Ụzọ ndị ọzọ i nwereike iji gosi obi ụtọ gị ịhụnanya taa bụ Valentine

Ụbọchị Valentịne bụ ụbọchị pụrụ iche ndị mmadụ ji egosi ndị ha hụrụ n'anya ịhụnanya pụrụ iche.

Mana 'Valentine's Day' nke afọ a dabanyere n'oge Naịjirịa na-akwado ntuliaka pụrụ iche, nakwa oge e nwere ụkọ ego na ụkọ mmanụ ụgbọala.

Nke a emeela ka ngosipụta ịhụnanya n'etiti enyi na enyi hịara ụfọdụ ahụ dịka ha na-eche ihe ha ga-enye ndị ha hụrụ n'anya ka obi tọkarịa ha ụtọ n'oge a.

Ọ bụrụ na i so na ndị a, obi gi dajụọ, lee ndụmọdụ ihe ụfọdụ i nwereike iji gosi obi ụtọ taa bụ Valentine:

Nye ya 'cash'

Ọtụtụ mmadụ nwere ego n'ụlọakụ na Naịjirịa mana iwepụta ya dịka ịnata enwe iko i ji kunye ya mmiri.

Nke a bụ maka ego naịra ọhụrụ nke ụlọakụ etiti wepụtara dịka ha kwuru na a ga-akwụsị iri naịra ochie.

Mana ya bụ ego naịra ọhụrụ kọrọ ụkọ nke ukwuu; ndị mmadụ na-akwụ n'ogologo ahịrị ọtụtụ awa n'ụlọakụ iji nweta ya bụ ego.

Ọtụtụ igwe ATM enweghị ego n'ime ha. Ndị nkịtị na-eji Igwe POS enye ndị mmadụ ego, na-ana oke ọnụ iji nye ya bụ ego ọhụrụ.

Nke a pụtara na onye ọbụla nyere enyi ya nwoke maọbụ enyi ya nwaanyị otu ngwungwu ego naịra ọhụrụ taa, egosila ya ịhụnanya kacha ịhụnanya.

Gbajuoro ya 'petrol' n'ụgbọala ya

N'ọtụtụ obodo mepere emepe na Naịjirịa ugbua, ịgbata mmanụ ụgbọala dịzi ka ịga gụta ọkụ na be ndị mmụọ.

N'ụlọahịa mmanụ ụgbọala ebe a na-ere ọnụ ala, ahịrị na-eto ogologo gafee ọtụtụ kilomita, n'ebe enweghị ogologo ahịrị, a na-ere ya oke ọnụ.

Na steeti ise dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, ọnụahịa mmanụ ụgbọala bụ N350 ruo 450 maka otu lita, mana ndị na-ere n'okporoụzọ na-ere bido 650 ruo 1000 naịra maka otu lita.

Ndị na-ere ọnụ ala na-ere bido na N185 ruo N197, mana ahịrị na-adị nnukwu.

Ya mere ọ bụrụ na ị chọrọ igosi mmadụ na ị hụrụ ya n'anya taa, biko nye ya otu galọn 'petrol'

Bunye ya ihe oriri

I nwereike ị zụtara obi ụtọ gị otu akpa osikapa maọbụ ibunye ya ji iri maọbụ ise, onyinye a ga-aka metụ ya n'obi karịa ọbante na 'singlet'.

Ọnụahịa otu ji gbara agba ugbua karịrị puku naịra abụọ ugbua, ebe ọnụahịa akpa osikapa a kọpụtara na Naịjirịa ruru N35,000.

Ngwa tuleenụ ya, onye ji ihe ndị a nye gị onyinye ịhụnanya n'ụbọchị 'Valentine', kedụ ịhụnanya karịrị ya?

Pụta tụọ vootu n'ụbọchị ntuliaka

Ọ fọla naanị ụbọchị iri na otu tupu ụbọchị ntuliaka maka onye ga-anọchi Muhammadu Buhari dịka Onyeisiala Naịjirịa.

Ọ bụrụgodi na ị chọbughị ịtụ vootu n'afọ a, were ya dịka onyinye ị ga-enye ndị ị hụrụ n'anya, ya bụ ịpụta bịa tụnyere onye ọbụla i che ga-eme ka Naịjirịa gaa n'ihu vootu