Etu oku enyemaka a kpọrọ BBC siri zọpụta ụmụnwaanyị tọrọ n’ụgbọala njụoyi

Ụmụnwaanyị tọrọ n'ime ụgbọala njụoyi

Ebe foto si, Screenshot

    • Onye dere ya, By Khue B Luu
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News Vietnamese, London

A zọpụtara ụmụnwaanyị isii site n’azụ ụgbọala na mba France, mgbe BBC chọpụtara ha ma kpọtụrụ ndị uweojii.

Ndị Vietnam anọ na ndị Iraq abụọ e chere bụ ndị mbịarambịa tọro n’ime ụgbọala ahụ, na-atụ egwu na-achọ etu ha si eku ume. Otu n’ime ha gwara BBC okwu site n’ime ụgbọala ahụ.

BBC nyeere ha aka kpọọ ndị uweojii, bụ ndị kwụsịrị ụgbọala ahụ.

Ndị uweojii mba France anwụchiela onye ọkwọ ụgbọala ahụ.

Ha amalitela ime nyocha banyere ebubo ịtụ mmadụ mgbere.

Oku nzọpụta

N’ihe dịka uhuruchi nke ụbọchị Wenezde, ọkụ ekwentị chara. Ya bụrụ ozi kwuru: “E nwere ndị si n’okeala France banye England ji ụgbọala ogologo njụoyi.”

Tupu m ga-agụcha ozi ahụ, oku abata n’ekwentị m.

“Ị nọ na Yurope? Biko nye aka, ọ dị ọsịsọ,” olu onye ụjọ na-atụ.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Agbata oyi wuzuru m ahụ. Akụkọ banyere ndị Vietnam 39 bụ ndị mbịarambịa nwụrụ n’ụgbọala njụọyi n’afọ 2019 nobodo Essex ga-abụ ihe ọhụrụ n’uche m.

Ndị na-atụ mgbere mmadụ kpọchiri ndị mbịarambịa karịrị 39 nwụrụ anwụ.

Amaghị m onye kpọrọ m, mana eche m na ọ matara m oge mere akụkọ banyere ọnwụ ndị a mere n’Essex, maka na ọtụtụ ndị Vietnam zutere m n’oge ahụ.

Ajụrụ m onye ahụ kpọrọ m ụfọdụ ajụjụ mana o wetere m maka na anaghị m enwetecha ọsịsa ndị m chọrọ.

Nke a bụ ihe m chọpụtara – E nwere mmadụ isii zọrọ n’ime ụgbọala, a maghị akara njirimaara ụgbọala maọbụ ebe ọ na-aga.

Ihe m mma site n’ihe onye kpọrọ m kwuru bụ na ụgbọala ahụ nọ na France mana ọ dị ka ọ tụgharịala ma ghara ịgba n’ụzọ ebe o kwesịrị - okeala dị n’etiti France na England.

Agwara m na ụmụnwaanyị isii nọ n’ime ụgbọala ahụ, a gbanye njụoyi ya. Oyi malitere ịtụ ndị nọ n’ime ya ma na-ama jijiji.

Mana ha ka nwereike ịkwụ ndị n’ezi okwu, onye kpọrọ m nyere ohere ka m na ha kwuo.

“Ezigbo na-atụ, [ikuku oyi] ahụ na-eku,” otu nwagbọghọ ziteere m ozi site n’ụgbọala ahụ, nke bu onere. O kwuru na e ji ogolog igwe gbachie ya.

Ihe onyonyo nwaanyị tọrọ atọ

O ziteere m ihe onyonyo abụọ na-egosi etu ime ebe ahụ dị.

Otu gosiri ebe gbara ọchịchịrị e ji igbe ‘cardboard’ nke mkpụrụosisi juru dochie si n’ala ruo n’elu ma hapụ naanị obere ohere n’ala.

Mmadụ kwara ụkwara, olu otu nwaanyị kwuru sị na Bekee “Agaghị ekunwu ume.”

Nwaanyị a kwuru na ha banyere ụgbọala ahụ n’elekere 00:30 nke abalị ụbọchị gara aga. Ha anọọla ihe ruru awa iri n’ime ya ma malite inwe mgbakasị ahụ mgbe ekwentị ha gosiri na ụgbọala ahụ chere ihu n’ụzọ ọzọ.

