"A na m erebu 'alumi' tupu m banye na Nollywood" - Fred Ebere (10 Kobo)
Leee tụ onyena-eme ihe ejije ama ama eji 10Kobo mara ezigbo aha ya bụ Fred Ebere si bụrụ onye ama ama na-eme ihe ejije.
Ebere kọwara etu o si bido ihe ejije dịka John Okafor nyere ya ohere ka o gosi akaraka ya n'ime ihe ejije.

Ebere kọwara na ọ bụ site n'ịde ihe a na-ekwu n'ejije ka o ji bido ma mechaa soro ndị na-eme ihe ejije.
O kwuru na aha eji mara ya bụ 10kobo bụ ihe ejije ọ mere ebe ọ zara aha ahụ.
Ebere kwuru na gọọmentị anaghị akwado Nollywood etu ha kwesịrị ma nye ndị mmadụ ndụmọdụ ka ha saa anya na mmiri oge ha ga-atụnye vootu oge ntuliaka.
Lee mkparịtaụka ya na BBC nwere n'uju ya.






