Ọgba mbọ: Aka ọrụ m bụ ịrụ chandalier - George Michael Uwakwe

Ọgba mbọ: Aka ọrụ m bụ ịrụ chandalier - George Michael Uwakwe

George Michael Uwakwe bụ nwaokoroọbịa na-eji aka ya arụpụta ọkụ chandelier n'Abịa steeti.

Ọ sị na ya na-esi na ụbụrụ echepụta atụmatụ ọ na-arụ.

O kwuru na ya chee ya, ya arụpụta ya.

Ọ sị na ụfọdụ akụrụngwa o ji arụ ọrụ dịka crystalụ yiri mkpụrụ mmiri awa awa si na mba Chaịna ebe ihe ndị ọzọ o ji arụ ọrụ dịka igwe dị mkpụmkpụ si n'Aba na Legọs.

Ọ sị na olileanya ya n'ala Igbo, Naịjirịa na Afrịka ga-abụ ebe ọganihu si abịa.

Ndị mere akụkọ a bụ Adline Okere bụ onyeisi ndị ntaakụkọ (Editor) BBC Igbo na Donald Wogu Onyentaakụkọ Vidio na BBC Igbo.