Afọ abụọ agaala kamgbe 'Lekki Massacre' mana a hụla ikpe ziri ezi?

    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Onye ntaakụkọ BBC News Igbo
    • Onye dere ya, Chigozie Ohaka
    • Ndị mere akụkọ a, Onye ntaakụkọ BBC News Igbo

Ụbọchị Ọktoba 20 2020 agaghị apụ apụ n'obi ndị ntoroọbịa Naịjirịa n'ihi ihe anya mmiri mere n'ụbọchị ahụ.

Ọ bụ ụbọchị ahụ ka ndị agha Naịjirịa na ndị uweojii jiri ike kwụsị ngagharịiwe ndị ntoroọbịa pụtara n'igwe mee maka mkpagbu ndị uweojii tụmadị ndị bụ ndị ọrụ SARS na-akpagbu ha.

E hibere ọtụtụ ụlọikpe nnyocha na steeti dị icheiche na Naịjirịa. Na Legọs steeti, onyeisi otu a bụ Ọkaikpe Doris Okuwobi lara ezumike nka. Ọ bụ ya jiri ọnụ ya kpọọ ya bụ ihe mere na Lekki tollgate 'massacre'.

"Ogbugbu na mmerụ ahụ ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe, na-ejighị egbe, ọtụtụ n'ime ha nọdụrụ ala, na-efe ọkọlọtọ Naịjirịa ma na-agụ abụ Naịjirịa, yitere ihe a ga-akpọ 'massacre'," ụlọikpe nnyocha ahụ kpebiri.

"Nnyocha anyị chọpụtara na ihe ndị ngagharịiwe End Sars kwuru bụ eziokwu, nke bụ na ndị agha gbara ha egbe na Lekki Toll Gate n'ụbọchị Ọktoba 20, 2020."

Mmadụ 48 ka mwakpo ahụ metụtara, gụnyere mmadụ 11 nwụrụ anwụ nakwa mmadụ anọ na-efu efu ruo ugbua na Lekki Tollgate, dịka ụlọikpe nnyocha a si wee chọpụta.

Ha kpọpụtara aha ndị niile ya bụ mwakpo metụtara, ma kwukwaa ka gọọmentị kwụọ ezinaụlọ ha ụgwọ iji tie ha aka n'obi.

Etu o si bido

Akara hashtag #EndSARS ebidolari iwu ewu na Twitter Naịjirịa kamgbe afọ 2017.

Ndị ntoroọbịa jiri akara hashtag a eme mkpesa dị icheiche maka mkpagbu ha na-agabiga n'aka ndị uweojii a ma ama dịka 'Special Anti-Robbery Squad' (Sars).

Ọ bụ ndị uweojii Legọs steeti kepụtara Sars na'fọ 1992 iji gbochie mkpamkpa ndị omekome na-akpa, mana Sars mechara dịzie na mpaghara niile na Naịjirịa.

Ọtụtụ mmadụ ebola ndị Sars ebubo mmekpa ahụ dị icheiche, ogbugbu mmadụ na nnapụ ego n'ike.

Mana nke kpalitere ngagharịiwe End Sars bụ onyonyo fesara na soshal midia nke gosiri ebe ndị Sars gbara otu nwa okorobịa egbe na mpaghara Ugheli, Delta Steeti, n'ụbọchị atọ nke Ọktoba 2020.

Nke a mere ka iwe malitere dịka 'hashtag' bụrụzie nnukwu ngagharịiwe nke gazuru Naịjirịa niile ọnụ.

Ndị otiegwu Azeez Fashola (Naira Marley); Douglas Jack Agu (Runtown); na Folarin Falana (Falz), bụ ndị wepụtara ozi n'akara Twitter ha ma kwuo na ha ga-eme ngagharịiwe.

Naira Marley mechara kwuo na ya akagbuola ngagharịiwe nke ya, mana Runtown na Falz ekweghị, otu a ka atụmatụ "Soro Soke" si malite.

"Soro Soke" bụ okwu Yoruba nke pụtara "welite olu gị", ọ bụ nke a bụ okwu njirimara nke ndị ntorobịa ji jalite onwe ha iji kwụpụta iwe ha megide ndị uweojii na-achọzi igbu ndị ha kwesịrị ị na-echekwa.

Ọ bụ eziokwu na Lekki Tollgate abụrụla njirimara ngagharịiwe End Sars, mana ọ dịkwa mkpa ka a mara na ya bụ ngagharịiwe mere na ọtụtụ steeti na Naịjirịa.

Gọọmentị emezuru ihe ise ndị ngagharịiwe End Sras chọrọ?

Ndị ngagharịiwe a, bụ ndị na-enweghị ndị isi, depụtara ihe ha tụrụ anya n'aka gọọmentị tupu ha akwụsị ngagharịiwe a.

