WHO enyela nkwado maka nnyocha mpox anaghị egbu oge

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Ụlọorụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organization (WHO) enyela nkwado maka ụdị nnyocha mpox a ga-amata mpụtara ya ozugbo ozugbo.

Dịka ụlọorụ ahụ siri kwuo, nke a ga-enye aka ibelata ogogo nje ahụ si efesa gburugburu ụwa.

Ụdị nnyocha ọhụrụ ahụ a maara dịka PRC ga-eme ka a chọpụta onye nwere nje ọrịa mpox site n’inyocha mmiri gbapụtara n’ọnya dị mmadụ n'ahụ.

Ka ọ dị ugbua, a na-eche ụfọdụ ụbọchị tupu ndị ọrụ ahụike na ndị ọrịa enweta mpụtara nnyocha ọrịa mpox.

WHO kwuru sị n’ime ihe karịrị mmadụ puku iri atọ (30,000) a na-enyo enyo butere ọrịa mpox n’Afrịka, ọ bụ naanị pasenti iri anọ (40%) n’ime ha butere ya bụ ọrịa.

Osote nnukwu onyeisi WHO bụ Yukiko Nakatani kọwara ụdị nnyocha ọhụrụ a dịka “iti ịgba pụrụiche”.

Umụaka bụzị ndị ọria mpox kachasi emetụta na Naịjirịa - Ụlọọrụ NCDC

Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naijiria bụ 'Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na ọ bụ ụmụaka dị otu afọ ruo afọ ise bụ ndị ọrịa mpox kachasị emetuta na Naịjirịa.

Ozi NCDC wepụtara ụbọchị Fraịde 30 Ọgọst, 2024 mere ka a mata na n’ime mmadụ 48 bu ọrịa mpox na Naịjirịa ugbua, ọ bụ ụmụaka ka ọ kachasi metụta.

Ha kwuru na achọpụtara mmadụ ise butere ọrịa mpox na steeti ise.

NCDC kwuru na steeti iri abụọ nakwa Abuja enweela opekatempe otu onye butere ọrịa mpox n’ime afọ 2024 na Naịjirịa ebe mmadụ 868 ka a na-enyo enyo na ha bu ọrịa mpox na Naịjirịa.

Mpox awụchiela na Rivers steeti

Mmadụ abụọ ebutela nje ọrịa mpox na Rivas steeti.

Kọmịshọna ahụike Rivas steeti bụ Dr Adaeze Oreh kwupụtara nke a n’isi obodo steeti ahụ bụ Pọtakọt n’ụbọchị Tuzde 20 Ọgọst 2024.

O kwuru na mịnịstrị ahụike Rivas steeti etinyela akụrụngwa niile n’ọrụ iji buo agha megide ọrịa mpox na steeti ahụ.

Dịka o siri kwuo, ndị ọrụ gbatagbata ahụike steeti ahụ ekeela ajụ n’ume izute ọnọdụ gbatagbata ọbụla.

Ọ gara n’ihu kwuo na ezipụla ndị ọrụ ahụike izute ọnọdụ gbatagbata niile n’ogogo ụlọọgwụ nta, ụlọọgwụ ọhanaeze na ụlọọgwụ ọkachamara.

Mpox abatala n’Abịa steeti

Gọọmenti Abịa steeti ekwuola na otu onye ebutela nje ọrịa mpox na steeti ahụ.

Kọmịshọna mgbasaozi Abịa steeti bụ Prince Okey Kalu kwupụtara nke a n’ụbọchị Mọnde 19 Ọgọst 2024 oge ndị ọchịchị steeti ahụ nwere nzukọ.

O kwuru na ha dị mmadụ iri na atọ (13) a na-enyo enyo butere ọrịa ahụ mana oge e mere ha nnyochaahụ a chọpụtara na ọ bụ otu onye butere ya, itoli (9) ebuteghị ya ebe a ka na-eche okwe ule mmadụ atọ ndị ọzọ.

Kalu kwuru na ọ bụ n’Okpuru ọchịchị Isiala Ngwa ka a chọpụtara onye ahụ butere mpox mana steeti ahụ agbapeela ogige gbatagbata nke gụnyere Abia State University Teaching Hospital “tinyekwara ndị ọzọ a ga-ehiwe oge na-adịghị anya”.

