Ihe ndị ahịa na ndị ọrụ njem na-ekwu maka ọnụ ego mmanụ ụgbọala ebuliri

Aha onyonyo, Fuel Pump Price: Ihe ndị ahịa na ndị ọrụ njem na-ekwu maka ọnụ ego mmanụ ụgbọala ebuliri

 Ego mmanụ ụgbọala agbagola n’akụkụ Naịjrịa dị ịche ịche. Na mbụ mmanụ ụgbọala na-adabụ N165 otu litre mana ugbua mmanụ ụgbọala na-ada ọnụ ịche ịche site na mpaghara gaa mpaghara ọzọ.

BBC Igbo gagharịrị n’akụkụ Ọwụwa Anywanụ Naịjirịa dị ịcheịche ị ga nyopụta etu ihe gọọmentị mere si emetụta ndị mmadụ.

Pump Mmanụ ụgbọala

Ebe foto si, Getty Images

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Otu nwaanyị onye ahịa n’Anambra kwuru na ya bụ ihe na-emetụta ya na ezinaụlọ ya n’ụzọ ọjọọ.

Ọ kọwara na ya bụ mbuli ego emeela ọnụ ego ime njem, ego ịzụ ihe ahịa nakwa ihe ndị ọzọ etinyekwazịe ego.

Otu onye na-anya ụgbọala ‘keke’ kọwara na mkpebị a gọọmentị mere n’elu ọnụ ego mmanụ ụgbọala ji hanwa bụ ndị njem n’aka n’ụzọ ọjọọ.

O kwuru na ugbua ndị mmadụ anaghịzị apụta ka si emebụ n’ihi ọnụ ego ihe mmanụ ụgbọala na-adazị.

Ọnụ ego mmanụ ụgbọala

Agbanyeghị na ụlọọrụ na-ahụ maka mmanụ ụgbọala na Naịjirịa bụ Nigerian National Petroleum Company, NNPC kwuru na ha enyeghị iwu ka ebulie ọnụ ego mmanụ ụgbọala na Naịjịrịa ndị na-ere na ndị na-ebugharị ya bụ ahịa mmanụ kwusiriike na ndị isi ha na ndị na-ahụ maka ahịa mmanụ nyere ha iwu ka ha bulie mmanụ si N165 gaa N175/N179 bụ ọnụ ego otu litre.

Ọnụ ego mmanụ ụgbọala

Ndị na-ere ahịa ekwuola na ọnụ ego mmanụ ụgbọala na-adị eche site n’ebe gaa n’ebe nke so emetụta ahịa ha n’ezigbo ụzọ ọjọọ.

Kirie ihe onyonyo a ka ịnụrụ ihe ndị a kwuru n'uju.