta na-ahụ maka isiobodo Naịjirịa bụ Nyesom Wike kwuru na ntuliaka a ga-emepe ohere mbuli ọnọdụ gbata gbata ahụ e tinyere.
N'aka nke ọzọ Onyeisi ọrụ ọchịchị nyereoge na Rivas Steeti bụ ọchịagha Ibok-Ete Ekwe Ibas kwuru na ntuliaka ahụ gara ọfụma na e nweghi ọgbaghara ọbụla.
O kwuru na nke a gosiri na a ga-eweghachite ọchịchị onye kwuo uche ya n'okpuruọchịchị dị n'ime Rivas Steeti.
"Ntuliaka a enyela ohere iwepu ọnọdụ gbata gbata"
Minista na-ahụ maka isi obodo Naịjirịa bụ Nyesom Wike ekwuola na nhazi ntuliaka okpuru ọchịchị emegheela ụzọ maka iwezuga ọchịchị gbatagbata nke Gọọmenti Etiti tinyere na Rivas Steeti kemgbe ọnwa ole na ole gara aga.
Wike kwuru nke a mgbe ọ tụchara vootu ya na Rumepirikom dị n'okpuru ọchịchị Obio/Akpo na ntuliaka e mere n'ụbọchị Satọde 30 Ọgọst, 2025.
"A maara m n'ọnọdụ gbatagbata ga-agwụ n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Septemba, nke ahụ pụtara na Gọvanọ na ndị omeiwu steeti ga-alọghachi n'ọrụ ha, anyị ga-enwekwa ndị ọchịchị n'ọkwa okpuru ọchịchị," Wike kwuru.
Wike jara ndị haziri ntuliaka ahụ ike maka na ọ gara nke ọma na enweghị ọdachi ọbụla.
Cheta na Onyeisiala Bola Tinubu kwupụtara ọnọdụ gbatagbata na steeti ahụ maka ọgbaghara dị n'etiti Wike na onye nọchiri ya bụ Gọvanọ Simi Fubara.
Nke a mere Onyeisiala Tinubu jiri kwụsịtụ Fubara na ndị omeiwu steeti ahụ ọrụ nke ọnwa isii.
Wike tụrụ vootu na Rumepirikom dị n'okpuru ọchịchị Obio/Akpo
Minista na-ahụ maka isi obodo Naịjirịa bụ Nyesom Wike atụọla vootu na ntuliaka okpuru ọchịchị na-aga n'ihu na steeti ahụ.
Wike bụ aka chịburu steeti ahụ tụrụ vootu ya na mpaghara Rumepirikom dị n'okpuru ọchịchị Obio/Akpo bụkwa ebe ọ chịburu dịka onyeisioche ugboro abụọ.
Ọ bụ onyeisioche okpuru ọchịchị ime obodo ahụ n'afọ 1999 tupu ọ bụrụ gọvanọ steeti ahụ, bụ ebe ọ chịrị n'ọkwa ahụ site n'afọ 2015 ruo 2023.
Mgbe ọ tụchara vootu, Wike kọwara usoro ntuliaka ahụ dịka usoro udo ma kagbukwa nchegbu ndị mmadụ banyere ejighị Bimodal Voter Accreditation System (BVAS) eme ntuliaka ahụ.
Mgbe ntuliaka okpuru ọchịchị malitere na Rivas Steeti
Ndị bi n'okpuru ọchịchị iri abụọ na atọ dị na Rivas Steeti amalitela ịtụ vootu ha na ntuliaka a na-eme iji ahọpụta ndị isioche ga-ahụ maka ọchịchị ime obodo na steeti ahụ.
Ka ọ dị ugbua, ntuliaka na-aga n'ihu na mpaghara dị puku isii na narị asatọ na iri isii na isii dị na steeti ahụ.
Ntuliaka a na-abịa dịka ọ gachara ọnwa isii na abalị abụọ ụlọikpe kasị elu na Naịjirịa kagburu ntuliaka ime obodo nke Rivers State Independent Electoral Commission (RSIEC) mere n'abalị ise nke ọnwa Ọktoba, 2024, oge Siminialayi Fubara, Gọọmenti Etiti Naịjirịa kwụsịtụrụ ọrụ, bụbu aka na-achị steeti ahụ.
Akụkọ kwuru na mpụtara ntuliaka ahụ bụkwa ihe ga-amasị ndị isi ndọrọ ndọrọ ọchịchị dịka ihe ga-esi na ya pụta nwereike ikpebi ka a ga-esi hazie ntuliaka gọvanọ steeti ahụ n'afọ 2027.
Akụkọ kwuru na ntuliaka amaliteghị n'oge n'ụfọdụ mpaghara n'ihi na ụgbọala bu akụrụngwa iji atụ vootu eruteghị n'oge.
Ọzọ, ọ bụ pati iri na asaa n'ime out ndọrọ ndọrọ ọchịchị iri na itolu e nwere na Naịjirịa so na ntuliaka a nke e mere n'ụbọchị Satọde 30 Ọgọst, 2025.
Pati abụọ na-esonyeghi bụ Boot pati na African Democratic Congress (ADC).
Na ntuliaka a, otu na-ahụ maka nhazi ntuliaka na steeti ahụ bụ River State Independent Electoral Commission wepụtara aha ndị so na-azọ ọkwa onyeisioche ọchịchị ime obodo.
Nke a na-egosi na pati Peoples Democratic Party (PDP) nwere mmadụ atọ gụnyere - Gift Worlu (Obio/Akpor), Allwell Ihunda (Port Harcourt City), na Chukwu Ogbogu (Ogba/Egbema/Ndoni).
Pati All Progressive Congress (APC) nwere mmadụ iri abụọ nke ụfọdụ n'ime ha bụ ndị bụbu ndị isioche okpuru ọchịchị ime obodo bụkwa ndị si na pati PDP banye APC.