You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kọmitii Ụlọomeiwu Naịjirịa akwadola ka e kepụtakwuo otu steeti na mpaghara South-East
Otu kọmitii na-ahụ maka mmegharị iwu n'Ụlọomeiwu Sịnetị nakwa n'Ụlọomeiwu Nnọchiteanya Naịjirịa akwadola ka e kepụtakwuo otu steeti na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Nke a bụ iji zute oku mpaghara ahụ na-akpọ kemgbe ka e nyekwuo ha otu steeti, n'ihi ihe ha hụtara dịka mmegbu na mkpagbu.
Otu kọmitii ahụ nwere mkpebi a n'ọgbakọ abalị abụọ ha haziri na Legọs steeti n'ụbọchị 24 nakwa 25 nke ọnwa Ọktoba, 2025.
Ndị nọ n'isi kọmitii ahụ bụ Barau Jibrin, bụ Osote Onyeisi Ụlọomeiwu Sịnetị, nakwa Osote Onyeisi Ụlọomeiwu Nnọchiteanya bụ Benjamin Kalu.
Ndị kọmitii ahụ jiri ogologo oge kpaa maka ikewapụta steeti ọhụrụ na mpaghara South- East, dịka Kalu kwuru na nkwado ha nyere maka nke a bụ nke dabeere n'ime ihe n'ụzọ nhatanha, nkwụwaakaọtọ na ime ihe ziri ezi.
Ọ bụrụ ma e tinye mkpebi a n'ọrụ, ọ ga-ebuli ọnụọgụ steeti ndị e nwere na mpaghara South-East ka ọ bụrụzie isii.
Nnyocha iwu Naịjirịa afọ 1999: Mkpebi ndị ala Igbo maka steeti ọhụrụ, ndị uweojii nke steeti
E bidola ọgbọka nnyocha iwu Naịjirịa nke afọ 1999 bụ nke ụlọ omeiwu tinyere maka ndị bi n'Abịa nakwa Imo steeti.
Ọgbakọ ahụ tinyere anya na ngalaba iwu Naịjirịa dị iche iche nke metụtara akụnụba, nchekwa, na ihe ndị ọzọ dị iche iche.
Ọtụtụ ndị ndu na ndị ọchịchị n'Abia steeti nakwa Imo steeti bịara tinye ọnụ ha n'okwu gbasara ngalaba iwu Naịjirịa nke ha chọrọ ka a gbanwee.
Lee ebum n'obi Benjamin Kalu
Osote Onyeisi ụlọ omeiwu nta nke Naịjirịa bụ Benjamin Kalu bụ onyeisi oche ọgbakọ nnyocha na mgbanwe iwu nke Naịjirịa.
Ọ bụ site na nnyocha dị etu ahụ ka e si ahazi ngalaba iwu dị iche iche ma mee ka ọ dị etu ụmụafọ Naịjirịa si chọọ ya.
Ọ sị na ọgbakọ nnyocha ka e ji anụ okwu ụmụafọ Imo na Abịa steeti banyere Iwu Naịjirịa ahụ ga-etinye anya na ngalaba iwu iri asatọ na asaa (87) nke metụtara nchekwa, ndi uweojii steeti na ndi ụlọikpe ị nọrọ onwe ha nakwa ihe ndị ọzọ.
Ihe Gọvanọ Imo na nke Abịa Steeti kwuru
Gọvanọ Abịa steeti bụ Alex Otti nke Osote ya bu Ikechukwu Emetu nọchitere anya ya n'ọgbakọ ahụ kwuru na "ịkepụta ndị uweojii nke steeti dị oke mkpa ugbua maka ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa".
Gọvanọ Otti kpọrọ oku ka e nye ụmụnwaanyị ohere n'ọchịchị nakwa ị kwado ngalaba agụmaakwụkwọ na ihe ndị ọzọ.
N'aka nke ọzọ, Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma kwuru na ya akwadoghị iwepụ iwu Naịjirịa nke 1999 niile mana o kwuru na a ga-akpa ya aka ma hazie ya".
Uzodimma nwere nchekwube na ọgbakọ nnyocha iwu Naịjirịa nke a na-eme ga-amịta mkpụrụ ọma site n'ikewapụta steeti ọhụrụ n'ala Igbo nke isi steeti ya nwereike ịdị n'Orlu, Aba, Nsụka maọbụ ebe ọbụla.
Ọ kpọrọ oku ka e kewapụta steeti ohụrụ abụọ tinye na mpaghara Ndịda Ọwụwa Anyanwụ (Sauth East) Naịjirịa ma rịọ Osote Onyeisi ụlọ omeiwu nta ka ọ nyereaka mee ka nke a mịta ezi mkpụrụ.
Uzodimma kpọrọ oku ka e mee ka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa bụrụ nke a ga-eke ọchịchị ya na mpaghara Naịjirịa isii ma mee ka ndị a chịchaa ibe ha achịa.
Ọ kwadokwara ka a hazie ụlọọrụ ndi uweojii ma mee ka mpaghara dị iche iche nwee ndị uweojii nke ha.
Ihe otu ndị NLC, TUC, na NUT kwuru
Uche Chigemezu nochitere anya otu jikọrọ ndị ọrụ bụ Nigeria Labour Congress kpọkwara oku maka ọnọdụ ndị ọrụ na Naịjirịa.
Chigemezu katọrọ na steeti dị iche iche anaghị akwụ ụgwọọnwa opekatampe.
Onye ọzọ kwuru okwu banyere ndị ahịa na ndị ọrụ ndị ọzọ bụ Trade Union Congress (TUC) bụ Ibe Great kwuru na ọ dị mkpa na atụmatụ niile a ga-ewepụta ga-adịrị ndị ọrụ mma.
Kizito Agwu Kalu nochitere anya ndị Nigeria Union of Teachers (NUT) sị na ọ dị mkpa ka a napụ gọọmenti opekatampe ikike ị na-akwado agụmaakwụkwọ nke praịmarị.
Nnukwu ihe pụtara n'ọgbakọ ahụ
N'ihe ndị ahụ niile mere, Sinetọ na-anọchite anya Imo west bụ Osita Izunaso wepụtara usoro iwu abụọ ọhụrụ.
Iwu nke mbụ bụ iwu chọrọ ka e kewapụta steeti abụọ gbakwụnye ya na 'Southeast'.
Iwu ọzọ bụ nke na-ekwu ka ọchịchị Onyeisiala Naịjirịa bụrụ ndị chịchaa ndị ọzọ achịa n'etiti mpaghara Naịjirịa isii.