Ịgbapụ ọsọ ndụ na Gaza: “Anyị amaghị ebe anyị na-agbaga agbaga”

    • Onye dere ya, Ethar Shalaby
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Arabic

Haneen, nwunye Awn Abu Sharar, dị ime ọmụmụ. Sharar, onye bụkwa ọkaiwu, gwara BBC n'ekwentị na ha na-ele anya na ọ ga-amụ nwa n'ime ụbọchị ise. "Ana m achọ ụlọọgwụ ebe ọ ga-anọ mụọ nwa ya n'udo," ka o kwuru.

N'abalị ụbọchị Tọzde ka di na nwunye a nụrụ ozi ịdọ aka na ntị nke mba Israel zipụrụ iji dọọ ndị niile bi na mpaghara Ugwu nke Gaza ka ha si ebe ahụ pụọ. Ha achọbughị ịhapụ ụlọ ha, mana ndị ezinụlọ ha manyere ha ka ha gbaa ọsọ ndụ. Ha sonyeere ọtụtụ igwe mmadụ bụ ndị si na mpaghara ahụ na-agba ọsọ ndụ; ụfọdụ ji ụgbọala, nnukwu ụgbọala 'truck' maọbụ ụkwụ.

O were ha ihe dịka otu awa iji kwakọọ obere ngwongwo ihe e ji amụ nwa. "Anyị hapụrụ ụlọ anyị ngwangwa mana anyị amaghị ebe anyị na-agbaga, onweghị ihe ọbụla anyị haziri ahazi. Onweghị ebe nwere ezi nchekwa," ka o ji olu akwa kwuo.

Ugbua, ha nọzi n'obodo Rafah dị na mpaghara Ndịda ebe ha na otu ezinụlọ bi. Ezinụlọ a nwekwara ọtụtụ ndị si Palestine gbaa ọsọ ndụ bikwa ebe ahụ. Ha họọrọ ịnọ na Rafah n'ihi na a gwara ha na e nwere ezi ụlọọgwụ ebe ahụ maka ndị dị ime.

Mpaghara Gaza ebe Israel dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha si na ya pụọ so n'ebe ọtụtụ ọnụọgụgụ mmadụ kacha biri na Gaza Strip. O ruru ihe dịka otu ụzọ n'ime ụzọ atọ nke mpaghara Gaza niile. Ọ dịkwa nso n'ebe e nwere otu isi mmiri a na-akpọ 'Wadi Gaza'.

Nke a na-abịa dịka ihe karịrị mmadụ 1,400 ndị Israel lara mmụọ na mwakpo nke ndị otu Hamas wakporo mba ahụ.

Ọtụtụ ndị mmadụ gbapụrụ na mpaghara Ugwu Gaza gbaga mpaghara ndịda na-adabere na ndị enyi ha, ndị ikwu na ibe, nakwa ndị ha amaghị iji nweta ebe ha ga na-arahụ.

Woroud al-Dahdouh, nwata akwụkwọ nwaanyị dị afọ 24, na ndị ezinụlọ ya asaa hapụrụ Gaza gbaga n'obodo Deir al-Balah na mpaghara Ndịda. Ugbua ha bi n'ụlọ ebe mmadụ 20 ndị ọzọ bikwa. "Onweghị ma otu oche nwere efe ebe ndị mmadụ ga-anọ," ka o kwuru.

Woroud kọrọ etu ya si na-ebe akwa dịka ha na-eme njem ahụ, na-achọpụtaghị etu kpachikpachi ụzọ si dịrị. "Enweghị m ike ịkọwa etu ọ dị m n'obi dịka m na-ahapụ ụlọ m," ka o kwuru.

Ha hapụrụ ụlọ ha ngwangwa nke na onweghị onye nwere ohere iwere ihe ọbụla, naanị 'passport' na otu ihe ncheta ozọ. "E weere m otu foto nke ezinụlọ anyị niile nọ na ya bụ nke kowere n'ime ụlọ m," ka o kwuru dịka anyammiri juru ya anya.

"Gịnị ka m ga-ekwukwanụ? Enyere anyị iwu ka anyị pụọ, onweghị ihe ọzọ anyị nwereike ime," nne Woroud bụ Nagah kwuru. "Anyị amaghị ndị bụ ihe a anyị na ha bi, mana Chukwu gọzie ha maka ịnabata anyị n'ụlọ ha."