Na-egbughi oge, a kpọrọ ndị otu m na BBC News, onye ntaakụkọ anyị bi na France. N’otu aka ahụ, a kpọkwara onye ntaakụkọ akwụkwọ mgbasaozi France bụ La Monde na Lọndọn ya kpọọ ndị otu ya nọ n’ụlọọrụ ha na Paris na-ahụ maka ọpụpụ na mbata ndị mmadụ.

Nwaanyị a ziteere m GPS na-egosi ebe ha nọ ebe m hụrụ na ụgbọala ahụ nọ n’okporoụzọ E15 dị nso na Drace, mpaghara ugwu nke Lyon.

Agwara m onye otu nọ na France ka ọ kpụtụrụ ndị uweojii dị nso n’ebe ahụ, o mere nke a anyị wee zigara ha ozi ndị anyị ji banyere ụgbọala a.

Anyị nwetere ozi niile anyị chọrọ ma na-ezipu ebe ụgbọala ahụ nọ kwa mgbe n’etiti ndị ntaakụkọ BBC News na Yurope, ndị uweojii France nakwa ndị ntaakụkọ ndị ọzọ.

Amazighi ebe ha nọ

N’otu ntabi anya, ịntaneti na-egosi ebe ha nọ pụrụ - amaghịzi m ebe ụgbọala nọ

Mana nwaanyị gara n’ihu na-ezitere m ozi. O kwuru na a gbanyụọla igwe njụoyo – na ọ na-arazi ahụ iku ume.

“Anyị na-achọzi ikubi ume,” ka o dere.

A hụrụ m ka ha fagidere onwe ha n’ohere obere ahụ, ụjọ na-atụ maka na ha nwereike ikubi ume.

Agbara m ha ume, na-agwa ha ka ha dere jụụ, ma kwụsị ikwu okwu iji chekwaa ikuku, na ndị uweojii na-abịa ọsịsọ.

Eji m ahụ ịma jijiji na-ele anya n’ihu igwe kọmputa na ekwentị, na-eche ka m nụụ akụkọ.

Ndị uweojii gbachiri ihu

Ka m kwuru ụfọdụ oge, a chọpụtara na ndị otu nwaanyị ahụ mmadụ atọ jụrụ iso ya baa n’ụgbọala ahụ. Amaghị m ihe ha jiri mee mkpebi ahụ mana ha setere akara njirimaara ụgbọala ahụ.

Foto ahụ gosiri na akara ahụ bụ nke Irish, n’ekwentị m ahụrụ m ebe ụgbọala ahụ nọ ọzọ.

Ndị uweojii France nọ na mpaghara Rhone gwara anyị na ha ahụla ebe ụgbọala ahụ ma kwụsị ya.

Ezigaara m nwaanyị a ozi, mana echeghi m na ọ gụrụ ya – Ndị uweojii erutela ma jichie ekwentị ha.

Ụmụafọ Vietnam anọ ahụ kwuru na ha banyere ụgbọala ahụ bụ nke ekwere ha na nkwa na ọ ga-ebuga ha England n’udo.

Obi kụjụrụ m maka na amaara m na ha nwere nchekwa na France. Ha dị mma, ka m gwara onwe, ọ bụ ya kachasị mkpa.

N’ihe dịka elekere 17:00 ka ọkaiwu mba France bụ Laetitia Francart na Villefranche-sur-Saone kwuru na ụgbọala ahụ si Lithuania, na a na-enyocha ọkwọ ụgbọala ahụ.

Nwada Francart kwukwara ụmụnwaanyị anọ bụ ndị Vietnam, otu n’ime ha ka bụ nwata, ebe mmadụ abụọ ndị ọzọ si Iraq.

Gịnị mere na kamgbe mmadụ 39 nwụchara n’obodo Essex n’afọ 2019 ụmụnwaanyị ndị Vietnam ka na banye n’azụ ụgbọala na-agafe okeala? Enwetebeghi ezi ọsịsa banyere nke a.