Obodo dị na Naịjirịa ebe Joshua na-achị eze

Nzukọ ga-adị n’etiti Joshua na Ngannou na-akpalite ekworo egwuriegwu dịịrị kemgbe n’etiti Naịjirịa na mba Kameruun.

Ebe foto si, BBC Sport

Nkọwa foto, Nzukọ ga-adị n’etiti Joshua na Ngannou na-akpalite ekworo egwuriegwu dịịrị kemgbe n’etiti Naịjirịa na mba Kameruun.

Ịlụ ọgụ bụ ihe dị n’ọbara Joshua dịka nwanna ya bụ Raymond Ajakaye siri kwuo, onye bi na Sagamu ebe ezinaụlọ Joshua siri pụta.

A tụrụ anya na obodo ahụ ga-edere duu n’ụbọchị Fraịde dịka ọtụtụ mmadụ ga-ezukọ iji kirie iti ọkpọ ga-adị n’etiti azụ eru ala mba Briten na nwaafọ Kameruun bụ Francis Ngannou – iji jalie nwoke ha hụtara dịka onye nke ha.

“Ọ bụ ihe na-aga n’agbụrụ anyị, anyị niile bụcha ndị tara akpụ, malite na nna nna m, ụmụnne nna m ndị nke nwoke na nna ya,” ya ka Ajakaye gwara BBC Sport Africa.

“Anyị lụrụ ọgụ ọtụtụ. Ọ bụ ebe a ka m chere o si nweta onyinye iti ọkpọ.”

Dịka obodo dị nso Legọs Steeti na mpaghara South-West nke Naịjirịa, Sagamu nwere ọnụọgụ mmadụ fọdụrụ obere ka o ruo ọkara otu nde.

Dịka Naịjirịa n’ozuzuoke, ọnụọgụ mmadụ ahụ bụ nke ọtụtụ n’ime ha bụ ndị na-eto eto nke pụtara na ọtụtụ ndị ntorobịa enwetala mkpalite mmụọ n’ihe nketa ezinaụlọ Joshua nakwa agamnịihu ya n’ọgbọ ọgụ.

Nke ahụ a bụrụ mmetụta ya, obodo ahụ nwere otu nkwado ‘Anthony Joshua Boxing Fan Club’ nke onwe ya tinyekwaara ọtụtụ ndị na-esonyere ha n’ọbaozi ‘social media’, dịkwa ka akpọkwasara otu okporoụzọ aha Anthony Joshua iji kwanyere nwaamadị ahụ gbara afọ 34 tuuru ugo n’egwuriegwu Olimpiks nakwa onye bụụrụ azụ erughi ala n’iti ọkpọ ọha mba ụwa ugboro abụọ ugwu.

“Okporoụzọ a bụ nke a na-akpọ Cinema Road kemgbe ọtụtụ afọ mana gọọmenti bịara gbanwee ya iji kwanyere iti ịgba Joshua ugwu,” ya ka Ajakaye na-ekwu.

“E nwere ụlọọrụ aanyị hiwere ebe a iji bụrụ ebe nzukọ maka ndị na-ajali ya.”

Ọ bụghị naanị na okporoụzọ a bụ ebe nzukọ nke ndị nkwado ya, e nwekwara atụmatụ iwu ụlọ mmegharịahụ maka ịchọpụta onye ọzọ ga-abụ Anthony Joshua.

Otu ụlọakwụkwọ ọtaakara ochie bụ otu n’ime ụlọ ndị a ga-ahụ n’okporoụzọ Anthony Joshua, okporoụzọ akpọkwasara aha otiọkpọ mba Briten na Sagamu

Ebe foto si, BBC Sport

Nkọwa foto, Otu ụlọakwụkwọ ọtaakara ochie bụ otu n’ime ụlọ ndị a ga-ahụ n’okporoụzọ Anthony Joshua, okporoụzọ akpọkwasara aha otiọkpọ mba Briten na Sagamu

Ihụnanya Joshua nwere maka Naịjirịa

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Anthony Oluwafemi Joshua bụ onye a mụrụ na mba UK n’ime ọnwa Oktoba 1989. Nne ya bụ nwaafọ Naịjirịa ebe nna ya bụ nwaafọ Naijịrịa na Ireland.

Ọ bụ eziokwu na ọ bụ onye na-ejikarị ọkọlọtọ mba Briten alụ ọgụ, ọ nọkwara Naịjirịa oge ọ na-eto eto, gaa ụlọakwụkwọ nwere ụlọ obibi, tinyere na mmetụta mba Afrịka – nke kachasị nke Naịjirịa – nwere n’ebe ọ nọ bụ nke doro ewu na ọkụkọ anya.

