You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
M gwa gị na mụ echebeghị echiche ịpụ na Naịjirịa, mara na m bụ onye ụgha – Aproko Doctor
Dọkịta Chinonso Egemba, bụ dibia ahụike eji 'Aproko Doctor' mara na soshal midia, ekwuola na ya chere echiche ịgbapụ Naịjirịa ọtụtụ oge.
Aproko Doctor kwuru nke a na mkparịtaụka pụrụ iche nke BBC Igbo haziri gbasara etu ọtụtụ ndị ntorobịa si agbapụ Naịjirịa aga mba ofesi, nke ọtụtụ na-akpọ 'Japa'.
O kwuru na oge ya gụchara akwụkwọ dịka dọkịta, ọ rụrụ n'ụlọgwụ nkuzi 'Imo State University Teaching Hospital' ihe karịrị ọnwa iri mana akwụghị ya ụgwọ ọbụla.
Ọ gara n'ihu kwu na nne ya na-ere akara, ịkwụ ụgwọ ụlọ na-esiri ha ike, nakwa ọ na-arụ ọrụ n'ụlọọgwụ abụọ maọbụ atọ iji mara ma ego ọ ga-abịa.
"Eleela m ule iji gafee mba ofesi, mana oge m malitere iwepụta ihe onyonyo na soshal midia, bịa hụ na ọ na-aga obere obere, ekwuru m na m ga-enyekwu onwe m otu afọ ka m mara ma ihe ọ ga-aka mma," Aproko Dr kwuru.
Dr Egemba kwuru na ihe mere ọtụtụ ndị ntorobịa ji agbapụ na Naịjirịa bụ maka na ha anaghị enweta ohere ime ihe ha ga-eji nyere ndụ ha aka.
Ego a kwụrụ m dịka onye na-asa efere na Kanada karịrị ụgwọ ọnwa m dịka dọkịta eze na Naịjirịa - Linda Iheme
N'aka nke ya Linda Iheme, bụ dọkịta na-ahụ maka eze, kwuru na ya gafere mba Kanada n'ihi na ọ chọrọ ihe ka mma maka ndụ ya.
Ugbua, Linda Iheme nwere ụlọọrụ nke na-enyere ndị mmadụ aka ịpụ Naịjirịa ga gụọ akwụkwọ na mba ofesi dị icheiche.
"Oge m gara Kanada ọhụrụ, ana m arụ ọrụ n'ebe a na-ere nri. Ọrụ m bụ ịsa efere na ihicha ala, mana ego a na-akwụ m ebe ahụ, karịrị ego a na-akwụ m dịka dọkịta eze na Naịjirịa," Dkt Iheme kwuru.
Ọ kọwara na ọpụpụ ya pụrụ na Naịjirịa apụtaghị na ya ahụghị Naịjirịa n'anya, kama ọ bụ ka ndụ ya kawanye mma.
"Ugbua, enwere ọtụtụ ihe m na-eme na Naịjirịa iji nyere ndị mmadụ aka, dịka ịrụ ụlọ akwụkwọ nakwa ihe ndị ọzọ," Iheme kwuru.
Kedu etu ọpụpụ ndị ntorobịa ga-esi emetụta Naịjirịa?
Dkt Egemba kwuru na ọpụpụ a ndị ntorobịa na-apụ na Naịjirịa, ọ kachasị ndị ọrụ ahụike, na-emetụta Naịjirịa nke ọjọọ.
"Naịjirịa so na mba ọnụọgụgụ ndị dọkịta ha kacha nta iji tunyere ọnụọgụgụ ndị mmadụ nọ na ya."
"Mana ugbua, ndị dọkịta ahụ na-agbapụ agbapụ, nke a na-emetụta ọnọdụ ahụike n'ụzọ ọjọọ."
"Otu enyi m kpọrọ m izuụka olemole gara aga, na-arịọ m ka m chọtara ya dọkịta ga-eleta nna ya na-arịa ahụ anya, maka na ụlọọgwụ ha gara enweghị dọkịta ọbụla nọ ebe ahụ."
N'okwu nke ya, Dkt Linda Iheme kwuru na ọ ga-adị mma ma gọọmentị Naịjirịa na mba ndị ọzọ nwee nkwekọrịta na ọtụtụ ndị na-abịa na mba ha ịgụ akwụkwọ ga-anọ afọ olemole ma laghachite Naịjirịa iji were mmụta ha nyere obodo aka.
"Iji maa atụ, mụ onwe m kpebiri na ọpụpụ m pụrụ na Naịjirịa ga-abụ ihe ọma, ọ bụ ya mere m ji eme ọtụtụ ihe m na-eme na Naịjirịa dịka inye ndị mmadụ onyinye ịgụ akwụkwọ n'efu."
Magbapụ ndị ọrụ makwa ndị ntorọbịa n'igwe abụrula ihe na-ewu ewu ọ kachasị na ndịda Naịjirịa. BBC Igbo ga-enwe mkparịtaụka maka uru na ọghọm dị na ya.
Atụmatụ a ama dịka 'japa' bụ okwu mbite n'asụsụ Yoroba pụtara mgbapụ n'asụsụ Igbo.
Ọ bụzị ihe ọtụtụ ndị ntorọbịa na-agbasi mbọ ike ihu etu ha ga-esi na Naịjirịa gbapụ gaa mba ofesi mepere emepe ina-ebiri ndụ ha.
E lee ya anya nkịtị, atụmatụ a dị ka ihe ọma n'ihi akụkọ ọma nakwa foto mara mma ndị mere ya bụ njepụ na-egosiputa.
Mana e nwere ọtụtụ ọghọm nakwa ọdachi so ya bụ atụmatụ a, nke ọtụtụ mmadụ akwadoghi onwe ha maka ya. Ọghọm ọzọ dịrịla Naịjirịa dịka mba maka ihe a na-akpọ 'brain-drain' bụrụ mgbe ndị ma ọrụ bụ ọkacha mma na mba ahụ na-akwapụ n'igwe.
Nke a mere ka BBC Igbo hibe mkparịtaụka ndị ọnụ na-eru n'okwu nakwa ndị ihe a metụtara iji tulee ya bụ okwu ọfụma.
Mkparịtaụka a ga-amalite n'elekere asaa nke mgbede Wenzde 28 Septemba 2022 na BBC News Igbo Facebook. Pịa aka ebe a, ka i gaa.
Kwa ọnwa atọ, BBC Igbo na-eme ya bụ ọgbakọ ezumezu a ka ndị ọnụ na-eru n'okwu sonye kpata maka ya bụ okwu ndị metụtara ndị Igbo iji hụ etu ọ ga-esi dị mma.
BBC Igbo emerela ọgbakọ ezumezu a ugboro isii. Lee ụfọdụ n'ime ha: