You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Onyeisiala Naịjirịa enwetala ụgbọelu ọhụrụ na-agbanyeghi oke agụụ na ihe ụkọ
Onyeisiala, Bola Tinubu azụọla ugboelu ọhụrụ. Nke a bụ ihe na-eme ka ụmụ Naịjirịa mechara ngagharịiwe na steeti dị icheiche maka oke agụụ, ihe ụkọ na ajọ ọnọdụ akụnaụba.
N’ụbọchị Monde 19, Ọgọst, 2024, ka onyeisiala Tinubu ji ụgbọelu ahụ aha ya bụ Airbus A330 fepu, gawa mba France. Ụgbọelu ahụ bụ nke a gbakwụnyere na nke dị bụ adị mere ya ise n'ọnụ ọgụgụ.
Ọ zụrụ ụgbọelu ahụ ka ụmụ Naịjirịa na-eme ngagharịiwe maka agụụ dị ugbua karịa ka ọ dị afọ iri garaaga. A maghị ka ndị omeiwu enyere ikike ka azụta ụgbọelu ahụ maka na ọ dịghị na mmefu ego Naịjirịa. Amaghịkwa ego ole e jị zụọ ya.
N’akara X soshal mịdịa ya, otu onye enyemaka onyeisiala Naịjirịa n’igbasa ozi bụ Bayo Onanuga kwetara na a zụtara ụgbọelu ọhụrụ ahụ mana okwughị ihe mere onyeisiala jị aga mba France ma ọ bụ ụbọchị ole ọ ga-anọ.
Ozị ahụ kwuru na “ụgbọelu ọhụrụ ahụ benatara ego Naịjirịa na-emfu kwaafọ maka idozi na ichekwa ụgbọelu ndị ochie”
Ụgbọelu ọhụrụ ahụ bụ nke otu ụlọọrụ China napụrụ ma jide oge ha wetara ikike n’ụlọikpe dị na France bụ nke yere ha ike iwere ihe ọbụla bụ nke Naịjirịa maka nsogbu azụmaahịa dị na etiti ha na Gọọmenti Ogun steeti.
Ụgbọelu ahụ dị afọ ịrị na ise bụ nke e nwere ike ire nde dọlla 600 n’ahịa ka gọọmenti jiri nọchie anya ụgbọelu nke dị afọ ịrị na itoolu. Akara ụhgbọelu ahụ bụzị 5N-NGA ebe nke ọ nọchịrị dị afọ ịrị na itoolu bụ akara BBJ 737 -700. Ndị gọomenti na-ekwu na ụgbọelu nke ochie ahụ na-anapụ ha ego gbara ọkpụrụkpụ maka idozi na ichekwa ya.
N’ọnwa June, ndị omeiwu n’Naịjirịa kwetara ka a zụtara onyeisiala Naịjịrịa na osote ya ụgbọelu ọhụrụ maka na nke dị bu adị adịchaghịzị mma. Na ọnwa garaaga ndị omeiwu buniriri mmefu ego 2024 nke Naịjirịa sita na 28.7 trillion ($18 billion) ruo N35.06 trillion ($22.5 billion) mana mmadụ amaghị na ego ụgbọelu eso n'ime ya.
BBC kpọtụrụ ụlọọrụ onyeisi ọmeiwu Na Naịjirịa nakwa ụlọọrụ onye ndụmọdụ pụrụiche nke Gọọmenti etiti mana ha ewetabaghị ozi ọ bụla.
Mba kacha nwee mmadụ n’Afrika na-enwe nsogbu akụnụba bụ nke ọnụ ahịa ịrị elu na-akpata, ego Naịjirịa ịda mba n’isi dọlla nakwa gọọmenti enweghị ego .
N’ọnwa Ọgọst ka ụmụntorobia mere ngagharịiwe ụbọchị ịrị maka agụụ na ihe ụkọ bụ nke ha jiri na-akpọ oku ka akwụsị ọchịchị ọjọọ. E mere ngaharịiwe ahụ na-enweghị nsogbu na steeti dị icheiche mana e nwere ọgbaahara na steeti ndị ọzọ ebe mmadụ ruru 13 wụrụ na ngagharịiwe ahụ dịka Amnesty International siri kwuo.
Gọọmenti Naịjirịa ịzụta ụgbọelu ọhụrụ ahụ oge gọọmenti kwesiri ibenata mmefu ego ka ọtụtụ na-akọwa dịka enweghị mmetụta maka ahụhụ ụmụ Naịjirịa na-ata. Dịka ndị ‘State of food Security and Nutrition” n’ụwa niile sirị kwuo, ndị Naịjirịa ruru nde161 bụ ndị na-adịghị eri ezigbo nrị ebe madụ ruru nde 39.4 nọ na-ahụghị tụrụ rachaa.
Peter Obi jị soshal mịdịa X ya kwụọ “na gọọmentị ịga n’ihu zụta ụgbọelu ọhụrụ ahụ na-agbanyịghị mkpu niile ndị mmadụ tiri megide ya nakwa ihe ụkọ na ọke agụụ dị ugbua gosiri na ndị ọchịchị nọ n’ọkwa ugbua enweghị mmetuta mmadụ”.
N’ihe dịka otu afọ onyeisiala banyere n’ọchịchị ka ọ zụtara ụgbọelu ọhụrụ, ụgbọ mmịrị ọhụrụ, manye ijeri naịra ịrị na otu ka e nwere dozie ụlọ osote ya, zọọ ọtụtụ ụgbọala kesaa ndị ọlụ gọọmenti ma nye otu ijeri na ọkara ka e nwere zụtara uye ya ụgbọala.
Oge otu jịkọrọ ndị ọrụ gbara abụbọ ọrụ maka ụgwọọnwa okpekatampe ha, gọọmentị buniri ya elu sita na puku naịra ịrị atọ ọ bụrụzịa puku naịra ịrị asaa bụ nke na-elughị narị puku abụọ na iri ise ndị ọrụ chọrọ ka a kwụọ ha dịka ụgwọọnwa e ji adịndụ.
Ihe ruru ọnwa ịrị na asatọ, ọnụ ahịa na-arị elu ọjị. Ihe garara ọnụ karịa ka ọ dị afọ ịrị abụọ na-asatọ garaaga bụ nke ruru pasenti 34.19 na ọnwa Juun 2024 mana ọnụ ahịa gbadara obere n’ọnwa July bụrụzịa 34.4 pasenti. Mana ihe nrị na ọnụ ahịa ndị ọzọ ka dị ngaraọnụ.
Naịjirịa bụ mba akụnụba ha kacha n’Afrịka mana ugbua ha bụzị ndị nke anọ dịka ndị International Monetary Fund (IMF) siri kwuo. Ego Naịjirịa gbadara ma daamba ihe ruru pasenti ịrị isii n’ime otu afọ.
N’ụbọchi sonde, ọtụtụ mpaghara Naịjirịa enweghị mmadụ ụgbọala. Ndị mmadụ na akwụ ugbua n'ahịrị n'ahịrị na-azọ ka ha zụta mmanụ ụgbọala.
Naịjirịa bụ mba na-emeputa mmanụ agbụdị, mana ha na-ebubata mmanụ ụgbọala ruru pasenti 90 maka na ha enweghị ike ịrụpụta mmanụ ụgbọala na Naịjirịa.
Timothy na-arụ ụkwụ ụgbọọala gwara BBC na “ọnọdụ anyị adịghị emetuta gọọmenti. Afụfụ niile anyị na-ata adịghị emetuta ha nke a mere ha ji aga mba ofesi emefu ego mana anyị enwelula ha tinye n’aka Chineke”.