'Ụlọọgwụ mbụ jụrụ, sị anyị weta akwụkwọ n'aka ndị uweojii -Nwoke mgbọ tụgburu nwatakịrị ya n'ụlọ ha

Ebe foto si, Eleweke Family
Otu Ezinaụlọ bụ ndị mgbọ egbe a na-amaghị ebe o si tugburu nwa ha nwoke akpọọla ndị uweojii na ndị ọdị n'aka oku ka e nye ha ikpe ziri ezi site n'ichọpụta ndị gbara egbe ahụ.
Mgbọ egbe tugburu obere nwa a bụ Emmanuel Eleweke dị naanị otu afọ na ọnwa asatọ n'ụlọ ha dị n'Owere Imo steeti.
Nke a mere mgbe Maazi Okechukwu Eleweke gbara afọ 49, onye na-arụ oche, na nwunye ya bụ Oriaku Kelechi Eleweke, onye nkuzi, nọ n'ụlọ ha n'abalị n'ụbọchị Mọnde 9 Juun, 2025 mgbọ egbe tụrụ nwa ha bụ Emmanuel n'elu akwa ndina ma gbuo ya.

Ebe foto si, Eleweke Family
Dịka Maazi Eleweke si kọọrọ BBC Igbo, ọdachi ahụ dakwasara ha dịka ọ nọ n'ụra n'ihe dịka elekere iri nke abalị (10pm).
"N'abalị Itoolu nke ọnwa Juun, afọ 2025, nwatakịrị m aha ya bu Emmanuel Chisimdiri Okechukwu dị otu afọ na ọnwa asatọ, dịka ya na ụmụaka ibe ya gwuchara egwu a sịrị ha laba n'oge ka ha nwee ike iteta ma gaa ụlọakwụkwọ.
Ya na nne ya na-egwu egwu, na-ekpe ekpere, nwunye m kpee ya aza Amen."
"Ebe ahụ ka a nọ, ụra eburu m."
"Ọzọ bụ ka m nụrụ ka nwunye m tiri mkpu, mụnwa amalie, lee anya n'akụkụ ebe nwa m na-edina, maka na anyị atọ na-edina n'otu akwa."
"Ihe m hụrụ bụ ọbara juru n'elu akwa."
"M jụọ, gịnị mere?, ha sị na ọ bụ mgbọ egbe. Ọgbagwojuru m anya n'ihi na e si m n'ụra malie."
Nwoke ahụ na nwunye ya ndị Abia steeti ji ọsọ bugaa nwa ha n'ụlọọgwụ dị ha nso mana ndị ụlọọgwụ ahụ ekweghị anabata nwatakịrị ahụ.
"Anyị jị ụkwụ gawa n'ụlọọgwụ (anyị achọghị ịkpọ aha ha) nke dị so n'ụlọ anyị, anyị arịọ ha ka ha mee ihe ọbụla ha ga-eme iji zọọ nwakịrị a."
"Mana ọ tụrụ m n'anya nke ukwuu na Naịjirịa nke m nọ, dọkịta nọ n'ọrụ sị anyị gaa weta akwụkwọ n'aka ndị uweojii."
"Ị sị m ga-eweta akwụkwọ ndị uweojii n'elu nwakịrị dị otu afọ na ọnwa asatọ?"
Ezinaụlọ ahụ bugaziri nwa ahụ n'ụlọọgwụ Goọmenti, Federal Medical Centre, Owere, bụ ebe ndị dọkịta gwara ha na nwata ahụ anwụọla.
Onye gbara egbe tugburu obere nwa a n'ime ụlọ nne na ya nna?

Ebe foto si, Eleweke Family
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị nọ nso ebe ihe a mere na-ebo ebubo na ọ bụ ndị uweojii so otu ọgaranya a ma ama nke anyị achọghị ikpọ aha ya, nọ na-agba egbe aghara aghara nke mgbọ ya gara tụọ nwata ahụ n'ụlọ nne na nna ya ya.
Mana ndị uweojii enweghị ihe ha kwurula banyere okwu ahụ dịka mbọ BBC Igbo gbara ịnụta olu ha amịtaghị mkpụrụ .
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Henry Okoye azaghị oku ekwentị ya maọbụ saa ozi e zigaara ya n'oge ebipụta akụkọ a.
Mana Maazi Eleweke na-eti mkpu ka ndị uweojii sie imi n'ala sipụta ndị gburu nwa ya nwoke bụ nke atọ n'ime ụmụatọ ya na nwunye ya ji.
"Onye ọbụla gbara egbe ahụ gbagburu nwa m nwoke bụ nwa nke atọ...'
"Ihe dị m mkpa bụ ka e nye Emmanuel Eleweke ikpe ziri ezi. Onweghị ihe nwa ahụ ma."
"Kedụ ka mmadụ ga-esi agba egbe aghara aghara n'ebe ndị mmadụ bi."
Maazi Eleweke onye rụtụrụ aka na a gbara egbe ahụ n'ebe dị nso n'ụlọ ha gara n'ihu kwuo, "Ihe m chọrọ bụ ka ndị uweojii rụọ ọrụ ha."
"Ọ bụ ọrụ dịịrị ndị uweojii ịchọpụta ndị gbakasiri egbe," tụgburu nwa ya.