N'ụtụtụ ụbọchị ahụ, otu Hamas gwara ndị mmadụ ka ha jụ ịgbapụ na mpaghara Ugwu Gaza, nke mere ụfọdụ ji nọgide ebe ahụ. Maysoon al-Batsh, otu onye bi na Gaza kwuru na ya kpebiri ịnọgịde, n'agbanyeghị na ndị agbatobi ya agbachaala ọsọ.

"Onweghị ebe anyị ga-agbaga ka anyị nwee nchekwa. Enweghị ebe nchekwa dị. Ebe a bụ ala anyị. Anyị agaghị ahapụ ala anyị. Anyị ga-anwụ n'ime ụlọ anyị," ka o kwuru.

Youssef Haddad, onye gbagara n'obodo Khan Younis na mpaghara Ndịda, ya na nne na nna ya merela okenye na ụmụnne ya atọ, gwara anyị na ha so na ndị nwere isi ọma dịka ha nwere ndị ezi enyi ha nwereike ibi n'ụlọ ha.

"Mana anyị hụrụ narị kwuru narị ndị mmadụ juru n'okporoụzọ na-enweghị ebe ọbụla ha ga-agbaga."

O kwuru na naanị ihe ha wetara bụ 'charger' ekwentị ha nakwa ụfọdụ akwa a na-eyi n'ime.

Otu 'United Nations' ekwubuola na inye ihe karịrị mmadụ otu nde iwu ka ha gbapụ n'ime obere oge ga-eweta nnukwu nhịahụ nye ndị nkịtị, ma bụrụkwa ihe na-agaghị ekwe omume.

E nwere naanị otu okporoụzọ si mpaghara ugwu gawa ndịda. Mmanụ ụgbọala agbadaala nke ukwu. Mmiri ọṅụṅụ na-agbadakwa n'ike, ọtụtụ ebe jupụtara n'ụlọ dara ada. Otu UN kwuru na ụlọ niile ha nwere ebe ndị mmadụ nwereike ịga nweta nchekwa, tinyere ụlọakwụkwọ, ejula ọnụ.

Otu ahụike mbaụwa katọkwara iwu ahụ mba Israel nyere. "Enwere ndị na-arịa ọrịa siri ike, ndị merụrụ ahụ nke pụtara na naanị etu e nwereike iji debe ha ndụ bụ site n'idebe ha n'igwe enyemaka ndụ (life support), Tarik Jasarevic bụ ọnụ na-ekwuru WHO kwuru. "Nke a pụtara na ịkpọpụ ndị dị otu a bụ ịma ha ikpe ọnwụ. Ịgwa ndị ọrụ ahụike ka ha mee nke a bụ ihe dị nnukwu njọ."

Ọtụtụ ndị Palestine na-adọlị ịchọta ihe ga-eji mee njem a, tinyere ihe ruru mmadụ 500 bụ ndị gbara ọsọ ndụ na naanị ụlọụka Katọlik dị na Gaza. Ụkọchukwu Gabriel Romanelli, bụ onye na-arụ ọrụ n'ụlọụka ahụ gwara BBC na ịhaziri ndị a ụgbọala ha ga-eji mee njem adịghị ofere.

"Anyị nwere narị kwuru narị ndị gbatara ọsọ ndụ n'ụlọụka a, tinyere ụmụaka na ndị okenye, nakwa ndị ọrụsị na ndị ọrịa," ka ọ kọwara. "Kedu etu anyị ga-esi kpọpụ ha? Ọzọkwa, gịnị ka anyị ga-eme ma anyị garuo ebe ahụ?"

Odeakwụkwọ nke mba Amerịka bụ Anthony Blinken ekwuola na ya gwara mba Israel ka ha kpachapụ anya nke ọma iji gbochie ọnwụ ndị nkịtị, dịka o kwuru na ya ma na ọtụtụ ezinụlọ na Gaza na-ata ahụhụ ugbua maka ihe ọbụghị ha kpatara ya.

O kwuru na mba Amerịka na Israel na-enwe mkparịtaụka, ha na otu ndị ọzọ a ma ama, iji kewapụta ebe a ga-enye ndị mmadụ nchekwa na Gaza, mana ihe niile gbasara atụmatụ a ga-apụtacha ihe n'ụbọchị olemole na-abịanụ.

Onye ọzọ nyekwara aka n'ide akụkọ a bụ Ricardo Senra (BBC News Brasil)