Africa Eye: Etu agụụ si egbusi ụmụaka na Tigray n'ihi agha ha na gọọmentị Ethiopia

Ụbịam, ọrịa na agụụ na-awa ọtụtụ ndị mmadụ agba na Tigray dị na mpaghara Ugwu mba Ethiopia dịka mba ahụ na-alụ ọgụ kemgbe afọ abụọ.
N 'ọnwa Novemba afọ 2020, Gọọmentị mba Ethiopia malitere buwe mpaghara Tigray agha.
Puku kwuru puku anwụọla, ebe nde kwuru nde gbara ọsọ ndụ.
Mana n'ọnwa Ọktoba afọ 2022, Gọọmentị mba Ethiopia na ndị ha na-ebu agha bụ Tigray Liberation Front kwekọrịtara ka ha chịsa ọwa.
Mana dịka agha ahụ bere, agụụ ka na-awa ndị mmadụ agba.
N'ime obodo Bomba, ndị mmadụ anaghị ahụ nri rie.
Ụmụaka na-awagharị na-achọ ihe ha ga-erị.
Ọtụtụ ụmụaka adaala ọrịa n'ihi arụghị ezigbo nri.
Ọbụladị ndị e bugara n'ụlọgwụ weta ọgwụgwọ, anaghị ahụ nri a na-enye ha iji nyere ha aka gbakee ọfụma.
Kirie ya bụ ajọ ọnọdụ agha butere na mba ahụ ọfụma n' ihe onyonyo a.



