You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu ndị ntọrị si tinye ndị Udi, Enugwu steeti oke egwu n'ahụ
Kemgbe otu ọnwa, ndị ntọrị mmadụ na-akpa mkpamkpa n'obodo dị n'okpuruọchịchị Udi n'Enugwu Steeti dịka akụkọ kwuru na ha na-egbu ma na-atọrọ ọtụtụ mmadụ.
Akụkọ rutere ụlọmgbasa ozi BBC ntị kwuru na ndị ahụ a na-enyo enyo na ha bụ ndị ntọrị gburu otu nwoke na-ala be ya n'Eke n'ụbọchị Sọnde 20 Julaị 2025 ma dobe nwunye ya o bu n'ọgba tumtum ya n'ọnọndụ ọ dị ndụ ọnwụ ka mma.
Otu nwaanyị si obodo Eke aha ya bụ Priscillia Udeh gwara BBC na mkpamkpa ahụ kpara n'ihu ebe ekpere a mara dịka Ugwu dị Nsọ Eke.
Udeh kwuru na nwoke e gburu bụ Maazị Uche bụ onye Nkanụ mana o bi n'Eke ebe ọ na-akọ ọrụ ugbo na arịkwa nkwụ.
O kwuru na Maazị Uche gara 9th Mile ibute nwunye ya gara ịzụta ihe n'ahia mana ọ maghị na ndị ntọrị nochiri ụzọ na-atọrọ ndị njem.
Mgbe o jiri ọgba tumtum ya bịakwute ha n'ike, ha gbagburu ya, ma gbakasia nwunye ya egbe n'ahụ.
Ka ọ dị ugbua, ozu Maazị Uche nọ n'ụlọọgwụ Bemem dị na Ngwo, bụkwa ebe nwunye ya nọ na-azọ ndụ ya.
Ọzọ mere n'ụzọ Awhum-Okpatu n'ụbọchị Fraịde 18 Julaị 2025, otu nwaagbọghọ a kpọrọ nwada Onyeka na-aga Mortuary ibute ozu nne ya bụ Nnenna Onyeka maka olili ya.
Ngwa ngwa ọ fọrọ ntakịrị ka ọ gafee Ọkpatụ nwere rute n'ihu Awhum Monastery, ndị ntọrị wakporo ma tọrọ ya nakwa ọtụtụ ndị so ya a ga-ibute ozu nne ya.
Otu onye Ọkpatụ BBC gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ọ bụ n'ụtụtụ Fraịde ahụ ka o mere.
O kwukwara na ndị mmadụ gbara nnukwu ọsọ maka mgbọ egbe ndị ahụ na-akwa. Ka ọ dị ugbua, ahụbeghị nwata nwaanyị na ndị ọzọ ndị ntọrị ahụ buuru.
O kwuru na ndị uweojii bịara na Awhum na Ọkpatụ ma gbaa ndị obodo ajụjụ ọnụ.
Onye na-elekọta otu ụlọụka n'Umulumgbe anyị gbara ajụjụ ọnụ, kwuru na ndị ntọrị buuru otu nwoke na-akwọ ụgbọala Lexus Jiip na mmadụ abụọ ndị ọzọ o bu n'ụgbọala ya n'izu ụka abụọ gara aga.
"Ọ bụ Wenezde izu ụka gara aga ka m nọ n'ime ụlọ m n'anụ ụda egbe. Anyị gbachara ọsọ ma bịa hụ ka ha ji egbe gbakasịa ụgbọala ahụ, hapụ ya n'okporoụzọ Umulumgbe"
O kwukwara na o nwere ndị gara Egede gbara ọsọ ndị ntọrị n'Umulumgbe mana ha gakwara Okpatụ ebe ndị omekome ahụ nọ tọọrọ ụfọdụ n'ime ha.
Nwoke ahụ kwuru na egwu jizi ndị Umulumgbe dị n'obodo gbara ha gburu gburu n'ihi na ha amaghị ma ndị ọrụ nchekwa echefuru ha echefu.
Lee ebe ndị ntọrị na-akpa ike ọjọọ n'okpuru ọchịchị Udi, Enugwu Steeti
Ka ọ dị ugbua, ụzọ sitere Eke gawa Affa-Egede-Akpakwume na Nze bụzi aga-aga n'ihi na ọ bụ kwa izu ụka ka ndị ntọrị a na-enyo enyo na ha bụ ndị na-achi ehi na-atọrọ ndị njem ma baa ime ọhịa.
E kwuru na ha na-anara ha nde kwuru nde naịra tupu ha atohapụ ha.
Ọzọ, ọtụtụ kwuru na ọ dịzi ka ndị na-eme ajọ ihe ahụ n'Eke-Affa-Egede nọ n'otu ma jiri ya mere aka ọrụ.
Ugbua, ọtụtụ mmadụ anaghịzi esi Eke aga Affa maọbụ Egede maka egwu ndị ntọ.
Cheta na ọ bụ n'otu ụzọ a ka ndị ntọrị nọrọ gbagbuo nwata akwụkwọ St. Pauls sekọndịrị skuul Eke, dika o siri n'Eke na-ala ụlọ ha n'Egede nke BBC Igbo wepụtara ya bụ akụkọ n'afọ 2023.
*N'aka nke ọzọ, isi okporoụzọ awara awa ohụrụ si 9th Mile gawa Ebe- Egede nakwa Ọkpatụ bụkwa ọnọdụ ndị tọrị.
*Nke dịkwa njọ ka ibe ya bụ ụzọ awara awa Ochie si 9th Mile gawa Abor-Awhum-Okpatu na Umulumgbe, ụzọ ahụ bụ kwa ụbọchị abụọ anụ ọzọ.
*Nke mechiziri akwụkwọ bụ ụzọ ọhụrụ si Udi-Nvene-Ishi Ozall pụta Four-Corner.
N'agbanyeghị na ndị ọrụ agha nọ n'Ishi Ozall ebe ndị uweojii nọ na Nvene, ndị ntọrị ahụ n'eburu ụgbọala ndị njem baa ime ọhịa, ha agbagbukwaala ọtụtụ mmadụ n'ụzọ ahụ. Ka ọ dị ugbua, egwu ekweghịzị ndị njem si Legọs, Awka na Onịsha isi Four Corner were bata isi obodo Enugwu Steeti
Ihe ndị uweojii kwuru
Ka ọ dị ugbua, ụlọmgbasa ozi BBC ezigarala gọọmentị Enugwu steeti ozi nakwa ndị uweojii iji chọpụta ihe ha na-eme banyere mkpamkpa a, mana anyi enwetabeghị nzaghachi ha.