Joshua nwere eserese ‘tatoo’ nke mba Afrịka na ngụ aka nri ya, dịka egosikwara okeala Naịjirịa nke ọma, ebe o jirila egwu ụmụafọ Naịjirịa a maara nke ọma dịka Burna Boy na Femi Kuti, nwa ọkaibe n’iti egwu ‘afrobeat’ Fela Kuti gagharịa n’ọgbọ egwuriegwu.

A na-egosi ọgụ ya n’igwe onyonyoo etinyere n’ụzọ pụrụ iche n’ihu obieze Akarigbo dị na Sagamu, onye eze kachasị elu nke obodo ahụ dị na Naịjirịa.

“Ezinaụlọ Joshua bụ nke a maara nke ọma n’obodo ya. Nne ya si n’ụnụmara m dịka mụ na ya bụ ụmụnna,” ya ka Osiberu na-agwa BBC Sport Africa.

“Anthony Joshua bụ onye isi jụrụ oyi dịka ọ na-etinye uche n’ihe ọ bụla ọ na-eme. Obi ruru ya ala, ọ naghịkwa ekwe ka ọnọdụ ya baa ya n’isi. E wezuga nke ahụ, ọ na-amasị ya ịbịaru nso n’ebe o si lọ ụwa.

“Anyị na-agọrọ ya ọfọ ihe ọma dịka anyị ga-agakwa n’ihu n’ekpere ya ekpere.”

Anthony Joshua gara Sagamu na 2021, zute ụfọdụ ndị a ma ama n’obodo ahụ

Ebe foto si, BBC Sport

Nkọwa foto, Anthony Joshua gara Sagamu na 2021, zute ụfọdụ ndị a ma ama n’obodo ahụ

Joshua garuru n’obodo ahụ afọ atọ gara aga n’oge o mepeghachiri ọzọ n’ihi ntiwapụ nje coronavirus, gaa zute Osiberu na ndị otu njali ya ndị ọzọ.

“Anyị niile nwere njịkọ siri ike, ọ bụ eziokwu na anyị adịghị ezute kwa mgbe kwa mgbe tinyere na ọ dịghị alọta ụlọ si na mgbe ruo na mgbe n’ihi ụdị ihe ọ na-eme,” ya ka Ajakaye na-akọwa.

“Ọ bụ nwata nwere nnukwu nsọpụrụ ma bụrụ onye azụlitere nke ọma, dịka ọ na-asọpụrụ ndị okenye.”

Kayode Segun-Okeowo, onyeisioche otu ‘Anthony Joshua Boxing Fans Club’ kwuru na ọ bụrụla omenala ka ndị obodo ahụ na-apụta n’igwe ijali onye ha hụtara dịka nwa ha nwoke.

“Otu ahụ bụ nke ehiwere na 2016 dịkwa ka anyị nwere ọtụtụ ndị nkwado maka Anthony Joshua ebe a,” ya ka ọ na-ekwu.

“Anyị ahaziela mmemme nkiri maka ọtụtụ ịkụ ọkpọ ya ma haziekwa ọgbakọ mmeri maka ya.

“A na m atụ anya na ọ ga-eturu ugo mmeri na ọgụ ọzọ ọ ga-alụ. Joshua emeriela ndị bụ ọkaibe n’ịkụ ọkpọ. A hụghị m ka Ngannou ga-esi merie Anthony Joshua nke anyị.”

Anthony Joshua na-egosipụta eserese ‘tatoo’ mba Afrịka na ngụ aka nri ya

Ebe foto si, BBC Sport

Nkọwa foto, Anthony Joshua na-egosipụta eserese ‘tatoo’ mba Afrịka na ngụ aka nri ya

Oge ọ bụla Joshua banyere n’ọgbọ ọgụ, obodo Shagamu na-eme mkpọtụ. Fraịde agaghị adị iche dịka ndị ịkụ ọkpọ na-amasị na ndị ọ naghị amasị ga-agbakọ ikiri nwa ha nwoke ha hụrụ n’anya.

Nzukọ ga-adị n’etiti Joshua na Ngannou na-akpalite ekworo egwuriegwu dịịrị kemgbe n’etiti Naịjirịa na mba Kameruun.

Mana ọ bụrụ maka ndị bi na mpaghara a bụ Naịjirịa, o doro ewu na ọkụkọ anya – enweghị onye ọzọ ha ma ga-eturu ugo mmeri karịakwa otu onye ahụ.