Ihe ndị a bụ:

  • Tọhapụ ndị niile e jichiri maka ya bụ ngagharịiwe
  • Nwee ikpe nkwụmọtọ gbasara ndị niile e gburu na ya bụ ngagharịiwe, tie ndị be ha aka n'obi ka o kwesiri.
  • Hibe kọmitii ga-ahụ na e kpere ndị uweojii ọbụla megburu mmadụ ikpe ozugbo ozugbo n'ime abalị iri.
  • Ịnyocha ahụike ụbụrụ ndị SARS tupu e tinye ha na ngalaba uweojii ọzọ.
  • Ka gọọmentị welie ụgwọọnwa ndị uweojii, kwuo ha ụgwọ itiaka n'obi maka ịchekwa ndụ na akụnaụba ndị mmadụ.

Ọ bụ eziokwu na gọọmentị Naịjirịa kwuru na ha ga-emezu ihe ndị a, mana ihe a na-ahụ anaghị egosi nke a.

Solomon Eniola bụ onye ndụ otu "Take it Back Movement", nke bụ isi sekpụ ntị na ngagharịiwe Endsars n'Ogbomosho, Oyo State, gwara BBC na ekwentị na mmadụ itoolu ndị uweojii jichiri n'oge ngagharịiwe 2020 ka nọ na mkpọrọ ruo taa.

Aha ndị a bụ: Adeshina Ademuyiwa, Ikechukwu Eze, Ariyo Sodiq, Ikenna Amechi, Oyewole Olamide, Ariyo Afeez, Taoreed Abiodun, Adekunle Moruf, na Rasheed Tiamiyu.

"Ọ bụ myigharị ka ha na-eyigharị ikpe ahụ kemgbe e jidere ha. Mgbe ọzọ a ga-ekpe ya bụ ikpe bụ ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Nọvemba 2022," Eniola kwuru.

Dịka o kwuru, ọkaikpe Moshood Abbas bụ onye jibu ya bụ okwu tupu ebulie ya n'ọkwa n'ọnwa Nọvemba 2021, wee hafezie ikpe ahụ n'aka ọkaikpe ọzọ bụ Ladiran Akintola, o wee malitekwa n'isi.

N'otuaka ahụ na mkparịtaụka ya na Chude Jideonwo, Obi Ajegbo bụ ọkaiwu na onye na-alụ ọgụ maka ikike dịịrị mmadụ, kwuru na ya chọpụtara na ụfọdụ ndị a nwuchiri na ngagharịiwe End Sras n'Abuja, ka nọ na mkpọrọ kemgbe ahụ.

A bịa n'okwu nke ikpe nkwụmọtọ maka ezinụlọ ndị mmekpa ahụ uweojii metụtara, Gọọmentị steeti Legọs sị na ha emefuola ihe karịrị narị nde naịra anọ (N400m) iji tie ndị mmadụ aka n'obi.

Mana ọ dịghị otu ahụ na steeti ndị ọzọ, ọtụtụ n'ime ha ewepụtabeghị mpụtara nchọpụta kọmitii ha hiwere kemgbe ahụ.

Gịnị gbanwere?

N'anya Folarin Falana, otiegwu e ji Falz mara, nakwa nwa ọkaiwu ama ama bụ Femi Falana, "n'ezie enweela mgbanwe mana ọ bụghị mgbanwe n'agwa ndị uweojii".

"Ọ bụ mmụọ ụmụntorobia gbanwere. Ọ bụ akparamagwa ndị ntorobia gbanwere. Ndị mmadụ amụrụla anya, ha etetela n'ụra... anyị ji nwayọ erute n'ebe anyị chọrọ," ka Falz gwara Chude Jideonwo na mkparịtaụka ha.

"Mana ọ bụrụ maka akparamagwa ndị uweojii, ihe na-ebe ka na-ebe, ha agbanwebeghị chaa chaa".

N'uche Eniola Solomon, ikpe nkwụmọtọ bụ ịkpọpụta mmadụ itoolu ahụ nọ n'ụlọ mkpọrọ, ya na ịchọta ndị uweojii gburu Jimoh Isiaka n'Ogbomosho ma kwụọ ndị be ha ụgwọ iji tie ha aka n'obi.

Maka ndị uweojii, ihe gbanwere bụ naanị aha, dịka a gụgharịrị ha aha site na SARS bụrụzịa SWAT (Special Weapons and Tactics).

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti Legọs achọghị itinye ọnụ n'okwu a mgbe BBC jụrụ ya maka ihe gbanwere n'ọrụ ha.

"Achọghị m ikwu ihe ọbụla gbasara Sars. Sị na m kwuru na m agaghị ekwu ihe ọbụla gbasara EndSars," ka Hundeyin kwuru.

Onye bụbu onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu, kwere nkwa na-onweghị onye si Sars ga-abanye Swat, na ha "ga-enye ndị Swat ọzụzụ gbasara mmekọrịta ndị mmadụ na ibe ya tupu ha amalite ọrụ".

Mana otu onye ntorobịa aha ya bụ Baron El'Sama, depụtara ihe n'akara Twitter ya n'afọ 2021, mgbe ngagharịiwe End Sars gbara otu afọ, ọ sị, "ka ihe na-agbanwe bụ ka ọ na-adị ka ọnaghị agbanwe."

"Otu afọ e mere ya bụ nagagharịiwe agaala, ndị uweojii ka na-akwu n'okporoụzọ, eri ngarị, a nara ndị mmadụ ego mmachịakpa, egbukwu mmadụ etc. Ihe na-ebe ka na-ebe."