Ihe onye ndụmọdụ pụrụiche maka ahụike n'Abịa steeti kwuru

Onye ndụmọdụ pụrụiche maka ahụike n’Abịa steeti bụ Dr. Ngozi Azodo kwuru na e nwere mgbakọaka n’etiti mịnịstrị ahụike, ogbe obibi na ngwongwo ọhanaeze iji hụ na e busoro ọrịa ahụ agha.

Ọ gbakwunyere na e hiwela kọmitii maka ọrịa ndị na-efe efe ebe gọọmenti steeti ahụ sonyere n’atụmatụ Gọọmenti Etiti a kpọrọ “One Health”.

Dr. Azodo gwara ndị bi na steeti ahụ ka ha na-edobe onwe ha ọcha oge niile, belata etu ha na ụmụ anụmanụ si emekọrịta ma wezuga onwe ha n’ebe onye a na-enyo enyo butere nje ahụ nọ.

Enweela mmadụ 39 bu ọrịa mpox na Naịjirịa - Ụlọọrụ NCDC

Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naijiria bụ 'Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na enweela mmadụ 39 bu ọrịa mpox na Naịjirịa..

Ozi ụlọọrụ NCDC wepụtara kwuru na achọpụtara mmadụ 16 bu ọrịa ahụ na Bayelsa steeti, mmadụ 5 na Cross River steeti, mmadụ 4 na Ogun steeti, Legọs steeti nwere mmadụ 4 bu ọrịa mpox ebe Ondo na Ebonyi steeti nwere mmadụ 3 mmadụ 3.

NCDC mere ka a mata n'ozi ahụ na enwebeghị onye nwụrụ site n'ọrịa mpox na Naịjirịa ma kwe nkwa na ụlọọrụ ha na-agba mbọ n'ọrụ iji buo agha megide nfesa ọrịa mpox na Naịjirịa.

Ọrịa Mpox bụ ọrịa ọnọdụ gbatagbata n'ụwa niile - WHO

Ngalaba ahụike nke mbaụwa niile bụ WHO ekwuputala na ọrịa mpox na-efe efe abụrụla ọnọdụ gbatagbata ahụike na mbaụwa niile.

Ørịa ahụ aha ya bụbu Monkeypox egbuola ihe karịrị mmadụ 450 mgbe mbụ o bidoro ịfe na mba Kongo.

Dịka ihe si kwụrụ ugbua, o feruola ebe dị icheiche n'etiti Afrịka nakwa ọwụwa anyanwụ Afrịka dịka ọ na-echekasị ndị sayensị etu o si efesa nakwa ụdịrị ọhụrụ ya na-egbu ndị mmadụ.

Onyeisi WHO bụ Tedros Ghebreyesus kwuru na mfesa ahụ bụ ihe na-enye ndị mmadụ nsogbu.

"Atụmatụ ejikọrọ aka wepụta dị oke mkpa ịhụ na akwụsịrị ọrịa ma zọọ ndụ ndị mmadụ" ka o kwuru.

Cheta na ụlọọrụ Africa CDC na-akpọ oku ka ndị nyocha sayensị mee ngwa ma hụ na-emepụtara ọgwụmgbochi ọrịa Mpox nke ha kọwara dịka nke bụzi ọrịa ọnọdụ gbatagbata n'Afrịka.

Nke ahụ bụ mbụ a na-ekwupụta ọrịa Mpox dịka ọrịa ọnọdụ gbatagbata kemgbe e hibere ụlọọrụ Africa CDC n'afọ 2016.

Otu ahụike mbaụwa bụ World Health Organization kwuru na n’ime mba 26 Mpox gbasara na ya, mba 16 dị n’AfrỊka.

N mba DR Kongo, mmadụ 13,700 enweela ọrịa Mpox ebe ogbugoro mmadụ 450 kemgbe mbido afọ 2024,

Ndị nyocha ụlọọrụ Africa CDC kwuru na ọrịa Mpox agbasaala na mba Kenya, Yuganda, Rwanda na Burundi ma kwuo na etụ ọrịa ahụ si agbasa n’Afrịka dị ịtụnanya

Nkwuputa ụlọọrụ Africa CDC pụtara na e kwesiri ịchọpụta ụzọ iji gbochie mgbasa ọrịa Mpox ma chọpụta ọgwụgwọ ya.

