Gịnị bụ ngalaba United Nation a kpọrọ UNRWA na ihe mere e jiri kwụsị ịtụrụ ya ụtụ ego?

Onye dere ya bụ Gallagher – Global Digital

Mohamed Yehia kwadoro ya

Dịka mbaụwa kwụsịrị ịtụrụ otu United Nation ego e ji enyere ndị gbara ọsọndụ aka na Palestine, maka ebubo Izrel boro nke kwuru na ha kwadoro mwakpo Hamas wakporo na 7 Ọktoba, anyị ga-ele anya n’ihe UNRWA na-arụ nakwa etu ha si enwete ego.

Gịnị bụ UNRWA?

UNRWA pụtara ‘United Nations Relief and Works Agency for Palestine Refugees in the Near East’ ọrụ ha bụ inyere ndị agha metụtara aka site n'ịrụrụ ha ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ, ebe ọgbakọ na ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka.

Kedu mgbe e kepụtara ya?

E hiwere ya n’afọ 1949 iji nyere ndị Palestine gbaraọsọndụ aka ka e kepụtachara Izrel nakwa ka a lụchara agha n'afọ 1948. Ihe ruru mmadụ 750,000 ndị Palestine gbara ọsọndụ, ụfọdu bụ ndị e mere ka ha gbaa ọsọ na-esighi ha n’obi nke ha kpọrọ ‘Nakba’.

Ụlọọrụ a kwuru na ya tinyere aka n'ọdịmma agbụrụ anọ ndị gbara ọsọndụ

Kedụ etu ha si enweta ego?

Ego ha na-esikaarị n’aka ndị ji obiọma ha nye ha ego nakwa ego obodo dị icheiche na-enye ha.

Mba kachasị enye ha ego bụ Amerịka, ha nyere ha dọla 343.9 m n’afọ 2022, osote ha bụ Germany, ha tụtara Dollar 202.1m.

Na nchịkọta, mba abụọ a wetere ọkara ego ụlọọrụ UNRWA nwere nke bụ dọla 1.17bn.

Gịnị mere mba ofesi ndị kachasị enye ha ego jiri kwụsị?

Mba karịrị iri, nke Amerịka na Germany so na ya akwụsịtụla inye UNRWA enymaka ka Izrel bochara ebubo na ọpekatampe aka mba iri na abụọ ndị a na-akwado UNRWA na mwakpo Hamas wakporo Izrel na 7 Ọktoba , nke gburu ihe karịrị ndị Izrel 1200 ma nwụchịe 240.

Gịnị ka UN kwuru?

N’ụbọchị Satọde, onyeisi UN bụ Antonio Guterres kwuru na a chụọla ndị ọrụ ha itoolu, ọtụ n’ime ha nwụru-anwụ, ha na-agba mbọ ịchọpụta mmadụ abụọ fọrọ na ndị e boro ebubo. A na-eme nyoncha na-enweghi ntụpọ.

Mba ndị ọzọ kwụsịrị itụ ego bụ Austria, Australia, Canada, Finland, France, Germany, Italy, Japan, Netherlands, Briten. Mba dịka Ireland, Norway na Spein kwuru na ha ga-aga n'ihu na-atụrụ ụlọọrụ ahụ ego.

Gịnị bụ ọrụ UNRWA na Gaza?

UNRWA nwere ndị ọrụ mmadụ 13,000 ma bụrụ ụlọọru UN kachasị na Gaza.

Ha nwere ụlọọgwụ na ụlọọakwụkwọ nke ụlọmmụta ndị nkụzị na ụlọakwụkwọ praịmarị ruru 300 nọ n’ime ya. Ha ji aka ha arụpụta akwụkwọ ha ji akụziri ụmụaka ndị Palestine ihe.

Gịnị mere kemgbe e jiri bido agha Israel na Gaza?

Ihe rụrụ mmadu nde abụọ na puku narị atọ ndị Gaza agbaala ọsọ n’Ọwụwa Anyawụ Gaza ebe mmadụ otu nde ndị Palestine gbatara ọsọndụ n'ụlọọrụ UNRWA. Ngwọọrụ ahụ ndị Gaza na Izrel nwekọrịtara kwuru na ndị Palestine karịrị mmadụ 26,000 anwụọla n'ọgụ mmegwara ndị Izrel lusoro Gaza iji megwara ihe ha mere ha na Ọkotoba 7.

Tupu nke a mee, gwongworo 500 na-abata Gaza kwa ubọchị mana ugbua, naanị 200 ka ha na-ahụ.

Ihe onyonyo dị icheche na-egosi ndị ọdị ọsọsọ na-arịgo elu ugboala. UN kwuru na mmadụ nde abụọ bụ ndị chọrọ enyemaka n’ụdịdị nrị.

UN kwuru na ọpekatampe ndiọru ha mmadu 142 anwụọla na Gaza. Kọmishọna Philippe Lazzarini zipụru ozi gbasara ya. ‘’Ndi Palestine nọ na Gaza ekwesighị ịnata ntaramahụhụ dị etu a ’’

Ogosighị na anyị bụ ezigbo mmadụ’’ ka o kwuru.

Gịnị ka Izrel kwuru?

Ka o si kwụrụ ugbua, BBC ahụbeghi ozi ndị ọkachamara Izrel. Ozi si n'ụlọntaakụkọ Izrel na-enyocha na e ji ụgbọala UNRWA na ngwongwo ọrụ ha ndị ọzọ wakpoo Izrel na 7 Ọkotoba.

Onye ndumodu Praịm minista Benjamin Netanyahu, bụ Mark Regev, gwara BBC na Frịade na ndị UNRWA na-akwu ụgwọ ọnwa nyere aka na mwakpo a wakporo Izrel na 7 Ọktoba.

Regev kwuru maka onye Izrel ndị a nwụchiri kwuru na ọ bụ n’ụlọ otu onye ọrụ UNRWA ka a kpọchirị ya.