Ọ gịnị bụ ọrịa 'Mpox'?

Ọrịa a bụ ọrịa nje nke yiri orịa "Small Pox".

Nke na-ebute ọkọ yiri ọkọ kịtịkpa n'elu ahụ mmadụ.

E nyochapụtara ọrịa a na mbụ n'ime ahụ enwe abụọ ndị okachamara sayensị nwuchiri n'ime ọhịa iji mee nnyocha na afọ 1958.

N'afọ 1970, e nyochapụtara ọrịa a n'ime ahụ mmadu na mba Congo.

Kemgbe afọ 1970, achọpụtala mmadu ole ma ole bu ọrịa n'obodo ole ma ole nọ n'Afrịka nke gụnyere Naijirịa.

Njirimara na mgba ama ọrịa 'Mpox'

Ọrịa a nwere ike igosi njirimara dị iche iche n'ahụ mmadụ, mgba ama ọrịa a kachasi apụta ihe n'ahụ onye bu ọrịa bụ:

Ahụ Ọkụ

Isi ọwụwa

Ahụ mgbu na azu mgbu

Oyi

Ike ọgwụgwụ

Mgbe mmadụ butere ọrịa a ruo ụbọchị atọ, ọkọ ahụ n'ebido fesawa n'elụ ahụ bido n'ihu ya ma fesawa ahụ ya niile, nke a n'eso oke ahụ ọkụ

Etu ọrịa a sị efesa

Dịka ọrịa a bụ ọrịa na-efe efe, mmadụ na anụmanụ maọbụ onye bu ọrịa a mekụta ahụ, onye ahụ nwere ike ibute ya bụ ọrịa.

"Mpox" na-efesasikwa ma mmadụ metụ aka n'elụ ebe nje ọrịa nọ dịka elu tebulu, elu akwa, aka ọnụ ụzọ nakwa ebe ndị ọzọ.

Nje a na-abanye n'ime ahụ mmadu site n'ebe mmadụ mereru ahụ, maọbụ site na ikụ ụme, maọbụ site na mmadụ imetu aka ọ kwọghị akwọ n'anya, n'imi maọbụ n'ọnụ.

Ọrịa a nwekwara ike isi n'ime ahụ anụmanụ banye n'ahụ mmadụ ma ya bụ anụmanụ taa mmadụ maọbụ gọọ ya mbọ.

Amabeghi anụmanụ na-ebughari ọrịa kachasia mana nnyocha na-egosi na oke nwere ike bụ anụmanụ kachasi ebu nakwa na-efesa ọrịa a.

Usoro mgbochi ọrịa "Mpox"

Zere imetu anụmanụ aka, ọkachasị ndị arụ na-aya, nakwa ndị nwụrụ n'ike

Zere akwa, n'ebe ndị ọzọ anụmanụ metụtara

Hụ na ndị bu ọrịa a maọbụ a na-enyocha na ha bu ọrịa nọrọ ọnwe ha

Nwere mmiri na ncha n'akwụ aka gị kwa mgbe kwa mgbe, ọ kachasi mgbe imetụrụ anụmanụ ọbụla aka

Nwere akụrụngwa ndị ụlọ ọrụ ahuike chekwawa onwe gị dịka ihe mkpụchị imi, uwe aka, nakwa ihe nchekwa ndị ọzọ.

Ọgwụgwọ ọrịa "Mpox"

Ndị ụlọọrụ sayensị nakwa ndị ụlọọrụ ahụike ekwuola na ha achọpụtabeghi ọgwụgwọ ọrịa a, mana a na-eji ọgwụ mgbochi "Small Pox" ebelata ike ọrịa a n'ahụ mmadụ.

Ọrịa a anaghi egbu egbu nke ukwu mana ọ ka mma mmadụ ichekwa ọnwe ya ma zere ya bụ ọrịa site n'usoro ndị ụlọ ọrụ ahụike depụtara.